Bridget Kelley ekwuona na Gọvanọ Chris Christie mara maka brijigeti

Bridget Kelley ekwuona na Gọvanọ Chris Christie mara maka brijigeti

Oct 23, 2016 - 04:44
Jan 20, 2021 - 04:45
 0
Bridget Kelley ekwuona na Gọvanọ Chris Christie mara maka brijigeti

Otu nwanyị onye rụrụ Gọvanọ Chris Christie ọrụ dịka onye aka mbụ ya na Steeti New Jersey agwana ndị ọkaịkwe na Gọvanọ Christie mara ịhe banyere brijigeti.

Brijigeti bụ aha E jiri mara arụ ahụ mere n’obodo Fort Lee na New Jersey, site n’abalị 9 ruo abalị 13 nke ọnwa septemba afọ 2013.

Ngalaba na-ahụ maka njem okporo ụzọ mechiri ọwara abụọ n’ime ọwara atọ si na akwa mmiri George Washington abata na Fort Lee. Nke a malitere n’isi ụtụtụ n’oge ndị mmadụ ji aga ebe dị ịche ịche.

A na-ebo Gọvanọ Christie na ndị otu ya ebubo na ha mechiri okporo ụzọ ahụ na Fort Lee maka iji taa ndị obodo ahụ afụfụ n’ihi na onye meyọ Fort Lee bụ Mark Sokolich akwadoghị Chris Christie mgbe Ọ na-azọ ọkwa gọvanọ na New Jersey.

Kemgbe ahụ, ndị ọkacha mara na-eme nnyocha ka A mata ma aka Gọvanọ Christie ọ dịkwa ọcha, tumadị ebe Ọ bụ na ndị na-arụrụ ya ọrụ, Bill Baroni na David Weinstein, kwetere na ha mara ebe mmiri siri banye n’opi ụgbọgụrụ.

Ọ bụrụ na E mecha chọpụta n’aka Gọvanọ Christie adịghị ọcha, E nwere ike ịgba ya onwe ya akwụkwọ n’ụlọ ịkpe.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.