E Jidela Onye Ogbi Ji Isi Na Aka Mmadụ, Tie Ya Gwoogwoo

Jan 17, 2022 - 21:44
 1
E Jidela Onye Ogbi Ji Isi Na Aka Mmadụ, Tie Ya Gwoogwoo


Izunna Okafor dere akụkọ a


Aka abụọ nọrọ na nsonso a wee ghọọ Maazị Chinedu Okoro otu aka  mgbe a nwụchikọrọ ya ka o ji isi mmadụ, aka mmadụ na ụfọdụ ihe ndị ọzọ n'ime àkpà o bù.

Nke a bụ nke mere na mpaghara Omoku dị na steeti Rivers, bụ ebe a nọrọ wee nwụchikọọ ya bụ nwokorobịa ka o bù àkpà ahụ.

Ya bụ nwaokorobịa, Chinedu Okoro, ka e kwuru na ọ gbara ahọ iri abụọ na atọ, ma bụrụkwa onye ogbi na onye ntị ochi (deaf and dumb).

Ọ bụ oge ndị mmadụ hụrụ ka o bu àkpà ahụ, etu àkpà ahụ dị na etu o siri buru ya ka e jiri màlite inyò ya ènyò. Nke ahụ mezịrị e jiri kwụsị ya, ka e wee nyochaa àkpà ahụ ma chọpụtakwa ihe dị n'ime ya n'eziokwu.

Kaosiladị, o wèzịrị onye ọbụla anya ma mekwa onye ọbụla nọ ebe ahụ 'kpịm' n'ọnụ ngwangwa ha nyòrò anya n'ime akpa ahụ wee hụ isi mmadụ, bụ isi agadi nwaanyị e gburu ọhụrụ, nà aka mmadụ abụọ, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ dị n'àkpà ahụ.

Nke a mezịrị ka ndị ọrụ nchekwa ‘ONELGA Security Peace and Advisory Council (OSPAC)’ nwụchikọọ ya bụ nwoke ozigbo, ya na ihe ndị ahụ e nwetegasịrị n'aka ya.

Ka ọ dị ugbua, e nyefèzịrị okwu ahụ n'aka ndị uweojii steeti ahụ, ka ha wee mekwuo nnyocha banyere ya ma mekwa ya ka e si eme ya.
 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484