NDLEA Anwụchiela Nwaanyị Na-Eresi Ụmụakwụkwọ Ihe Oriri E Jiri Ọgwụ Ike Mee n'Abuja

Apr 21, 2021 - 19:28
Apr 21, 2021 - 21:07
 0
NDLEA Anwụchiela Nwaanyị Na-Eresi Ụmụakwụkwọ Ihe Oriri E Jiri Ọgwụ Ike Mee n'Abuja

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịkpọ na ịtụ mgbere ọgwụ ike, bụ ụlọọrụ 'National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA)' nọrọ n'Abuja wee nwụchikọọ otu nwaanyị a na-enyo ènyò na ọ na-eresi ụmụaka ụmụakwụkwọ na-agụ n'ụlọakwụkwọ dị n'ebe ahụ, nà ọfụdụ ndị ọzọ bi na mpaghara ahụ ihe oriri na achịchị e jiri ọgwụ ike wee mee.

Nke a bụ nke a gbara n'anwụ site n'aka onye na-ahụ maka mgbasaozi ụlọọrụ NDEA n'Abuja, bụ Maazị Femi Babafemi, site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ ụbọchị Tuzdee.

Dịka o siri kọwaa, nwaanyị ahụ bụ Rhoda Agboje ma bụrụkwa nwata akwụkwọ nọ n'ogo nke atọ ya na mahadum, ebe enyi ya nwoke bụ Maazị Ifeanyi Nwankwo ma bụrụkwa onye a nwụchikọrọ n'isi mbido izuụka a. Ọ sịkwa na ha ka na-achụ ụfọdụ ndị òtù ahụ ndị ọzọ nọ n'ọsọ ugbua.

O kwuru na ndị òtù ahụ na-eji ọgwụ ike dị iche iche, dịka 'arizona', 'alcohol', 'rohypnol' na ndị ọzọ wee na-emepụta achịcha bekee, ihe ntagharịọnụ na ihe oriri ndị ọzọ wee na-eresi ụmụakwụkwọ ahụ.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ha chọpụtara arụrụala ndị ahụ na mpaghara Gaduwa dị n'Abuja, oge ha jidere Agboje na ihe oriri anọ ahụ, oge ha nwetechara mkpesa banyere etu ótù nwatakịrị siri richaa ihe oriri ahụ o jiri ọgwụ ike mee, wee malite imeghèri na ịkọghèrì ka onye pụrụ ara ọhụrụ, nke na o kweghịzịkwa arahụ ụra, ná-emeghèrizị emeghèri.

Oge a gbara ya ajụjụọnụ, jiri ọnụ ya wee sàá ásịsà na ọ bụ ya na enyì ya siri ihe oriri ahụ, ma na-eresikwa ya  ụmụakwụkwọ, ndị na-eme mmemme, ndị na-ere ya n'ahịa, nakwa ọhaneze ndị ọzọ na-ego ya n'amaghịama.

Ndị ọrụ NDLEA ahụ gàkwàzịrị na be enyi nwoke nwaanyị ahụ, wee hụ ihe ọtụtụ ihe oriri ọgwụ ike ahụ, nke ruru 200 n'ọnụọgụgụ, tinyere ọtụtụ akụrụngwa dị iche iche ha ji eme ihe oriri ahụ, bụkwazị nke e bukọọrọ ga kpọchie ụlọọrụ NDLEA, ebe a nọzịkwa eme nnyocha banyere ha ugbua.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ NDLEA na FCT, bụ Maazị Mohammed Marwa kèlere ndị ọrụ ya maka ịchọpụta na ikpùghè arụrụala ndị omekoome ahụ.

Ọ kwara arịrị na ihe kacha njọ bụ na ndị ahụ macha ụma wee na-eresi ọhaneze, ọkachasị ụmụaka ụmụakwụkwọ ihe oriri ahụ e jiri ọgwụ ike wee rụọ, ma kọwaa nke ahụ dịka arụrụala jọgburu onwe ya, nakwa nke nwere ike iwèta ọtụtụ mpụtara ọjọọ dị iche iche n'obodo.

Dịka ọ na-ekwe nkwà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma kpee ha ikpe banyere ihe ha mere, ọ kpọkuzịkwara ma dụọ nne na nna ọdụ ka ha na-eleru ụmụ ha anya nke ọma, ma na-akpachàpụkwa anya n'ụdị ihe oriri na ihe ọñụñụ ụmụ ha na-eri n'ụzọ maọbụ n'ụlọakwụkwọ, maka na ndị na-edozi ụgbọala ekweghịzị sị màra ndị bụ ndị ara na ndị isi dị mma.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484