COVID-19: Gọọmenti Anambra Amalitela Ikesa Akpa Osikapa

Apr 9, 2020 - 04:19
Jan 22, 2021 - 21:26
 0
COVID-19: Gọọmenti Anambra Amalitela Ikesa Akpa Osikapa

Izunna Okafor, Awka

N'imezupụta nkwa ahụ o kwere, gọọmenti steeti Anambra amalitela ikesara akpa osikapa, nyegara ndị okenye nọ n'agbata ajọ iri isii gbagobezie n'obodo niile dị na steeti ahụ.

Mmemme ikesa akpa osikapa a bụ nke a malitere n'Agụleri, bụ obodo aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, ma bụrụ nke a nọrọ na ya wee jiri obodo iri na ise wee bido, nke ọ bụ ndị isi ọchịchị obodo ahụ nọchitere anya ha n'otu n'otu n'iburu ya bụ osikapa.

Ndị ndu obodo ahụ bụ ndị e bunyègasịrị akpa osikapa dị narị abụọ n'otu n'otu, tinyere akpa nnu na igbe tomato, ka ha ga kesaara ndị okenye narị abụọ nọ n'agbata ahọ ahụ n'ime obodo ha dị iche iche, malite n'onye kacha bụrụ okenye.

N'okwu ya na mmemme ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara ọchịchị ime ime obodo na echichi ọdịnala, bụ Maazị Greg Obi, onye gbapere ikesa akpa osikapa ahụ n'aha Gọvanọ Obianọ, kwuru na nke ahụ bụ iji mee ka ọtụtụ ndị mmadụ ghara izute ihe iche akamgba nke agụụ, ma mekwa ka ihe dịrị ụmụafọ steeti ahụ n'ime oge a nọ na ya n'ihi ọrịa nje 'coronavirus'.

Dịka ọ na-enye ndị Anambra ndụmọdụ ka ha na-erube isi nye ma na-agbasokwa ntụziaka ahụ gọọmenti nyere banyere ya bụ ọrịa obiri dike aka n'ala; o chetaara ha na ntụziaka ahụ bụ maka ọdịmma ha nke mmadụ ibe ha, n'ihi na ọ bụ nke ahụ ka bụgodi otu ụzọ doro anya mmadụ pụrụ isi gbanahị ọrịa ọjọọ ahụ.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ha ga-agba mbọ dịka o siri kwesi, ịhụ na ihe ndị ahụ rutere ndị e mebeere ya aka, ma kwuo na ndị ụlọ omebe iwu steeti ahụ, tinyere ndị ndu ụmụnwaanyị n'obodo sị iche iche ga-esokwa tinye anya ịhụ na ya bụ ozi e ziri anwụrụ ọkụ ruru eluigwe aka.

Na ntụnye nke, onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ileta ka ọrụ si aga na steeti ahụ 'State Project Monitoring and Management Office', Maazị Obumneme Akunyili, onye kọwara ihe ụlọọrụ ya na-arụ, mekwara ka a mara ha ga-esokwa tinye aka n'ọrụ ịhụ na ya bụ ihe erimeri ruru ebe e zi gara ya, ka ya bụ ọrụ gọọmenti bagidere wee mịta mkpụrụ a tụrụ anya.

N'ozi ekele ya, onyeisi oche izugbe nke otu ahụ jikọtara ndịisi obodo dị iche iche na steeti Anambra, bụ 'Anambra State Association of Town union (ASATU)' Maazị Alex Onukwue tòrò Gọvanọ Obianọ na steeti Anambra maka ịbagide n'ụdị ọmarịcha ọrụ ahụ, bụ inye ndị mmadụ ihe ha ga-eri dịka a sị ha nọrọ n'ụlọ, iji gbanahị ọrịa 'coronavirus'.

Ọ kpọkukwazịrị ndị obodo dị iche iche na steeti ahụ ka ha hụta ya dịka ihe dị oke mkpa na ihe kwesiri ekwesi, bụ ịgbaso ntụziaka ahụ gọọmentị nyere, ka ya bụ ajọ ọrịa wee ghara ịbata maọbụ gbasaa na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.