Atọrọla Onye Ụkọchukwu Ọzọ na Nsukka

Nov 28, 2019 - 18:34
Jan 21, 2021 - 18:35
 0
Atọrọla Onye Ụkọchukwu Ọzọ na Nsukka

2019-11-28By Ibe Kelechukwu, Ibadan, Nigeria

Obodo dere jim jim ugbua n'ime obodo nsukka nke dị na Steeti Enugwu kamgbe ụbọchị Mọndee dịka otu onye ụkọchukwu ụka Katọlik, Malachy Asadu, bụ onye nke a chọrọ, o were bụrụ ndị ntọ akparala ya aka.

Asadu, Ụkọchukwu Ụka Katọlik na Dayọsisi Nsukka, bụ onye nke e kwuru na a tọrọ ya n'ụzọ sitere Imilike gawa Nsukka oge o si nzukọ Dayọsisi ahụ mere na Nnukwu Ụlọụka Theresa dị Nsọ, Nsukka were na-alọta.

Ndị Uweojii nke Steeti ahụ kwuru na ọ bụ ezie nke sitere n'ọnụ òkwú okwu ha, Ebere Amaraizu. O kwuru na ihe gbasara ntọ ahụ edochaghị ha anya ugbua mana ndị Uweojii, agbanyeghị nkea, amalitela ịsụ ọhịa n'ụzọ niile iji were jide ndị omekome ahụ ma gbapụtakwa onye ụkọchukwu ahụ.

Ntọrọ Ụkọchukwu Asadu ga-eweta ọnụ ọgụgụ ndị ụkọchukwu ụka Katọlik atọrọla na Enugwu n'ime ọnwa asatọ rue iteghete. Cheta na Ụkọchukwu Theophilus Ndulue ka a tọrọ na mkpụrụ ụbọchị iri na isii nke ọnwa Nọvemba ma bụrụ onye nke a hapụrụ ka ụbọchị atọ gasịrị oge a kwụrụ ndị tọrọ ya ọkpụrụkpụ ego amaghị.

Otu ụkọchukwu nke achọghị ka akpọọ aha ya, kwuru na ntọrọ ndị ụkọchukwu aghọọla ezigbo ọrụ ugbua nye ndị omekome ebe o nwebeghị otu onye n'ime ha ejidere ma taa ya ahụhụ kwesiri.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.