E Liela Ozu Emmanuel Ezike n'Amichi

Jul 22, 2020 - 17:23
Jan 26, 2021 - 17:24
 0
E Liela Ozu Emmanuel Ezike n'Amichi

By Izunna Okafor

Ọnwụ bụ ọzọ a mà na onye ọbụla ga-echirịrị, ma bụrụkwa òkù a ma na onye ọbụla dị ndụ ga-azarịrị chi ya oge ọbụla o jiri kpọọ ya.

Nke a bụ isi sekpụ ntị n'okwuchukwu ofufè nrò akwamozu Emmanuel Ezike, bụ nke weere ọnọdụ nso-nso a n'ezinụlọ be ya dị n'Amichi, n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Nnewi South' nke steeti Anambra.

N'okwuchukwu ya na mmemme akwamozu ahụ, Ụkọchukwu Samson Ikedinma gbàdòrò ụkwụ n'akwụkwọ nsọ dị ka ọ dị na Mkpughe 22: 12, wee kpọkuo onye ọbụla ka o chegharịa ma chigharịkwute Chineke, dozie ndụ ya ma nye fèé ya onwe n'aka Chineke, iji wee kèta òkè n'alaeze eluigwe n'ụbọchị ikpeazụ, n'ihi na onye ọbụla nwụrụ anwụ ga-enwerịrị ebe ọ ga-anọ ọnọdụ ebighịebi 

N'okwu nke ya, Oriakụ Amaka Ezike, bụ nwunyè nwoke ahụ nwụrụ anwụ ma bụrụkwa nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nyegara Gọvanọ Willie Obianọ n'ọrụ pụrụ iche, kọwàrà di ya dịka onye udo, onye na-arụsi ọrụ ike, nwoke obi umeala, na nwoke nwere ùgwù na nsọpụrụ pụrụ iche.

O kpezịrị ka Chineke nabata mkpụrụobi ya na ndokwa ma nyekwa ya ezumike udo ruo mgbe ebighịebi na mgbe ha ga-ezutekwa ọzọ ebe ọnwụ apụghị ikewakwa ha ọzọ. O kelekwazịrị ndị dị iche iche bịara nọnyere ya na ndị ezinụlọ ya n'oge iru újú ahụ. 


Na ntụnye nke ya, oge o dùrù ndị òtù egwuregwu 'Keep Fit Club' wee bịa akwamozu ahụ, onyeisi ụlọọrụ 'Anambra Newspapers and Printing Corporation' bụ Maazị Chuka Nnabuife kasiri ndị ezinụlọ ahụ obi maka ọnwụ nwoke ahụ, ma kpee ka mkpụrụobi di ya nwee ezumike udo n'ime Chineke.

Oge Ka Ọ Dị Taa na-agba ya ajụjụ ọnụ, otu onye e ji okwu ya agba ìzù n'obodo ahụ, bụ Maazị Maja Umeh, kọwara Maazị Ezike lara mmụọ dịka nwoke achọghị nsogbu, na nwoke gbara mbọ ka nwoke ma tụnyekwa ụtụ nke ya n'ịkwalite mmepe obodo na inyerịtara mmadụ aka oge ọ nọ ndụ 

N'echiche obi ya banyere etu e si emekpa ụmụnwaanyị ahụ ma di ha nwụọ n'ụfọdụ mpaghara ebe dị iche iche n'ala Igbo, Maja Umeh, onye bụkwa Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na omenala na steeti Anambra n'oge mbụ, gbarụrụ ihu bànyere nke ahụ ma katọọ ya dịka ihe jọgburu onwe ya, ma n'anya mmadụ, ma n'anya Chineke.

Ọ kpọkuzịrị ndị na-etinye aka n'ihe dị etu ahụ ka ha wepu aka na ya, ma ọ bụrụ na ọ gaghị amasị ha ka ihe dị etu ahụ dakwasị ụmụ ha ndị nwaanyị maọbụ ụmụnne ha ndị nwaanyị.

Mmemme akwamozu ahụ dọtara nwa amadi ahụ na-anọchibụ anya ọgbọ nta nkwàdo mpaghara Anambra Etiti n'ụlọ omeiwu sineeti, bụ Maazị Victor Umeh; Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Uchenna Okafor; onyeisi oche Ọhaneze Ndị Igbo na steeti Anambra, Maazị Damian Okeke-Ogene, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

A mụrụ Maazị Emmanuel Ezike n'ahọ 1954, ma ọ lara mmụọ n'abalị iri na otu nke ọnwa Epure ahọ a, ka ọ garachara ihe karịrị otu ọnwa o jiri nwechaa ihe mberede okporo ụzọ. Tupuu ọnwụ ya, Maazị Ezike ji ọkwa dịka onyeisi ngalaba n'ahụ maka ego n'ụlọ nkwariakụ gọọmenti steeti Anambra, bụ 'Golden Tulip Hotel, Agụlụ'.

Ndị ọ hapụrụ na-eru uju ọnwụ ya gụnyere: nwunye ya, ụmụ ya, ụmụnne ya, nakwa ndị ọgọ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.