Chisco Group of Companies' enyela gọọmenti steeti Anambra onyinye ego dị nde naịra iri

Apr 9, 2020 - 04:00
Jan 22, 2021 - 21:38
 0
Chisco Group of Companies' enyela gọọmenti steeti Anambra onyinye ego dị nde naịra iri

Izunna Okafor, Awka

Na ntụnye nke ya n'ịkwado agha ahụ a na-ebu megide ọrịa nje coronavirus, ụlọọrụ Chisco, bụ 'Chisco Group of Companies' enyela gọọmenti steeti Anambra onyinye ego dị nde naịra iri.

Ya bụ ụlọọrụ na-ewu èwù n'ihe gbasaara ime njem okporoụzọ nọrọ na nso nso a wee nyefee ya bụ ego nkwado n'aka gọọmenti steeti ahụ n'obi gọọmenti dị n'Awka.

N'okwu ya oge ọ na-enyefe gọọmenti akwụkwọ ndọrọ ego ahụ, onyeisi ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Chidi Anyaegbu, nke nlekọta na-ahụ maka ngalaba mpaghara ọwụwa anyanwụ ala anyị, bụ Maazị Uche Ochuba nọchitere anya ya, kọwara na nke ahụ so n'otu ọrụ nkwado ụlọọrụ ahụ n'ime steeti ahụ.

Ọ sịkwa na nke ahụ bụ ịgbaso ọkpụkpọ oku gọọmenti steeti ahụ kpọrọ ka ndị mmadụ na otu dị iche iche tinye aka ma gbatakwa ọsọ enyemaka n'agha ahụ a na-ebu megide mbata na maọbụ mgbasa ọrịa nje korona na steeti ahụ.

N'akụkụ nke ya, onye soro ya bụ nwa amadi wee bịa ije ahụ, ma bụrụkwa onyeisi ọchịchị obodo Amichi, bụ Maazị Dan Ugomba nọkwazịrị ebe ahụ kpọkuo ndị Anambra ka ha kwàdo gọọmenti n'agha ahụ ọ na-ebu.

O gosipụtakwara afọ ojuju ya banyere ihe dị iche iche gọọmenti megoro banyere ya bụ ọrịa nakwa ọdịmma ụmụafọ steeti ahụ n'ime oge a, ma kpọkuo ya ka ọ watasie ọgọdọ ike n'ime nke ahụ.

Ka ọ na-anabata ihe ndị ahụ n'aha gọọmenti, odeakwụkwọ ukwu steeti Anambra, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ kèlèrè ya bụ nwa amadi na ụlọọrụ ahụ maka onyinye afọ ofufò ya, ma kekwazie ndị ọzọ na ụlọọrụ dị iche iche na-agbatara steeti ahụ ọsọ enyemaka n'oge a.

O kwere nkwa na gọọmenti ga-ejikwa ma tinye ego ahụ n'ọrụ dịka o siri kwesi ma werekwa ya mee ihe e hibeere ya.

Ndị ọzọ dị iche iche nyere gọọmenti nkwàdo nso nso maka ibu agha megide ọrịa nje korona gụnyèrè: ụlọ mmepụta eriri ọkụ 'Cutix Cable' (nyéré akụrụngwa ahụike gburu ego ruru nde naịra iri), òtù 'Agụleri World Forum' (nyéré nde naịra abụọ) tinyere ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.