Be M Ka A Nọrọ Kpebie Ibido BBC Igbo — Ejiofor, Onyeisi Otu Sụwakwa Igbo

May 29, 2021 - 20:31
May 30, 2021 - 03:21
 0
Be M Ka A Nọrọ Kpebie Ibido BBC Igbo — Ejiofor, Onyeisi Otu Sụwakwa Igbo

Izunna Okafor dere edemede a


Ọkammụta PITA EJIOFOR bụ onye chọpụtara ma bụrụkwa onyeisi Otu Sụwakwa Igbo, bụ otu so n'ezi ihu na mbọ ahụ a na-agba ịkwalite asụsụ Igbo, ma n'ala Nigeria, ma n'ụwa gbaa gburugburu.

N'ajụjụọnụ a onye ntaakụkọ IGBO RADIO, bụ IZUNNA OKAFOR gbara ya na nsonso a, Ọkammụta Ejiofor kọwàpụtasịrị ụzọ dị iche iche Otu Sụwakwa Igbo sigoro gbaa mbọ maka ịkwàlite asụsụ Igbo, ma kọwakwa etu atụmatụ ibido mgbasaozi BBC Igbo siri wee malite n'okpuru mango dị na be ya.

Izunna Okafor: Gịnị bụ Otu Sụwakwa Igbo?

Pita Ejiofor: Otu Sụwakwa Igbo bụ otu na-agba mbọ maka ichekwaba na ịkwalite asụsụ Igbo, ma na-akpọkwa òkù k onye ọbụla bụ nwaafọ Igbo na-asụ asụsụ Igbo.

Izunna Okafor: Kedụ ụbọchị i hibere Otu Sụwakwa Igbo?


Pita Ejiofor: Ehibere m ya ka ọnwa Febụwarị dị n'abalị iri na anọ, n'ahọ 2006.

Izunna Okafor: Otu Sụwakwa Igbo a, ọ bụ sọ n'Anambra ka ọ dị, ka ọ dịkwa na steeti ndị ọzọ?

Pita Ejiofor: Ezigbo ajụjụ! Nke bụ eziokwu bụ na òtù a ị hụrụ kwèsìrì ịdị na steeti niile dị n'ala Nigeria, maka na o nweghị ebe ndị Igbo anọghị. Ị bịa n'akwụkwọ iwu anyị, onye Anambra, onye Abịa, onye Enugu, onye Imo, onye Ebonyi, na onye Delta binyèrè aka na ya. Ya bụ na steeti niile a nabàtàrà ya. Anyị mechaara kpọlite otu onye ka ọ bụrụ onye na-ahụ maka Otu Suwakwa Igbo n'America. Anyị nwèkwàrà onye na-ahụ maka ya na Lagos. Mana ọ kwa ị hụrụ ihe a a kpọrọ ego... A na-atụ anya ka ego na-abata, maka na ị ma na a kpọọ nzukọ, ndị mmadụ ga-añụnị mmanya maọbụkwanụ mmiri. Mana mgbe ego anaghị abatazị ka e siri tụọ anya, ihe wee bido ịdaghachi azụ n'ụfọdụ ebe; o wee dịzie ka ọ bụ sọ n'Anambra ka ọ dị maọbụ ka a na-anụ maka Otu Sụwakwa Igbo. Anyị nọ na steeti Igbo niile, kama na enweghị nkwàdo zuru òkè so ewèta ndọghachiazụ òtù a na steeti ụfọdụ

Izunna Okafor: Kedu ihe Otu Sụwakwa Igbo na-eme?  Kedụ ihe ndị ụnụ megoro, ndị ụnụ na-eme eme ugbua na ndị ụnụ na-ezùbe ime banyere ịkwàlite asụsụ Igbo?


Pita Ejiofor: Ihe Otu Sụwakwa Igbo megoro iji kwalite asụsụ Igbo bara ụba nke ukwuu, ma bụrụkwa agụtaọnụ.

