CAFE Enwetela Akụrụngwa Ahụike Ọhụrụ Site Na Mba USA

Apr 30, 2021 - 21:39
 0
CAFE Enwetela Akụrụngwa Ahụike Ọhụrụ Site Na Mba USA

Izunna Okafor dere akụkọ a

Òtù ọrụ obi ebere ahụ a maara dịka 'Caring Family Enhancement Initiative (CAFE) nọrọ na nsonso a wee nweta nnukwu akụrụngwa pụrụ iche a na-ebugharị ebugharị, bụ nke e ji elekọta ma na-agwọ ndị nwere eze mgbu na ọrịa eze ndị ọzọ.

Kpọchakpọcha akụrụngwa ọhụrụ ahụ bụ nke a rụrụ n'ụdị ụgbọala, ma bụrụkwa nke e bunyere òtù ọrụ obi ebere ahụ n'efu site n'aka 'Wesleyan Church Of Denver', dị na mpaghara 'North Carolina' nke mba USA, site na njikọaka onye ahụ chịchara n'ọkwa na nsonso a dịka 'Mayor of London Borough of Brent', ma bụrụkwa Nwaadọ steeti Anambra, bụ Maazị Ernest Ezeajughi.

N'okwu ya oge ọ na-enyefe akụrụngwa ahụike ahụ na ìgòdó ya n'aka Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti Anambra, bụ Dọkịta Vincent Okpala, n'aha òtù ọrụ CAFE; Maazị Ezeajụghị kọwara onyinye ahụ dịka nke kwesiri ekwesi 'n ilekwasị anya n'ezi ọrụ dị iche iche CAFE na-arụ, nakwa etu o si etute olileanya ndị enweghị olileanya site n'ọrụ obiebere dị iche iche ọ na-abàgide, ma n'ime steeti ahụ ma na mpụga ya.

Dịka ọ na-akọwa onyinye ahụ dịka nkwàdo ha nye CAFE, iji sị ya jisie ike n'ọrụ; Maazị Ezeajụghị gosipụtara olileanya o nwere na nke ahụ ga-enye aka n'ụzọ pụrụ iche n'ime ka ọrụ ndị òtù ahụ na-agawanye n'ihu ma kawanye mfe.

Na nzaghachi ya n'aha onye chọpụtara ma bụrụkwa onyeisi CAFE, bụ nwunye aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọịka Ebelechukwu Obianọ, Kọmishọna Ọkapala kèlère ndị ahụ maka ọmarịcha onyinye ahụ. 

Ọ kọwara ya bụ onyinye dịka nke bịara n'oge ọ kachara dị mkpa, ma kpọpụtasịakwa ụfọdụ ụzọ dị iche iche nke ahụ ga-esi kwalite ọrụ CAFE na atụmatụ ya; ma kwezie nkwà na ha ga-etinye ya n'ọrụ nke ọma dịka o siri kwesi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484