ATMA Achkọbarala Ndị Na-Akwọ Ụgbọala Ọgbakọ Nkuzi

Dec 12, 2019 - 02:22
Jan 24, 2021 - 03:36
 0
ATMA Achkọbarala Ndị Na-Akwọ Ụgbọala Ọgbakọ Nkuzi

Izunna Okafor, Awka

A kpọkuola ma dụọ ndị na-akwọ ụgbọala ka ha hie asaa n'anya, ọ kachasị n'oge mmemme ekeresimeesi a, iji belata ihe mberede, ọnwụ ike maọbụ ajọ ọdachi ndị ọzọ.

Nke a bụ isi sekpụ ntị n'ọgbakọ nkuzi a chịkọbààra ndị na-akwọ ụgbọala na steeti Anambra, site n'aka ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka ije awele n'okporo ụzọ, bụ ụlọ ọrụ a maara dịka 'Anambra Traffic Management Agency (ATMA).

Ya bụ ọgbakọ nkuzi bụ nke weere ọnọdụ n'Awka, bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị ọkwọ ụgbọala nakwà ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù n'ọchịchị steeti ahụ.

Ka ọ na-agwa ọha mmadụ bịara ọgbakọ nkuzi ahụ okwu na ya bụ mmemme, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ dụrụ ụlọ ọrụ dị iche iche na-ahụ maka ije awele na itinye amụma iwu n'ọrụ ka ha jikọọ aka ọnụ, ọ kachasị ugbua a na-abanye na mmemme ekeresimeesi kpọnkwem.

Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ Kọmishọna na-ahụ maka njem okporo ụzọ na steeti ahụ, bụ Dọkịta Christian Mmadụbuko kpọkùrù ma dọọ ndị ọkwọ ụgbọala aka na ntị ka ha zèere ịgba oke ọsọ, ịñụ mmanya na-aba n'anya, ya na itinye aka n'ihe ndị ọzọ dị iche iche na-ebute agbakata akwụsị, maọbụ ihe mberede okporo ụzọ.

O nyekwazịrị ndị ọrụ ije awele ka ha zèéré ihe ọbụla bụ ịna aka azụ maọbụ ịdaghachi azụ n'ọrụ ha, ya na ime ihe ndị ọzọ adabàghị adaba, dịka usoro amụma iwu na-achị ọrụ ha siri dị.

N'okwu nke ya, onyeisi ụlọ ọrụ ATMA, bụ Maazị Pat Obiefuna gbàra akaebe na ọ bụ ndị na-akwọ ụgbọala e ji ebu mmiri nakwa ndị ọkwọ ụgbọala ndị ọzọ kpàtàrà ọtụtụ ihe mberede okporo ụzọ were ọnọdụ nso-nso a n'ime steeti ahụ na

O mere ka a mara na ọtụtụ ndị ọkwọ ụgbọala anaghị erubere iwu na-achị okọpro ụzọ isi, ma ya fọdụzie irube isi nye ntuziaka ndị ọrụ na-ahụ maka ije awele n'okporo ụzọ.

Ọ dụzịrị ndị na-eme ihe dị otu ahụ ka ha sepụ aka na ya, ọbụnadị dịka o kwupụtara ezi njikere ụlọ ọrụ ya dị ijikọ aka ọnụ, ha na ụlọ ọrụ ndị ọzọ, iji weta ya bụ nsogbu n'isi njedobe ma kwàlitekwa njem siriri-werere na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.