Ị mààrà nà na a na-akụzi asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ taa bụ maka Otu Sụwakwa Igbo? Ọ bụ Otu Sụwakwa Igbo nyechara nkụzi n'ụlọ omeiwu steeti Anambra oge Anayọ Nnebe bụ Ọkaokwu ụlọ Omeiwu ahụ. Ha jụkwara anyị ọtụtụ ajụjụ banyere nkwàlite asụsụ Igbo na etu ha ga-esikwa wee nye aka. Ha wee sị anyị kedụ ihe a ga-eme, ka ha wee mee ya n'iwu. Ọkaokwu ahụ bụ Anayọ Nnebe wee sị anyị gaa dee ihe anyị chọrọ ka ha tie n'iwu bànyere ịkwàlite asụsụ Igbo. Anyị wee gaa, debe iwu a, dechasịa ya wee wegara ha. Mana ị ma na ọ bụghị i wère akwụkwọ ahụ gaa i kèbè ya onye ọbụla n'ótù n'ótù. N'ihi ya, onye m nyere ya bụ akwụkwọ bụ onyeisi òtù ọrụ na-ahụ maka mmụta n'ụlọ omeiwu ahụ oge ahụ, bụ onye a na-akpọ Ọnọrebụlụ Slyvester Okeke, onye Agụlụ, dị n'okpuru ọchịchị Anaọcha. Ọ ka nọ ndụ ugbua. O wee werezie ya gakwuru ndị òtù ya n'ụlọ omeiwu ahụ.

Ka nke ahụ gachara, ndị omeiwu ahụ mèzịrị nke ha ha jiri bụrụ ndị omeiwu, site n'ịkpa aka n'ihe ahụ anyị dere, mee ya ka ọ dị etu o siri kwesi, ha wee tie ya ka ọ bụrụ iwu. Ihe a na-eme n'ihe dịka ahọ 2010. Gọvanọ nọ n'ọkwa ọchịchị mgbe ahụ wee binye aka na ya. Ọ bụ ihe ndị ahụ anyị mere nà amụma iwu ahụ mèrè ya ka ọ bụrụ iwu na a ga na-akụzirịrị asụsụ Igbo na klaasị niile na steeti Anambra, malite na n'ụlọakwụkwọ praịma wee ruo na sekọndịrị.

Nke ahụ wee bụrụ ótù n'ime ihe Otu Sụwakwa Igbo mere. Mana ị ma na ọ nọ ọdụ ka ọ bụ ebe ahụ ka íké Otu Sụwakwa Igbo jedobere, maka na ị ma na anyị enweghịnị ike ịmanyezị ụlọakwụkwọ ka ha mebe ya emebe, n'ihi na anyị abụghị gọọmentị. Ọ bụzị gọọmentị na ngalaba ọrụ ya dị iche iche ka ọ dịzịịrị ịmanye ụlọakwụkwọ niile ka ha na-eme ya eme, site n'ịdị na-agagharị ma jirikwa usoro ntaramahụhụ dị iche iche kwesiri ekwesi wee hụ na ụlọakwụkwọ niile na-etinye ihe ndị a n'ọrụ.

Nke abụọ, Otu Sụwakwa Igbo gàrà n'ụlọakwụkwọ mahadum niile na ụlọakwụkwọ niile dị elu e nwere n'Anambra, wee nye nkụzi ma  gbasàá oziọma banyere nchekwa asụsụ Igbo. Anyị gbara mbọ hụ na mahadum ọbụla anyị ga-aga na ya, na onyeisi ha nabatàrà ka anyị bịa, ma nọrọkwa ya oge anyị na-enye nkụzi ahụ, ka ọ ga-abụ o nwee nke anyị kwuru adabàghị adabà, ka o kwuo uche ya banyere ya. 

Ha niile nyèchàrà anyị òhèrè ka anyị wee bịa nye nkụzi a na mahadum ha. Dịka anyị nyechara nkụzi, ha niile kwekọrịtàkwàrà na ọ bụ arụ na-achọ ime n'asụsụ Igbo. N'ihi ya ha niile kpebikwara na ha ga-etinye aka n'ịkwàlite na ịkụzi asụsụ Igbo na mahadum ha dị iche iche. Ndị enwebụghị ngalaba asụsụ Igbo tupu mgbe ahụ gùzòbèkwàzịrị ya, ebe ndị nke nwebụrụ ya enwe malitekwazịrị tinyebe uche nke ukwuu na ya, iji mee ya ka o guzosie ike.

