COVID-19: Obianọ Agbapeela Ịgba Ọgwụ Àgbà Nke Abụọ n'Anambra

Sep 4, 2021 - 19:35
 0
COVID-19: Obianọ Agbapeela Ịgba Ọgwụ Àgbà Nke Abụọ n'Anambra

¶Gbapee Ogige Ọhụrụ Na COOUTH


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọchịchị steeti Anambra agbapeela àgbà nke abụọ nke amụmà ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa nje korona nke abụọ, iji kwanyekwuo ọkụ n'agha ahụ a na-ebu megide ya bụ ajọ ọrịa, ma chekwaba Ndị Anambra pụọ n'ibute ọrịa ahụ.

Mmemme ịgbape amụmà ịgba ọgwụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ogige ụlọ ahụike nkụzi mahadum 'Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University Teaching Hospital, Amaku, Awka' bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa ebe aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọkwara wee gbapee ogige ngalaba atọ n'ụlọọgwụ ahụ na ọtụtụ akụrụngwa e butesiri ọhụrụ n'ụlọọgwụ ahụ. 

Ihe dị icheiche Gọvanọ gbapere ebe ahụ gụnyere ogigè maka nne na nwa, bụ 'Mother and Child Referral Center', ogige 'Dialysis Center', ogigè 'Private Ward', tinyere akụrụngwa C-T Scan.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ kọwàrà na ọgwụ nje korona ahụ a kpọrọ "Moderna” na “Astrazeneca" bụ ọgwụ a kpachapụrụ anya wee rụọ, nke na o nweghịkwa ihe égwu ọbụla dị na ya, nke mere e ji nabata ma na-agba ya na steeti ahụ, dịka ọ dị taa. 

Oge ọ na-adụ Ndị Anambra ọdụ ka ha sonyesie ike n'ịgba ọgwụ ahụ, ọ gakwara n'ihu dụọ ha ọdụ ka ha gbakwa mbọ na-asọpụrụ, na-edebe, ma na-agbasokwa ụkpụrụ na iwu niile e nyere maka ọrịa ọjọọ ahụ, ọbụladị ma mgbe ha gbachagodiri ọgwụ ahụ, iji hụ na ha ebuteghị maọbụ kesaa ọrịa ahụ.

Gọvanọ Obianọ kpọpụtasịrị ihe dị icheiche ọchịchị ya mepụtagoro na ngalaba ahụike iji hụ na Ndị Anambra nwere ezi ọnọdụ ahụike bụ igbà, ọbụladị dịka o kwere nkwà na ọchịchị ya ga-aga n'ihu ịkwàdò ngalaba ahụ na inwòghàrị ngalaba niile nke steeti ahụ, ruo mgbe oge ọchịchị ya gwụrụ.

N'okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ, bụ Dọkịta Vincent Okpala kọwara na Gọvanọ Obianọ emezùputela nkwa dị icheiche o kwere Ndị Anambra, ọkachasị nkwà ime ka steeti ahụ bụrụ ebe ndị mmadụ ga-esi mba dị icheiche wee bịa na-anara ọgwụgwọ n'ime ya. 

O kwuru na ọnụ agaghị akọcha akọcha, ihe Gọvanọ ahụ megoro na ngalaba ahụike, nke pụtakarịchara ìhè n'etu o siri nwogharịa ma kwàlite ogige ahụike ntà niile dị na steeti ahụ, wepụta amụmà nchekwa ahụike a maara dịka 'Anambra State Health Insurance Agency (ASHIA)', ogige mmepụta ikuku ndụ, bụ 'Anambra Oxygen Plant', tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

Na nkọwa nke ya, onyeisi ụlọ ahụike nkuzi mahadum 'Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University Teaching Hospital', bụ Dọkịta Josephat Akabụike kọrọ akụkọ ntọala banyere etu ya bụ ụlọọgwụ siri malite n'ahọ iri isii na ise gara aga, wee gabiga usoro nnwògharị na ogoogo dị icheiche wee ruo ogoogo ọ nọ na ya wee ruo taa


O mere ka a mara ụlọ ahụike ahụ enwetela uto na ọganihu n'ụdị dị icheiche, kpọpụtasịa ihe dara ụda ụlọ ahụike ahụ jiri bụrụ ọkaibe ugbua, ma kọwazie na ọ bụ ụlọọrụ Chevron na ndị òtù ha kwàdòrò ogige maka nne na nwa ahụ a rụrụ ọhụrụ n'ụlọọgwụ ahụ, n'ịgbaso ezi ebumnobi Gọvanọ Obianọ ịhụ na ụmụnwaanyị dị ime na ụmụaka a mụrụ ọhụrụ nwekwàrà ezi ọnọdụ ahụike bụ ịgbà na steeti ahụ.

O kelekwazịrị ndị Chevron maka ọmarịcha onyinye ahụ, kpọkuo ụlọọrụ ndị ọzọ ka ha ñòmie nke ahụ, ma kwe nkwà na a ga-etinye akụrụngwa niile ahụ n'ọrụ nke ọma, iji nweta mpụtara a tụrụ anya.

Na mbụ n'okwu ya oge ọ na-enyefe gọọmentị ogige ahụ n'aha ụlọọrụ Chevron, Maazị Seyi Orenuga mere ka a mara na ọ bụ n'ahọ 2018 ka ha màlitere njem ịrụ ogige ahụ, ma kwupụta na isi sekpụ ntị na nke ahụ bụ iji nye nne na nwa ezi ọnọdụ ahụike.

Ya bụ mmemme dọtara ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche n'ime steeti ahụ, nke gụnyere ndị ọrụ gọọmenti, ndị eze ọdịnala obodo dị iche iche, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484