Ashbishọọpụ Ibezim Echiela Ndị Ụkọchukwu Ọhụrụ, Gbapee Ụlọekpere Ọhụrụ

Nov 23, 2021 - 22:56
 0


Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ bụ nnọọ oge ọñụ na oge inye ike maka ije oziọma, dịka Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Awka, onye bụkwa Ashbishọọpụ nke mpaghara Niger, bụ Ashbishọọpụ Alexander Ibezim chiri mmadụ ise ụkọchukwu ọhụrụ ma chikwa mmadụ abụọ dikin, nyekwa ha ikike ije ozi dịka ndị nchụaja Chineke.

Mmemme ichi ụkọchukwu ahụ bụ nke e mere n'ofufe nro pụrụ iche weere ọnọdụ n'ụlọụka St. Faith dị n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke ndị ọrụ ụka na ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche sonyere na ya.

Ndị ụkọchukwu ahụ e chiri ọhụrụ gụnyere Emmanuel Nzeakor (sitere ụlọụka 'Church of Penticost, Ukpo'); Felix Etokwudo (sitere ụlọụka 'St. Paul’s Parish, Nimo'); Chinedu Okoroafor (sitere ụlọụka 'Saint Paul’s Church, Oboro-Umueze Ogwa'); Foresight Umeajiaku (sitere ụlọụka 'Immanuel Church, Ezinifite Aguata') na Samuel Iloka (sitere ụlọụka 'Saint Simon’s Church Parish Ezinifite'). Ndị nke ahụ e chiri diki gụnyèrè Obiorah Ibezim na Peter Nwachukwu.

N'okwuchukwu ya n'ofufenrò ahụ, Venerebụụl Nnamdi Emendu, onye okwuchukwu ya gbàdòdò ụkwụ n'isiokwu na-asị “Dị Uchu ịma ụzọ nke ìgwè atụrụ gị na iji lekọta ụmụ ha nke ọma” gwara ndị nchụaja ahụ e chiri ọhụrụ ka gbasie mbọ ike ịdị na-akụtara Chineke mkpụrụobi, ma marakwa Chineke ha na-efe nà ihe Ọ pụrụ ime.

Ọ katọrọ etu arụrụala dị icheiche sizịrị jupụta elu ụwa ugbua, katọọ ajọ ọnọdụ nchekwa, igbusi mmadụ, ịkpọ ọgwụike na ihe ọjọọ ndị ọzọ na-ebi ụwa na ụmụ mmadụ aka ọjọọ ugbua, ma kwuo na ọ bụ ịgbakụta okwu Chineke azụ kpàtàrà ihe ndị ahụ. Ọ gwakwazịrị ndị ụkọchukwu ahụ ka ha bụrụ ndị na-agwa ụwa eziokwu, ọkachasị dịka o siri metụta alaeze eligwe.

N'okwu ya oge ọ na-echi ndị ụkọchukwu ọhụrụ ahụ, Ashbishọọpụ Alexander Ibezim chètààrà ha na ọkpụkpọ oku Chineke kpọrọ ha bụ ka ha jeere Ya ozi ma rụọrọ ya ọrụ dịka ndị ọzụzụ atụrụ, ma gwa ha ka ha si n'ọnụ ha na n'omume ha zisàá oziọma Kraistị.

Ọ gwakwara ha ka ha were ịhụnanya wee jeere Chineke ozi, ma bụrụkwa ndị Chineke ga-agbara ama ezi ọrụ ha rụrụ dịka ndị ozi ya n'ụbọchị ngụkọ, maka na mmadụ ọbụla ga-azarịrị ajụjụ banyere etu o siri gaa ozi ya nakwa etu o siri chịkwaa ìgwè atụrụ Chineke hanyere n'aka ya.

Dịka ọ na-echetara ha ka ọrụ ha na ije ozi ha siri dị n'ụlọụka ha dị icheiche, Ashbishọọpụ Ibezim kpọkùkwazịrị ndị nchụaja ahụ ka ha kwalite mgbasa oziọma n'ụlọụka ha dị icheiche ma na-esonyesikwa ike n'ihe a na-eme na dayọsiisi ha na n'ụlọụka ha dị icheiche.

N'okwu ha n'aha ndị ọzọ, ụfọdụ n'ime ndị ahụ e chiri ụkọchukwu na dikin ọhụrụ, bụ Samuel Iloka na Ụkọchukwu Peter Nwachukwu kèlèrè Chineke maka mbulin'ọkwa ahụ, kelekwa Bishọọpụ Ibezim maka ịhụta ha dịka ndị tozùrù oke, ma rịọkwa amara, nchekwa na enyemaka Chineke, na nkwàdo na ekpere ụmụ mmadụ, iji nyere ha aka ịga ozi ha nke ọma n'ikwesi ntụkwasịobi, bụkwa nke o kwere nkwa na ha ga-eme. Ha kwèkwàrà nkwa iji ike ha niile na ikwesi ntụkwasịobi wee za ọkpụkpọòkù n'ogoogo ọhụrụ ahụ dịka o siri bụrụ ọchịchọobi Chineke.

Na ntụnye nke ya, Onye ndu òtù ụmụnwaanyị na ụmụagbọghọ na dayọsiisi ahụ nà ná mpaghara Niger, bụ Oriakụ Chioma Ibezim kpọkukwàra nwunye ndị ụkọchukwu na ndị dikin ahụ e chiri ahụ ka ha na-enye di ha nkwàdo zuru òkè iji rụọ ọrụ ha karịa ka a tụrụ anya.

Onye ahụ a họpụtara ọhụrụ dịka osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Onyeka Ibezim; onye ji ọkwa Chanselọ nke dayọsiisi ahụ, bụ O.J. Okeke (onye duru ndị ụkọchukwu ọhụrụ ahụ n'iyi ọrụ), tinyere ọtụtụ ndị ụka na ndị ọzọ ji ọkwa dị icheiche sonyèrè na mmemme ahụ.


N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibe ya, Ashbishọọpụ Ibezim nọrọ na nsonso a wee gbapee ogige ụlọekpere ọhụrụ n'ụlọakwụkwọ 'Girls Secondary School, Awka', bụ nke a kpọrọ 'Chapel of Light' (nke pụtara 'Ụlọekpere Ìhè).

Oge ọ na-agbape ya bụ ogige, Ashbishọọpụ Ibezim kọwàrà ụlọekpere ahụ dịka ebe mmadụ ebe mgbaba, bụ ebe mmadụ ga na-aga ikpere ekpere, ọkachasị mgbe ọ nọ na mkpa na mgbe ọ na-arịọ Chineke otu ihe maọbụ nke ọzọ, maka na Chineke anaghị agbakụta ụmụ ya azụ.

Ya bụ mmemme ịgbape ogige ụlọekpere ahụ dọtàrà ọtụtụ ndị dị icheiche selitere isi na ngalaba mmụta, ngalaba ọrụ ụka, na ná ngalaba ndị ọzọ icheiche. 

Ashbishọọpụ Ibezim nọkwazịrị na mmemme ahụ wee nye otu nwata akwụkwọ na-agụ n'ụlọakwụkwọ ahụ, bụ obere nwaada Esther Ajaero ohere agụmakwụkwọ n'efu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484