Ka ọ dị taa, mahadum niile na ụlọakwụkwọ dị elu niile e nwere na steeti Anambra nwegbàdòrò ngalaba asụsụ Igbo na ihe ọmụmụ 'General Studies'. Ihe nke ahụ pụtara bụ na onye ọbụla nọ na mahadum ọbụla maọbụ ụlọakwụkwọ ọbụla dị elu n'Anambra ga-agụrịrị Igbo. Nke ahụ wee bụrụkwa ihe ọzọ Otu Sụwakwa Igbo mepụtara site n'oziọma ọ na-agbasa maka nkwàlite asụsụ Igbo.

O nweghị nne na nna taa n'Anambra anụbeghị nkụzi banyere ịkwalite asụsụ Igbo; ọ bụghị site n'ọnụ ndị Otu Sụwakwa Igbo, ọ bụrụ site n'ọnụ ndị Otu Sụwakwa Igbo kuziiri.

Ọzọkwa, anyị chọpụtara na ndị Igbo anaghị emepụtabụ ihe ejije n'asụsụ Igbo, nke mere na oge DSTV bidoro, na e bidoghị DSTV Igbo. Ihe e bidoro oge ahụ bụ DSTV Hausa na DTSV Yoruba; e tinyeghị nke Igbo. Anyị bụ ndị Otu Sụwakwa Igbo wee bido mebe asọmpi maka ndị ga-emepụta ejije n'asụsụ Igbo. Onye nyere anyị ego anyị jiri wee malite ya bụ asọmpi bụ Godwin Ezemo, onye Ụmụchu. Ọ kwàdòrò anyị ihe dịka ahọ atọ, a na-emepụta ya; gbàbá ndị mmadụ ume. Ị bịazie kịtaa n'ekwentị gị, ị pịa, ị hụ 'BBC Igbo Service', mana ị hụ na ọ gaghị...

Ị maara na ọ bụ na be mụ bụ Pita Ejiofor ka a nọrọ wee tụọ arò maka ibido BBC Igbo?

Ngwa ñàá ntị ka m kọọrọ gị ka o siri wee mee.

Ndị BBC bịara njem ngagharị na Nigeria, wee mechaa, otu onye wee gwa ha bịa hụ m. Ọ dị m ka ọ bụ onye a na-akpọ Dọkịta Nwaezeigwe kpọrọ m, wee sị m na ndị BBC ga-abịa ịhụ m. O wee tụọ m n'anya, maka na mụ na ndị BBC anaghị emekọbụ. Ka ha bịazịrị ụbọchị ahụ, m wee kpọọ ndị Otu Sụwakwa Igbo ibe m. Ọnụọgụgụ ndị òtù m bịara ụbọchị ahụ dị mmadụ iri, tinyere otu onye na-arụ n'ụlọ mgbasaozi 'Purity FM'. 

Ka ha bịaruru, otu onye BBC ahụ wee jụgide m ajụjụ ụbọchị ahụ, jụgide m ajụjụ, sị m Kedụ ihe ndị Igbo na-eme maka asụsụ ha, na ihe mere ndị Igbo ejighị kpọ asụsụ ha ihe? O wee jụba m na è nwèkwàrà mmadụ n'ala Igbo. Ọ bụkwa onyeọcha na-ajụ m ajụjụ a. Aha ya bụ Mike Callahan. Oge ọ jụchaara ajụjụ niile ọ jụrụ, a jụrụ m ya ma ọ jụchaala, ọ sị m É na ọ jụchaala. M wee sị ya ka m jụọnụ ya naanị otu ajụjụ, o wee sị ngwa mụ jụọ.

M wee jụọ ya sị, "Ị gwàrà m mgbe ị na-ajụ m ajụjụ na Nigeria nwere ọkpụrụkpụ asụsụ atọ, tínyéré bekee; i wee gụpụtasịa ha dịka Igbo, Hausa na Yoruba..."
Ọ sị m "É."
M wee jụọ ya ọzọ sị, "Ụnụ bidoro BBC Hausa n'ahọ 1957, wee na-akwadokwa ugbua ibido BBC Yoruba, nke na ụnụ ákàkwuola ụbọchị ụnụ ga-ebido ya kpọmkwem. Biko nna anyị, kedụ mgbe ụnụ ga-ebido BBC Igbo?"

