Dayọsiisi Niger Ejirila Ọñụ Chịkọta Mmemme Sinọọdụ Ahọ 2021

Jun 15, 2021 - 18:23
 0
Dayọsiisi Niger Ejirila Ọñụ Chịkọta Mmemme Sinọọdụ Ahọ 2021

Izunna Okafor dere akụkọ a


A kpọkuola ma dụọ ndị mmadụ, ọkachasị ndị ụka ka ha bụrụ ndị na-edebe okwu Chineke na-emekwa ya eme oge niile ka ihe wee gaara nke ọma.

Òkù a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi mpaghara Niger, bụ Bishọọpụ Owen Nwokolo, n'okwu ya na mmemme ọgbakọ sinọọdọ dayọsiisi ahụ nke ahọ 2021.

Ya bụ sinọọdụ bụ sinọọdụ nke atọ n'ime àgbà sinọọdụ nke iri atọ na otu daọsiisi ahụ na-eme, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'ụlọụka 'St. John's Anglican Church' dị n'obodo Eziowelle, n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili North' nke steeti Anambra. 

N'okwu ya n'ebe ahụ, nke gbadoro ụkwụ n'isiokwu ọgbakọ sinọọdụ ahụ, bụ "Bụrụ Ndị Na-Eme Okwu Ahụ; Abụla Naanị Ndị Na-Anụ Ya Anụ", Bishọọpụ Nwokolo kọwara na ndụ ezi onye òtù Christ bụ ngosipụta ụdịdị Chineke na ịgbaso usoro o si eme ihe, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị ụka ka ha bụrụ ndị òtù Christ n'eziokwu ma na-egosipụta ya n'okwu ọnụ ha na omume ha oge niile.

Dịka ọ na-akatọ etu ụfọdụ ndị ụka si eme omume anaghị egosi na ha bụ ndị òtù Christ, ya bụ nnukwu onyeisi ụka Angịlịkan jìkwàzịrị ohèrè ahụ wee kelee ndị obodo Eziowelle na ndị ụlọụka 'St. John's Anglican Church, Eziowelle' maka ibu sinọọdụ ahọ a, ma kpee ka Chineke gọzie ma kwụghachi onye ọbụla tụnyere ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji mee ka ya bụ sinọọdụ gaa nke ọma.

N'okwu ya n'ebe ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nke ọ bụ Maazị Uzu Okagbue nọchitere anya ya, mèrè ka a mara na ọchịchị ya na ndị ụka nwere ezi mmekọ na ezi njikọaka kemgbe ahọ asaa o jiri bata n'ọkwa ọchịchị, ma kọwaa na nke ahụ amịtala ọtụtụ ezi mkpụrụ n'ụzọ dị iche iche. Ọ kpọpụtasịrị ihe dị iche iche ọchịchị ya mepụtàgòrò nà ụzọ dị iche iche o sigoro kwàdo ndị ụka kemgbe ahọ asaa gara aga, ma kwe nkwà na ọ ga-aga n'ihu ịkwàdò ha, ọbụladị dịka ọ dụrụ ndị ụka ọdụ ka ha gaa n'ihu ikpere ala Nigeria, steeti ahụ nà ọchịchị ya ekpere oge niile.

Na mbụ n'okwuchukwu ya na sinọọdụ ahụ, Bishọọpụ Dayọsiisi Kabba, bụ 'Rt. Rev.' Stephen Akobe kọwara akwụkwọnsọ dịka ihe nlegaraanya nà ùgègbè na-agbàzi ije, ndụ na nzọụkwụ mmadụ, ma nwekwa ike inwòghàrị ndụ mmadụ.

O kwuru na ọ bụ onye ọbụla ma okwu Chineke nke ọma ma na-emekwa ya eme bụ ezi onye òtù Christ, bụkwa onye nwere ọtụtụ úrù ọ ga-erite site n'ime nke ahụ; ọbụladị dịka ọ kọwara dayọsiisi mpaghara Niger dịka ọkaibe n'ala Nigeria, ma kèlee Bishọọpụ ahụ maka ihe dị iche iche o mepụtagoro na dayọsiisi ahụ, kpọkukwa ndị òtù Christ ka ha na-adàbere n'okwu Chineke oge niile, maka na Chineke anaghị agharịpụ.

Oke mmemme sinọọdụ ahụ bụ nke a nọrọ na ya wee wee kpáá ma kpéé ekpere maka ọdịmma dayọsiisi ahụ, kpéé usoro ekpere dị iche iche maka ọdịmma ala Nigeria, chụọ nta ego ego maka ịkwalite ọrụ mmepe na dayọsiisi ahụ, waa achịcha bekee e mere maka sinọọdụ ahụ, bụọ abụ olu ọma dị iche iche, ma gọzikwa obodo ahụ buru ya bụ sinọọdụ nà ụmụafọ ya, tinyere ihe ndị ọzọ mere ka sinọọdụ zaa aha a kpọrọ ya n'eziokwu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484