E Jidela Mmadụ Anọ Na-Apụnara Mmadụ Ụgbọala n'Anambra

Apr 9, 2020 - 03:53
Jan 22, 2021 - 21:40
 0
E Jidela Mmadụ Anọ Na-Apụnara Mmadụ Ụgbọala n'Anambra

Izunna Okafor, Awka

Ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uwe ojii na steeti Anambra, bụ Maazị Harụna Mọhammed ejidela mmadụ anọ na-apụnara ndị mmadụ ụgbọala n'ike na steeti ahụ, ma napụtakwa ha ụgbọala ha pụnaara ndị mmadụ.

Dịka ya bụ ozi siri kọwaa, ndị uwe ojii nọ na mpaghara Abagana nọrọ n'abalị atọ nke ọnwa a wee jide mmadụ abụọ aka ha dị n'ịpụnara Maazị Nkemjika Uzoigwe ụgbọala ọkwụọtọ ekele eze ya, nwere akàrà afere ACA 348 HM, bụ nke ha mere n'abalị iri atọ na otu nke ọnwa gara aga n'ogologo ụzọ ahụ siri Abagana gaa Eziowelle

Ndị oji egbe ezu ahụ, bụ Maazị ThankGod Akwo, bụ onye Ogidi (gbara ahọ iri atọ) na Maazị Onwe Hillary onye steeti Ebonyi (gbara ahọ iri atọ na otu).

Otu ọ dị, e sitekwazịrị na nnyocha e mere, wee nwude mmadụ abụọ ọzọ bụ ndị òtù ahụ, n'ime steeti Imo, nke gụnyere Maazị Tirimisiyu Tijani (gbara ahọ iri abụọ na asaa), bụ onye Ibadan na steeti Ọyọ, na Maazị Suleiman Raheem (gbara ahọ iri atọ), bi na steeti Imo.

Ka ọ dị ugbua, a napụtala ndị ajụ ụgbọala ahụ site n'ebe ha bujere ya ka e gbugharịa ma nwògharịa ya, tinyekwuoro ụgbọala bọọsụ Mitsubishi ọzọ dị mma a napụtara ha, bụ nke ha ji aga ọrụ ohi ahụ.

Ndị ahụ kwetakwara na ọ bụ ha kpàrà arụ ahụ n'ezie, ma rịọ ka a gbaghara ha.

Onyeisi ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị John Abang kwuru na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma e mechaa nnyòcha bànyere okwu ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.