Ihe a m na-agwa gị mèrè n'okpuru Mango dị na be m, n'Udoka Esteeti. Ihe m na-akpọzị Mango ahụ taa bụ BBC Mango. Edere m aha ndị nọgasị mgbe ihe a na-eme. M wee jụọ ya kedụ oge ha ga-ebido BBC Igbo.

Ị mà ihe ọ zara m?

Ọ sị na ọ makwanụ na m ga-ajụ ya ajụjụ ahụ. O wee nọrọ n'ihu anyị niile nọ ebe ahụ oge ahụ wee kwubie okwu, sị na maka ihe ajụjụ ahụ m jụrụ ya, na mmasị m banyere nke ahụ, na BBC ga-ebidokwuzị nke Igbo. Nwoke, ọọkwa, ị hụ ụdịrị añụrị anyị nwere ụbọchị ahụ èé... Ya bụ èé, obi jupụtara anyị niile n'ọñụ ụbọchị ahụ ngwangwa o kwuru nke ahụ. O wee bụrụ ebe ahụ ka a nọrọ wee kpebie ibido BBC Igbo.

Ihe mezịrịnụ bụ... maka na ị ma na ha akwadobụghị ibido nke Igbo, na ọ bụ naanị nke Yoruba ka ha na-akwado ibido oge ahụ; ha wee kpebizie ibidokwuzị nk Igbo n'ótù oge ahụ. Nke a mezịrị, tupu ha akwádochazie ya, o wèé rukwazie ihe karịrị otu ahọ. Ka ha kwàdóchazịrị ọnọdụ, ha wee bidokọzie ha abụọ ọnụ otu ụbọchị, ma BBC Igbo ma BBC Yoruba; etu ahụ ka ọ dịzị wee ruo taa. 

Ihe ọzọ mezịkwara bụ na ka e bidochara BBC Igbo ahụ, ebe isi ụlọọrụ ya dị bụ na Lagos. M wee sịkwa ha na BBC Hausa bụ na Kaduna ka isi ụlọọrụ ya dị; ebe BBC Yoruba bụ n'ala Yoruba bụ Lagos ka ọ dị. M wee rịọkwa ha doo ka a maranị ihe a ga-eme ka BBC Igbo nwekwanụ isi ụlọọrụ ya n'ala Igbo, maka na o nwere ihe dị iche na a nọ na Lagos na-agbasara anyị ozi na-asụsụ Igbo, na a nọ n'ala Igbo wee na-eme nke ahụ, ka ọ ga-abụ o nwee ihe e mebere, maọbụ ka ihe siri dị, ọ dịrị anyị mfe ide ya maọbụ imezigharị ya.

Ya bụ na, ị jụọ m ihe anyị mepụtagoro n'ịkwalite asụsụ Igbo, m ga-asịkwa na e kwube isi sekpụ ntị na ndị bidoro BBC Igbo, m ga-asịkwa na ọ bụkwa Otu Sụwakwa Igbo ooo. 

Ọzọ, ị bịazie na ngalaba ịgbasa oziọma maka asụsụ Igbo n'ụlọụka, aga m asị gị kpọọ Bishọọpụ ọbụla ọ sọkwara ya bụrụ na steeti Anambra, ị ga-ahụ na o nweghị dayọsiisi anyị bụ ndị Otu Sụwakwa Igbo ejebeghị nye nkụzi maka asụsụ Igbo na ya. Oge ahụ, dayọsiisi ọbụla anyị bịaruru na ya, ma Bishọọpụ ma ndịisi ụka niile na dayọsiisi ahụ ga-eso nọrọ ala na-anụrụ nkụzi anyị na-enye. Anyị mechaa nke ahụ, ha edee ihe ha ga-eme iji hụ na asụsụ igbo anwụghị, ọkachasị site n'ịkwalite na iji ya were edebe ụka n'ụlọụka ha dị iche iche na dayọsiisi ahụ. Oge ha dechasịrị ihe ndị ahụ, ọtụtụ n'ime ha malitere ozigbo mebe ya emebe. Nke ahụ wee nyekwa aka n'ụdị nke ya. Kama na ị ma na nke mmadụ jiri bụrụ mmadụ, e mèchààrà ọtụtụ bidokwa laghàchibe azụ n'imezupụta iha ahụ ha depụtara na ha ga na-eme. Mana a ka na-ejikwa asụsụ Igbo aka ụka n'ọtụtụ dayọsiisi na ụlọụka wee ruo taa. Nke ahụ sokwa n'ihe ọzọ anyị mepụtàgòrò.

