Bishọọpụ Ezeọfọr Agbapeela Ogige Ụlọekpere A Rụrụ Ọhụrụ n'Ụmụchu

May 20, 2021 - 12:30
May 30, 2021 - 17:21
 0
Bishọọpụ Ezeọfọr Agbapeela Ogige Ụlọekpere A Rụrụ Ọhụrụ n'Ụmụchu

Izunna Okafor dere akụkọ a

Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Agụata, bụ Bishọọpụ Samuel Ezeofor emeela mmemme ịgbapegharị ótù ogige ụlọekpere a rụzigharịrị ọhụrụ na dayọsiisi ahụ.

Ya bụ ogige bụ nke a maara dịka 'Catechist Gabriel Ezekwo Memorial Chapel And Umuchu Unity Centre' ma bụrụkwa nke dị n'ụlọụka 'St. Thomas Anglican Church, Umuchu', n'okpuru ọchịchị ime obodo Agụata, nke steeti Anambra.

N'okwuchukwu ya n'ofufè nrò pụrụ iche e jiri malite mmemme ahụ, Bishọọpụ Ezeofor, ónyé nyere nkọwa banyere ògigè ahụ, chetaara ndị sonyere na mmemme ahụ mkpà ọ dị mmadụ ịmara Chineke na mmadụ iji ndụ ya na obi ya niile jeere Chineke ozi n'ụwa, ka aha ya wee bàá n'akwụkwọ nke ndụ, nke na  eluigwe na ụwa ga na-agbara ya akaebe maka ezi ndụ o biri, ọbụladị oge onye ahụ hapụrụ ụwa.

Dịka ọ na-eme ka a mara na ogige ahụ bụ nke a rụrụ n'aha onyenkụzi ụka/Katikiisti mbụ nọrọ n'ụlọụka ahụ, bụ Maazị Gabriel Ezekwo, iji kwanyere ya ùgwù ma mekwa ka aha ya dị ọkpụtọrọkpụ; Bishọọpụ Ezeọfọr kpọkukwàzịrị ọhaneze bịara mmemme ahụ ka ha makụọ Chineke ma jiri oge ndụ ha jeere ya ozi, iji wee nweta ezi ụgwọ ọrụ n'oge ikpeazụ.

Na mbụ n'okwu nke ya, onyeisioche na mmemme ahụ ma bụrụkwa Ọkaikpe ukwu steeti Anambra, bụ Ọkaikpe Peter Umeadị, kọwara mmemme ahụ dịka nke magburu onwe ya, kelee ndị dị iche iche tụnyere ụtụ n'otu ụzọ mzọbụ nke ọzọ iji mee ka ọmarịcha ọrụ ahụ pụta ihè, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị mmadụ ka ha mee ihe kwesiri nñomi ma dekwa aha ha n'akwụkwọ nke ebighịebi tupu ha alaa mmụọ.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, onye na-akwàdo ihe mmemme ahụ, bụ Maazị Samuel Ezekwo, onye bụkwa nwa Gabriel Ezekwo a rụrụ ogige ahụ n'aha ya, kọwàrà nna ya dịka onye biri ezi ndụ na onye nwere ọtụtụ ezi ihe nñomi na ihe nkụzi dị na ndụ ya, ọbụladị dịka o kwere nkwà ịgbasòsi nzọụkwụ ya ike.
 
A nọrọ na mmemme ahụ mekwa emume ibupùtà akwụkwọ ọhụrụ a kpọrọ "In His Days", bụ akwụkwọ Maazị Samuel Ezekwo na Ejiofor Umegbogu dere n'aha na maka ụbọchị ndụ Gabriel Ezekwo lagoro mmụọ, bụkwa ụzọ ọzọ ha siri wee chọọ ịkwanyere ya ugwu na ime ka aha ya dị ọkpụtọrọkpụ.

Mmemme ahụ dọtakwara ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù, sitere na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ na mpụga ya wee bịa, nke gụnyere Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi 'Enugu North', bụ Bishọọpụ Sosthenes Eze; Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na steeti Anambra, bụ Ọkammụta Kate Omenụgha; 'Most Reverend' Maxwell Anikwenwa nke ụka Angịlịkan, eze ọdịnala Ụmụchu, bụ Igwe Godson Ezechukwu, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484