Chineke, ụmụ Gị, ụmụ Igbo nọkwa Gị n’aka

Feb 24, 2015 - 01:16
Jan 22, 2021 - 05:14
 0
Chineke, ụmụ Gị, ụmụ Igbo nọkwa Gị n’aka

Igwe bụ ike. A nyụkọ amịrị ọnụ ọ gbọ ụfụfụ. Njikọ ka. Igbo kwenu! YAA! Ụmụ Igbo Ụmụ Chukwu, Ọ bụ onye ga-ekewa anyị na Chi anyị? Ọ dịghị onye pụrụ Igbochi ọlụ ọma Chukwu ụmụ Igbo ka ọ ghara ịga n’iru/ihu. Ọ bụ onye ga-eburu mmụọ ntigharị anya bata n’etiti ụmụ Igbo, ụmụ Chukwu, ka ha ghara ịma onwe ha dị ka ndị ọma ha na Chineke ha yị mgbe nile?

Ọ bụghị ndị Ọcha gwara anyị okwu ndịa: Njikọ ka. A nyụkọ amịrị ọnụ ọ gbọ ụfụfụ. Ukwu azịza anaghị agbaji agbaji. Igwe bụ ike.

Ụmụ Igbo, ọfọ mụ bụ ka ụmụ Igbo mata onwe ha dịka ụmụ Chukwu ha bụ na gbo gbo. Isee! A tụara ọmara ọ mara. A tụara ofeke, o feba n’ọhịa. Igbo mara nụ onwe ụnụ. ị kulie otele gị e soro gị. A naghị agbalarị Chi gị n’ọsọ. Onye gbakarịrị Chi ya n’ọsọ, ga agbagbu onwe ya. Chineke adịghị agbanwe agbanwe. Ka ọ dị na mbụ n’ime gị, ka ọ dịkwa ugbu a n’ime gị, o tua ka ọ ga-adịgidekwe n’ime mụ na gị rukwa mgbe anyị ga anwụ!

Onye kwe Chi ya ekwe! Ụmụ Igbo aghọtala, were kwa kwe na ha na Chi ha bụ otu. Nna na nne anaghị enye ụmụ ha mmiri nshị ka ha ṅụa. Maka na ha mara na ha na nwa ha bụ otu. Ụmụ Igbo na Chineke ụmụ Igbo nọ n’ime anyị mgbe nile. Chineke, ụmụ Gị, ụmụ Igbo nọkwa Gị n’aka ooooo. Chineke nara ekele!

A tụghị ime anyị n’ime mmehie. Nke a bụ okwu asị e ji ebunye ụmụ gị ibu arụ. Chukwu dị mma, ụmụ Chukwu nile dịkwa mma. Ọ dịghị unyi ọbụla dị ha n’ime, dịka ọ dịghị unyi dị n’ime Chukwu ụmụ Igbo, cha cha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.