Ya bụ na ihe anyị mègoro iji kwàlite asụsụ Igbo ehika. Ọ dị ọtụtụ, nke na agaghị m echetanwuzị maọbụ gụpụtanwuo ha niile n'ótù n'ótù.

Ị màkwà na 'NUC' (ya bụ 'National Universities Commission') nwèrè ihe ha depụtara na o nweghị ebe a na-akụzi Igbo na mahadum ọbụla dị na Nigeria. Ha dere ya ede, ma bipụta ya ebipụta, ebe ụwa niile ga-ahụ ya. Ọọkwanụ akwụkwọ ahụ ka m gụchaara o wee gbuo m mmụọ; m wee gbaba mbọ anyị na-agba maka Otu Sụwakwa Igbo nà ịkwàlite asụsụ Igbo. Ya bụ na ihe anyị megoro dị...

Ka m jụkwa gị, Ị màkwà na n'ihe dịka ahọ iri gara aga, na i nweghị ike ịzụta akwụkwọ Igbo n'ahịa, dịka n'ahịa Eke Awka. Oge onyeisiala Nigeria n'oge mbụ bụ Goodluck Jonathan bịara, mụ ka gọọmentị nyere ego sị m gaa ahịa ka m gaa zụta akwụkwọ a na-akpọ 'Omenụkọ', Pịta Nwana, onye Arọndịizuọgụ dere. Ha wee sị m gaa zụta ya ka e nye Goodluck Jonathan dịka onyinye. M wee bàá ahịa Awka wee chọba 'Omenụkọ'; chọba 'Omenụkọ'; chọgide 'Omenụkọ'. Ebe m gaara, ha asị m na a naghị erezị akwụkwọ Igbo n'ahịa Awka. M wee kwụgharịgide n'ahịa Eke Awka, èé...

Ọ bụ oge ike gwụzịrị mụ ka otu onye n'ime ndị ahụ na-ere akwụkwọ mechaara wee sị m bịagodi. O wee sị ma na o chètàrà aha akwụkwọ ahụ m na-ekwu, na ọ dị ka o nwèbụrụ ya. Ọ sị na o ruola ọtụtụ ahọ o gotere akwụkwọ ahụ ka o ree ya, mana akwụkwọ Igbo anaghị aga ahịa, nke na o jighị n'aka na o repụrụ ọbụladị otu mkpụrụ n'ime akwụkwọ ahụ, maka na o nweghị onye jụrụ ya 'Ị kpọbara akpọba ka ị nà-ere ere?' Ọ gwara m na o chetàghịzị na ọ ghafùzịrị akwụkwọ ahụ aghafù, ka ọ gbara ha ọkụ, ka ọ chịlara ha n'ụlọ be ya. 

Ihe a m na-agwa gị bụ ihe mere eme. Nwoke ahụ wee sị mụ bịaghàchi echi, ọ laruo be ya ụbọchị ahụ ka ọ chọọ ya. M kelee ya wee laba, o wee ruo echi ya, m gachigha ebe ahụ; o wee chịrị mkpụrụ akwụkwọ Omenụkọ atọ chịnye m, sị na ọ bụ naanị mkpụrụ ole ahụ ka ọ hụrụ, na ya amaghịzị ka ya na ndị ọzọ siri gaa. M wee kelee ya n'obi ụtọ, wee kwụọ ya ụgwọ, chịrị akwụkwọ wee laba. Ọñụ m na-enwe ụbọchị ahụ bụ 'Ka o nwedịrịrị nke m hụrụ ahụ zụta'. Gịnị ka m gaara akọ ma ọ bụrụ na ọ chọchaara o nweghị nke ọ hụrụ. Ihe nke a na-egosi bụ na a naghị erebụ akwụkwọ Igbo n'ahịa, maka na ị na-ere, mana o nweghị onye ị hụrụ na-egoro ya maọbụ na-agụ Igbo, ị mara na njọahịa ga-emechaa gị ihe.

