Aston Villa e werela Arsenal chụọ aja n’aka ndị mmụọ

Aston Villa e werela Arsenal chụọ aja n’aka ndị mmụọ

Aston Villa riputala n’ebe ndatụ ha site na igba Arsenal otu goolu asataghị asata.

Trezeguet bụ onye otu Aston tiri Emiliano Martinez mmanwụ site n’inye goolu nyere otu egwuregwu bọolụ ya ọnọdụ weniri ndatu ha nke mbụ kamgbe ọnwa February.

Aston Villa agafeela Watford na-enweghị onye nchịkọta ugbua n’ogo ọnụọgụ goolu enyerela n’asọmpi Premier League.

Aston Villa na West Ham ga-akwata ya n’oge dị nso, ọ bụrụ na ha merie, ha ga-agbago n’ogo ọzọ n’ime asọmpi a.

Ebe Arsenal nwereike ị ka zọta ụkwụ ha, ma ha na Watford sọkọta mpi n’ogo ndatụ ụbọchị ụka na-abianu.