COVID-19: Ọkaokwu Ụlọ Omebe Iwu Anambra Ekèéla Ndị Ayamelụm Osikapa

Apr 9, 2020 - 04:12
Jan 22, 2021 - 21:31
 0
COVID-19: Ọkaokwu Ụlọ Omebe Iwu Anambra Ekèéla Ndị Ayamelụm Osikapa

Izunna Okafor, Awka

Ihu ọchị wàra ndị obodo dị iche iche dị n'okpuru ọchịchị Ayamelụm na steeti Anambra, dịka ọkaokwu ụlọ omebe iwu steeti ahụ, ma bụrụkwa onye na-anọchite anya ha n'ụlọ omebe iwu ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor kesààrà ha akpa osikapa, iji mee ka ha nọrọ mma ma na-ekwekwa oyooyoo n'oge a anọ n'ime ya.

N'okwu ya na mmemme ikesara ndị ahụ ihe erimeri ahụ, bụ nke weere ọnọdụ na be ya, dị n'Ifite-Ọgwarị, Maazị Okafọr kwuru na nke ahụ bụ otu n'ime ụzọ o si atụnye ụtụ nke ya n'ibelàta mmetụta nke oge ịnọ n'ụlọ a n'ebe ụmụ mmadụ nọ, dịka ha na-agbaso ntụziaka ahụ gọọmenti nyere, nke ebumnobi ya bụkwa iji gbochie mbata maọbụ mgbasa nke ọrịa 'coronavirus' n'ime steeti ahụ.

O kwuru na ọ bụ site n'ụzọ mmadụ inyerịtara ibe ha aka ka a pụrụ isi merie ọnọdụ 'onye apụtakwala iro' a dị ugbua na ihe dị iche iche ọ pụrụ iwèta, ma kpọkuokwa ndị ọzọ nwere ihe ha pụrụ imenwu ka ha cheta ndị nọ na gburugburu ha.

Maazị Okafor, onye gbara mbọ hụ na e mere mmemme ikesa ihe oriri ahụ n'ịgbaso ntụziaka gọọmenti nyere banyere ọrịa ahụ, jikwazị ohere ahụ kpọkuo ndị Ayamelụm na ndị Anambra n'izugbe ka ha gbaa mbọ na-erube isi nye ntụziaka gọọmenti, n'ihi na ọ bụ site n'ụzọ ahụ ka ha pụrụ isi gbanahị ibute ya bụ ajọ ọrịa na-ewu na mba ụwa ugbua.

Ọ kpọkukwara ndị ọ dị n'aka ka ha gbaa mbọ hụ na ya bụ erimeri rutèrè ndị o kwesiri irute aka.

Oge ọ na-agba akebe na Anambra so na steeti mbụ n'ala Nigeria buru ụzọ malite atụmatụ inyere ụmụ mmadụ aka iji belata mmetụta nke oge ịnọ n'ụlọ a n'ahụ ha, kemgbe ọrịa 'coronavirus' malitere; ọ gara n'ihu kelekwa aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ezi ọrụ ya n'ibu agha megide ọrịa ahụ nà mmetụta ya n'ebe ụmụafọ steeti ahụ nọ.

A nọrọ na mmemme ahụ nye nkuzi bànyere ya bụ nje ọrịa 'coronavirus' ma kesàkwa àkpà osikapa karịrị otu puku n'ọnụọgụgụ nyegara ndị okpuru ọchịchị ahụ, tụmadụ ụmụnwaanyị isimkpe sitere obodo niilde dị n'ime okpuru ọchịchị ahụ, nke gụnyere: Ifite-Ọgwarị, Ọmọr, Ụmụmbo, Ụmụerum, Anakụ, Ịgbakwụ, Ụmụeje na Ọmasị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.