Site n'ihe ndị a niile m kọọrọ gị, ị ga-ahụ na ihe ndị Otu Sụwakwa Igbo megoro n'ịkwàlite asụsụ Igbo ehika; ọ dị ọtụtụ. Anyị arahụbeghị ụra, maka na anyị ka mụ anya, na-agbasikwa mbọ ike, iji mee karịa ka anyị megoro.


Izunna Okafor: Ụnụ nwèkwàrà ngalaba ndị ntorobịa n'Otu Sụwakwa Igbo, bụ ndị so enyere òtù a aka n'ọrụ ha, nà ndị ụnụ na-atụ anya inyefè ọrụ a n'aka mgbe ụnụ enweghị ike imenwuzị?

Pita Ejiofor: Enyi m nwoke, ịgwa gị eziokwu, anyị enwebeghị ụdị ihe dị etu ahụ, mana anyị ga-achọ inwe ya. O nwere mgbe anyị chọbụrụ inwe ụdị ihe ahụ n'oge mbụ, ọ chọọ imebìrì anyị ihe, maka na ị ma na ndị ntorobịa nwere ka ha si eme. O nwere ike, dịka ihe gbasaara asụsụ Igbo a anyị na-ekwu okwu ya ugbua, o nwere ka ọ ga-esi dị, ndị ọ bụ ha na ha ekwetaghị n'ihe ha kwuru, iwe wee ha, ha nwèkwàrà ike imebi ihe, maka na oge ụfọdụ, ha na-eji aka ike na obi okorobịa eme ihe. Mgbe ụfọdụ, ịchịkọta ha maọbụ ijide ha na-esikwa ike. 

Iji maa atụ, o nwere oge ụfọdụ ndị ntorobịa bịara banyere anyị ọhụrụ n'òtù a, ahọ olenaole gara aga. Ọ bụghị Gọvanọ Willie Obianọ na-achị oge ahụ. Ka nke ahụ gachara, o wee nwee mmemme gọọmentị a na-eme oge ahụ n'ama egwuregwu 'Ekwueme Square' dị n'Awka. Otu onye n'ime ndị ntorobịa ahụ sonyere n'òtù anyị wee kpọọ m, sị na mụ màkwà na ihe niile a na-eme na mmemme ahụ bụ n'asụsụ bekee ka a na-ana eme ya. Ekwuekwu akààkà, amaghị m ebe ha siri nweta ụgbọala, wee bukọrọ onwe ha ozigbo, wee chọọ ka ha bànye n'ebe ahụ mee ngagharịiwe megide iji asụsụ bekee eme mmemme gọọmentị na mmemme ndị ọzọ dị añaa n'ala Igbo.

M wee jìbé ha, wee rịọba ha, wee sị ha ụmụaka m biko, na Otu Sụwakwa Igbo bụ òtù udo. Maka na na ọ bụrụ na a hapụrụ ha, ha nwere ike iji iwe ahụ wee bàá n'ebe ahụ, wee ghasasịa maọbụ mebisie ihe. Nke ahụ wee bụrụ otu ọmụmaatụ n'ihe ahụ m na-agwa gị banyere ndị ntorobịa na etu ha si eme ihe oge ụfọdụ.

Mana, ka o sila dị, anyị ga-achọrịrị etu anyị ga-esi wee webata ma hazie ngalaba ndị ntọrọbịa n'otu a, maka na ọ bụkwa ihe dị nnukwu mkpà. Ị makwa na ọdịda asụsụ Igbo bụkwa n'ebe ndị ntorobịa nọ ka ana-ahụtakarị ya oge ụfọdụ. Ya mere o jiri dị mkpa na anyị ga-ekewàpụta ngalaba maka ha, ka ha wee sorokwa n'ihe a na-eme, ma nyekwa aka na mgbasaozi nkwalite asụsụ Igbo. Daalụ maka ichetara m nke a ọzọ.


