Bishọọpụ Ikeakọr Atọọla Okwute Ntọala Ụlọ Ụka St. Philips n'Ebenatọr

Jan 15, 2020 - 20:52
Jan 24, 2021 - 02:51
 0
Bishọọpụ Ikeakọr Atọọla Okwute Ntọala Ụlọ Ụka St. Philips n'Ebenatọr

Izunna Okafor, Awka

Igbo sị na ọ na-abụ onye a gwàrà kwe, a hụ ọzọ, a gwakwa ya; mana onye a gwara agwa, ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ. Ka ọ dị taa, a kpọkuola ndị otu Christ ka ha na-agbasi mbọ ike ịkwàlite ọrụ Chineke nakwa mgbasa oziọma, n'ihi ọtụtụ úrù dị iche iche dị na nke ahụ.

Ọ bụ Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Amichi, bụ Rt. Rev. Ephraim Okechukwu Ikeakọ kpọrọ òkù a n'okwuchukwu ya na mmemme nakwà òfùfè nrò ịtọ okwute ntọala ụlọ ụka 'St. Philips Anglican Church Ebenatọr, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Nnewi South' nke steeti Anambra.

Bishọọpụ Ikeakọr, onye gbakwàsịrị ụkwụ n'akwụkwọ Ezra isi nke atọ, na akwụkwọ Matiu isi nke iri na anọ kọrọ akụkọ bànyère otu ụmụ Israel siri nwee mmasị na ọnụnụ ọkụ n'obi íwū ụlọ Chineke (karịa iwu ụlọ nke ha onwe ha) oge ha siri na ndọta n'agha bàta, bụ nke Nebuchadnezzar dọọrọ ha ihe karịrị ahọ iri asaa; ya na otu obere nwata nwaokorobịa sìrì wèpụta obere azụ na achịcha o nwèrè ka e wère kwàdó mgbasà oziọma Christ, site n'iji ya zụọ mmadụ karịrị puku ise nri, n'otu n'otu.

Ka ọ na-adụ ndị òtù Christ ka ha ñòmie nke ahụ, ọ kpọkùzịrị ndị mmadụ ka ha na-achọ ihu Chineke mgbe niile, ma wèrekwa akwụkwọ nsọ hiri isi ogologo ndụ ha niile, n'ihi na ọ bụ site n'ime ihe dị otu ahụ ka mmadụ pụrụ iji bàá alaeze Chineke.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu, ụkọchukwu na-elekọta ụlọ ụka 'St. Andrews Anglican Church, Ebenatọr' nakwa 'Ebenator Archdeaconry,' bụ Venerebụụl Godson Ugochukwu, ya na ògbò ya bụ Ụkọchukwu Paulinus Ndiukwu, kọwàra mgbasa oziọma dịka ọrụ dịịrị onye ọbụla, ma dụkwazie onye ọbụla bụ onye òtù Christ ka ọ na-atụnye ụtụ nke ya n'ịkwalite ọrụ Chukwu na mgbasa oziọma n'ụzọ ọbụla o nwèrè ike, nakwa oge ọbụla o nwèrè ohèrè ime nke ahụ, n'ihi ọtụtụ ngọzị na-esochi ya azụ.

Na nzaghachi, onye nkuzi ụka na-elekọta ụlọ ụka 'St. Philips Anglican Church' Ebenator,' bụ Maazị Toochukwu Ezendụka fọrọ ekele n'ụkpa wee bunye Bishọọpụ Ikeakọr na nwunye ya, na ọtụtụ ndị dị iche iche sonyere na ya bụ mmemme ịtọ okwute ntọala, ọ kachasị ndị tụnyere ụtụ n'ụzọ dị iche iche iji hụ na ọ gara siriri-wèrèrè; ọbụnadị dị ka o kpèrè ka Chineke gọzie ha n'otu n'otu ma kwụghachikwa ha mmaji kwùrù mmaji.

Ndị ọzọ sonyere n'ofufe nrò ahụ gụnyèrè Nwunye Bishọọpụ dayọsiisi ahụ, bụ Dame Nkem Ikeakọr (Mama Amichi), tinyere Venerebụụl Chukwuma Akam, bụ onye ụkọchukwu na-elekọtabụ Archdeaconry ahụ n'oge mbụ, ma bụrụkwa onye nọ 'Ezinifite Archdeaconry' ugbua, na ọtụtụ ndị ọzọ.

E wezùga ịgbà ọnyà ego maka ịrụchàpụ ụlọ ụka ahụ, ihe ndị ọzọ pụtakarịchara ìhè na mmemme ahụ gụnyèrè abụ olu ọma dị iche iche a bụrụ site n'ọnụ ndị ọbụ àbụ, tinyere ikpughèpù na ido okwute ntọala ụlọ ụka ahụ nsọ kpọnkwem, bụ nke e mere site n'aka Bishọọpụ Ikeakọr.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.