ASC Ekwela Ndị Anambra Nkwà Ezi Nchekwa Maka Nzukọ Ọnwa Ọgọstụ

Aug 8, 2019 - 18:37
Jan 21, 2021 - 18:38
 0
ASC Ekwela Ndị Anambra Nkwà Ezi Nchekwa Maka Nzukọ Ọnwa Ọgọstụ

By Izunna Okafor

Òtu ahụ jikọtara ndị ọrụ nchekwa dị iche-iche na steeti Anambra, bụ nke a maara dịka 'Anambra State Security Council' adụọla ụmụafọ steeti ahụ ka ha ghara ịtụ egwù n'ịbata ụlọ maka nzukọ ọnwa Ọgọstụ ahọ a, n'ihi na egwu ọbụla adịghị.

Ndị otu a nyere ndụmọdụ a ka ha na aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ Willie Obianọ nwechara nzukọ n'ebe obibi ya dị n'Amawbịa, ma kwekwazie Ndị Anambra na a ga-aga n'ihu inwe ezigbo ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà na steeti ahụ dịka e si enwe oge niile.

N'okwu ya n'aha ndị òtù ahụ, onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị John Abang mere ka a mara na ha tụlèrè ọtụtụ ihe na nzukọ ahụ, ọ kachasị dịka o siri metụta ịhụ na e nwere ezi nchekwa n'ogologo oge nzukọ ọnwa Ọgọstụ a, bụ nke na-aga n'ihu n'ebe dị iche-iche ugbu a, ya na ezi ọnọdụ nchekwa ga-adị ọkpụtọrọkpụ ma e mechagodụ ya bụ ọgbakọ.

Ọ kọwara na ọ bụ eziokwu enweghị mgbagha na mpụ na arụrụala, ya na ohi na ntọrị mmadụ na-abawanyekarị ụba oge ọbụla a na-eme ya bụ nzukọ, n'ihi na ọtụtụ mmadụ na-abatakarị ụlọ; ma mekwazie ka a mara na ndị ọrụ nchekwa na steeti ahụ dị njikere imemila ibe dị otu ahụ na ibuso ha agha.

Otu ọ dị, maazị Abang gazịrị n'ihu dọọ ndị omekoome na ndị ekpèrìmà nọ na steeti ahụ aka na ntị ka ha kwakọrọ ngwongwo ha rie mbọmbọ ma ọ bụ sepù aka n'ime ihe dị otu ahụ n'ihi na onye ọbụla e jidere ga-eji anya ya wee hụ ntị ya n'ejighị ènyò.

Na ntụnye nke ya, onyeisi oche òtù ahụ jikọtara ndị eze ọdịnala na steeti Anambra, ma bụrụkwa eze ọdịnala Ọnịtsha, bụ Igwe Nnaemeka Achebe, onye rụtụrụ aka na nsogbu ndị Fụlani na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo steeti ahụ, gosìpụtàrà ezi ntụkwasịobi o nwere na ndị òtù ọrụ ahụ e guzobere nso-nso a na ya bụ steeti, bụ 'Anambra State Cattle Menace Committee' pụrụ ilebàrà ya bụ nsogbu anya nke ọma, ma wetakwa ya n'isi njedobe.

Igwe Achebe gazịrị n'iihu mere ka a mara na ndị eze ọdịnala steeti ahụ ga-aga n'ihu ịrụkọ ọrụ na ijikọ aka ọnụ, ha na ndị ọrụ nchekwa, iji hụ na e nwere udo na nchekwa dị ọkpụtọrọkpụ n'ime obodo niile dị na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.