Izunna Okafor: N'ilekwàsà anya n'akụkọ a ị kọrọ ugbua, i chèrè na ọ ga aka mịta ezi mkpụrụ ma ọ bụrụ na e jiri aka ike na mmanye wee sòbé ihe gbasaara nkwalite asụsụ Igbo a?


Pita Ejiọfọr: Ịgwa gị eziokwu, emechaara m ihe ahụ m mere ụbọchị ahụ, ọ dị m ka ọ bụ na mụ emetachaghị ihe m mere. Emechaara m, ọ dị ka m ga-atakwa onwe m ụta ihe mere na mụ ahapụghị ndị ntorobịa ahụ ka ha mee ihe bụ uche ha ụbọchị ahụ, ka a mara na ọ bụ usoro ahụ ka gọọmentị na ndị Igbo ga-aka wee nụ ngwangwa. E mekwa ụdị ngagharịiwe dị etu ahụ n'ebe dị iche iche e ji asụsụ bekee were edebe ụka oge niile n'ala Igbo, ị ga-ahụ na ọ ga-aka mịtakwa ezi mkpụrụ n'egbughị oge.

Ihe ahụ chọkwàrà iyi nke mere n'Imo steeti otu oge, ebe ụmụokorobịa abụọ lụrụ ezigbo ọgụ, maka na nke ọzọ na-asụ bekee, nke ọzọ wee sị ya asụzịla ya, ya sụba asụsụ Igbo; ọgụ wee dàá. 

Ya bụ na ejichaghị m n'aka na ihe ahụ m mere ụbọchị ahụ dịcha mma, kama na ihe m jiri mee ya bụ na echere m na gọọmentị na onye ọbụla anabatala na ọ bụ asụsụ Igbo ka anyị ga na-asụzị; amaghị ma na ọ bụghịzị ihe anyị kwekọrịtara ka a na-emezị. Ọ bụrụ na mụ ma na bido kemgbe ahụ wee ruo taa, na a ka ga na-akọ ụmụ ihe a a na-akọ ugbua banyere ajọ ọnọdụ asụsụ Igbo, agaara m ahapụ ndị ntorobịa ahụ ka ha mee ihe bụ uche ha. Ọ bụrụ na gọọmentị ala Igbo ga-eji asụsụ Igbo wee kpọrọ ihe, ma...

Ị mààrà na n'ihe dịka ahọ olenaole gara aga, na e mere iwu na London sị na tupuu e wezie onye ọbụla n'ọrụ uweojii, na onye ahụ ga-amarịrị asụsụ bekee. Ha wee depụtazie asụsụ iri ndị ọzọ onye ahụ ga-amarịrị otu n'ime ha. O wee bụrụ na n'ime asụsụ iri ahụ, na asụsụ Yoruba dị na ya. 

N'eziokwu, enyimnwoke, ọnọdụ asụsụ Igbo taa na-echu m ụra dịka mmadụ, ma na-echukwazị anyị bụ ndị Otu Sụwakwa Igbo ụra, bụ nke mere anyị ji agbasi mbọ ike ịkwàlitè ya. Gọọmenti ala Igbo kwesiri iteta n'ụra, ma soro nye aka n'ụzọ pụrụ iche n'ichekwa asụsụ Igbo, maka na ọ bụkwanụ naanị nke anyị nwere ike imenwu dịka mmadụ nkịtị maọbụ dịka òtù ka anyị ga-eme; ọ bụ gọọmentị nwere ikike ime nke anyị agaghị emenwu. Mana dịka ha na-eme nke ahụ, ha kwesiri ibu ụzọ bido n'onwe ha wee mebe ihe kwesiri ka e mee na ihe ndị a na-atụ anya n'aka ha banyere ọnọdụ asụsụ Igbo taa, maka na a na-esi n'ụlọ dịrị mma wee pụba ama. Ndeewo.


Izunna Okafor: Ndeewo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484