Dino Melaye na Ndị Ọzọ Ga-apụta N'Ejije Naijiria

Nov 29, 2019 - 20:13
Jan 24, 2021 - 03:58
 0
Dino Melaye na Ndị Ọzọ Ga-apụta N'Ejije Naijiria

Ibe Kelechukwu, Ibadan

Ihe ngosi ejije Naijiria, Nollywood, a kpọrọ Lemonade, bụ nke ihe niile zugoro oke maka igosi ya n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Dicemba n'ụlọ oriri Transcorp Hilton dị na Abuja. Ejije ahụ nke ndị ma nke ekwe na-akụ n'ejije na ndị ọzọ amara aha so n'ime ya dịka Sinatọ Dino Melaye, Kunleb Remi, Ayoola Ayobami, Linda Osifo, Mofe Duncan, Real Warri Pikin, Chioma Idigo na Sean King, tinyere ndị ọzọ.

Ihe ngosi ahụ bụ nke ụlọọrụ na-eme ejije Joy Media Productions mepụtara ebe onye ama ama na nhazi ihe ngosi, Lummie Edevibe nke Filmcorp bụ onye haziri ya. Ihe ngosi ahụ bụ nke gosiri onye na-amalite ide ihe ma nweta ike ịhapụ mmekọrịta nke na-emekpa ya ahụ ma chụọ ihe ahụ ọ chọrọ ịbụ na-eleghị anya n'akụkụ maka ndị ihe ya na-amasị.

Dịka ọ na-ekwu okwu maka ihe aka mgba ha nwetara ebe ihe ngosi ahụ dị, onye mepụtara ya, Joy Idoko, bụ onye sokwa mee ejije ahụ, kwuru na o gabigara ọtụtụ nsogbu iji were mepụta ejije ahụ. "Ejije ahụ bụ nke gara n'etiti mmadụ abụọ na-ede ejije. Na mbụ, enwetaghị m ihe m na-achọ. Ya mere m jiri were degharịa ejije ahụ site n'inye aka onye nhazi.

O were ihe dịka afọ abụọ iji were depụta ejije ahụ otu ọ dị mma ma chịkọtakwa ndị mere ejije ahụ. Ihe kacha si ike bụ ịhọpụta onye nhazi maka ejije ahụ." "A gam ekwu na onye nhazi ejije ahụ ruru ezigbo ọrụ. Ebe niile anyị jiri mee emume ahụ apụtaghị ka m siri chee nke mere anyị jiri chọọ ruo na tịmkọm tịmkọm ikpeazụ. N'ikpeazụ, ebe m na-arụ ọrụ abụọ, dịka onye mmepụta na onye ejije, mere ka ihe niile a bụrụ ihe ụtọ."

Dịka ọ na-ekwu mkpebi ya na ịmepụta ejije ahụ, o kwuru na ebumnobi ya bụ ka ọ gbaa ndị Naịjirịa ume ka ha pụta n'ebe ha tọrọ ụtọ dina ala na ọnọdụ ndị ahụ jọgburu onwe ya ma mee ka nrọ ha pụta ìhè. "Ọtụtụ mmadụ bụ ndị nke enyi adịghị mma gbochiri ịga n'ihu, mana anyị ga-ekpebi ma kwụdosie ike ịbụ mmadụ n'ụwa. Ụzọ agaghị adị mfe ma ọlị mana n'ikpeazụ, ọ ga-abụ ụzọ kwesịrị ka agaa,"

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.