E Lìéla Ozu Papa Cyril Igwe n'Ebenatọr

Feb 19, 2020 - 20:57
Jan 22, 2021 - 22:02
 0
E Lìéla Ozu Papa Cyril Igwe n'Ebenatọr

Izunna Okafor, Awka

Ọnwụ bụ ọzọ a mà na onye ọbụla ga-echirịrị, ma bụrụkwa òkù a ma na onye ọbụla dị ndụ ga-azarịrị chi ya oge ọbụla o jiri kpọọ ya. Nke a bụ isi sekpụ ntị n'okwuchukwu ofufè nro akwamozu Nze Cyril Igwe, bụ nke weere ọnọdụ nso-nso a n'ezinụlọ be ya dị n'Ebenatọr, n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Nnewi South' nke steeti Anambra.

Ụkọchukwu Benedict Okolo, bụ onye nyawara àchịchà okwu Chineke n'oge ahụ, kwùrù na ihe ndị mmadụ kwesiri ịdị na-echè oge ọbụla mmadụ nwụrụ abụghị ahọ ole onye ahụ dị were nwụọ, akụnụba o nwèrè, etu akwamozu onye ahụ siri wee dàa ụdà, maọbụ ihe ndị ọzọ dị otu ahụ; kama na ọ bụ ebe mkpụrụobi onye ahụ na-aga ịnọ ọnọdụ ebighị ebi ya, maka na mmadụ ọbụla ga-anatarịrị ụgwọ ọrụ dịka ọrụ ya siri dị.

Dịka ọ na-ekpe ka Chineke nabata ma nye mkpụrụobi Cyril Igwe ezumike udo; Fr. Okolo, onye gbadoro ụkwụ n'akwụkwọ Matiu 20:1—16, kpọkùzịrị ma dụọ imirikiti ndị bịara akwamozu ahụ ka onye ọbụla hie asaa n'anya, na-ebi ezi ndụ ma na-ejerịtara Chineke na mmadụ ozi, n'ihi na o nweghị onye maara mgbe oge nke ya ga-abụ, o wee bulaa akwụkwọ.

N'akụkụ nke ya, Fr. Vincent Nnabude, bụkwa onye ụkọchukwu sitere obodo ahụ, kelèrè otu n'ime ụmụ nwoke ahụ, bụ Maazị Maazị Emeka Igwe maka ịrụ na ite okporoụzọ n'obodo ahụ, bụ nke a kpọkwàsàrà aha Maazị Cyril Igwe iji mee ka ọ dị ọkpụtọrọkpụ, ma bụrụkwa nke a gbàpèrè nso-nso site n'aka Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ bụ Maazị Marcel Ifejiọfọr n'aha aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ.

Na nzaghachi ya n'aha nke diọkpara bụ Maazị Elias Igwe, osote diọkpara, bụ Maazị Emeka Igwe kèlère ndị dị iche iche bịara ịnọnyere ha n'akwamozu ahụ, ya na ndị tụnyere ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji hụ na ihe niile gara nke ọma. O kelekwàra Chineke maka ezi ndụ nna ha biri n'ụwa, bụ onye ọ kọwara na ọ bụ mmadụ eziokwu na nwoke obi sara sara, n'ilekwasị anya n'otu ha na ya siri wee bikọọ n'ụwa.

Maazị Igwe, bụ onye onye ọrụ obi ebere na onye ọnọdụ ụmụ mmadụ na-echu ura, kọwàrà na mkpebi ya ịrụ na ite okporoụzọ ahụ o tèrè n'obodo ahụ abụghị naanị iji mee ka ndị bi na mpaghara ebe ahụ tadobe ahụhụ, maọbụ naanị iji kwàlite ọnọdụ mmepe obodo ahụ; kama na ọ bụ iji kwụdosie ike na nzọụkwụ nna ha, bụ onye o kwùrù na ọrụ obi ebere chùrù ya ụra n'oge nke ya, ogologo ndụ ya niile.

Ụfọdụ ndị iche iche sonyere n'akwaozu ahụ, nke gụnyere eze ọdịnala Ebenatọr, bụ Igwe Chinewubeze Ezejiburu; Onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Anthony Okechukwu; Ọkammụta Sam Ụzọchukwu; onyeisi ụlọ ọrụ 'Everyday Group of Company Ltd' bụ Dọkịta Charles Dimnwaobi, tínyéré ọtụtụ ndị ọzọ gbàrà akaebe na Maazị Igwe biri ezi ndụ n'ụwa tupuu ọ laa mmụọ, ma sịkwa na nke ahụ pụtàrà ìhè na ndụ ụmụ ya. Ha dụkwàzịrị ndị ọ hapụrụ n'ụwa ka ha kara obì, ma kpọkuokwa ụmụ ya ka ha sosie nzọụkwụ ya ike, iji wee mee karịa ya.

A mụrụ Maazị Cyril Igwe n'ezinaụlọ Nze na Lọọlọ Dim Igwebum n'Ebenatọr n'ahọ 1930, ma ọ nwụrụ n'abalị iri nke ọnwa Nọvemba ahọ 2019 ka ọ rịachara obere ahụ. Maazị Igwe gbàrà ahọ iri asatọ na iteghete tupuu ọ laa mmụọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.