Dayọsiisi Agụata Emeela Nnukwu Ọgbakọ Ndị Nna, Katọọ Nsogbu Na-Adakwàsị Nigeria

Oct 13, 2021 - 22:53
 0
Dayọsiisi Agụata Emeela Nnukwu Ọgbakọ Ndị Nna, Katọọ Nsogbu Na-Adakwàsị Nigeria

Dayọsiisi Agụata Emeela Nnukwu Ọgbakọ Ndị Nna, Katọọ Nsogbu Na-Adakwàsị Nigeria


Izunna Okafor dere akụkọ a

Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Agụata, bụ Rt. Rev. Samuel Ezeofor akatọọla ma gbarụọ ihu banyere ajọ ọdachi na ihe iche aka mgba dị icheiche na-adakwàsị ala Nigeria, ya na ihe isiike ndị ọzọ ụmụafọ Nigeria na-agabiga ugbua.

Bishọọpụ Ezeofor kwupụtara nkatọ a n'ozi ya ọ gụpụtara na mmemme nnukwu ọgbakọ ndị nna na dayọsiisi ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọụka 'St. Augustine's Anglican Church, Umunze' dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Orumba South' nke steeti Anambra. 

Dịka ọ na-akpọkù ndị ji ọkwa ọchịchị ka ha gbasie mbọ ike iji weta ajọ ọnọdụ ahụ na njedobe; ọ kpọkwara òkù ka a na-enwe ikpe nkwụmọtọ na ihe ịga n'anya ya, ma na-agbasòkwa usoro nwa mmụọ emegbula nwa mmadụ, ma nwa mmadụ emegbula nwa mmụọ, ọkachasị dịka o siri metụta n'ikesà akụnụba, na inye maọbụ ịkpọlite n'ọkwa, ma n'ogoogo gọọmenti etiti ma na nke steeti.

Mgbe ọ na-akpọ òkù ka onye ọbụla jisie ike n'ekpere ma chọọ ihu Chineke ka o wee gbata ọsọ enyemaka n'ajọ ọnọdụ ahụ; ya bụ Bishọọpụ, onye ozi ya gbàdoro ụkwụ n'isiokwu mmemme ahụ, nke pụtara (ma a tụgharịa ya n'Igbo) "Ụkpụrụ Mnwògharị Nke Si n'Igwe — Iso Ụzọ Chineke", jikwàzịrị ohere ahụ wee dụọ ndị nna ọdụ ka ha mara ọrụ ha ma na-arụsikwa ya ike n'ezinụlọ ha dị icheiche.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, onye ji ọkwa dịka Chaplen ndị nna n'ime dayọsii ahụ, bụ Rev. Davidson Okoye, kèlèrè ndị nna maka ezi ọrụ ha n'ezinụlọ na n'ụlọụka, ma dụọ ha ọdụ ka ha kwụdosie ike n'okwukwe ha, ghara ịda mba maọbụ sụọ ngọngọ n'okwukwe na n'ọrụ ha; ọbụladị dịka ọ kpọkuru gọọmenti ka o mee ka e nwee ezi ọnọdụ dị larịị maka onye ọbụla, ma nwoke, ma nwaanyị.

Na ntụnye nke ya, Ashịdikin nke Ezinifite Ashịdikinri, bụ Ven. David Obiagbaso kèlèrè Bishọọpụ Ezeọfọr maka ihe dị icheiche o mepụtara na ezi ọrụ ọ rụpụtara na Dayọsiisi ahụ, ma kpọọ òkù ka a nabata ya bụ ozi ọ gụpụtara dịka ihe ha bụ ndị nna ga na-agbaso wee na-arụ ọrụ, bụkwazị nke otu nwoke ọzọ, Maazị Samuel Okonkwo kwàdòrò, ma kelekwa Bishọọpụ ahụ na nwunye ya maka nkwàdo ha na-enye ndị nne na ndị nnà na dayọsiisi ahụ.

Mmemme ahụ dọtàrà ọtụtụ ndị ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu, nke gụnyere nwunye Bishọọpụ ahụ, bụ Oriakụ Chinyere Ezeofor, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

A nọkwara na ya bụ mmemme wee kpee usoro ekpere dị icheiche, bụọ abụ otuto na abụ ofufe, kpaa maka ma kpekwa ekpere banyere isiokwu dị icheiche metụtara ụmụnwoke ahụ, ụlọụka na ọnọdụ ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484