Edo 2020; Obianọ Anabatala Ndị Anambra Tuuru Ugo, Gbáà Ha Ume

Jun 10, 2021 - 16:37
 0
Edo 2020; Obianọ Anabatala Ndị Anambra Tuuru Ugo, Gbáà Ha Ume

Izunna Okafor dere akụkọ a


Gọọmenti steeti Anambra nọrọ n'izuụka a wee nabata ụmụafọ steeti ahụ tuuru ùgo ma nweta ihe nrita dị iche iche n'asọmpi egwuregwu ala Nigeria ahụ e mere na steeti Edo,bụ nke a kpọrọ Edo 2020.

Mmemme ịnabata ndị a bụ nke weere ọnọdụ na be aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, dị n'Agụleri, n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East', ma bụrụkwa nke Gọvanọ Obianọ nọrọ na ya wee naa ha aka, ma gbàkwa ha ume n'aha gọọmenti steeti ahụ.

Ndị ahụ tuuru ùgò bụ ndị ọgbaọsọ, ma bụrụkwa ndị ritere ihe nrite ruru iri atọ na asaa n'ọnụọgụgụ, nke gụnyere ọlaedo isii, ọlaọcha iteghete, na ọlanchara iri abụọ na abụọ; ma bụrụkwa ndị onye na-ahụ maka nkwalite egwuregwu na steeti ahụ, bụ Maazị Tony Oli.

N'okwu ya oge ọ na-anabata ndị ahụ, Gọvanọ Obianọ nàrà ha aka maka itube steeti ahụ ùgò, ma kọwaa na nke ahụ bụ nnọọ igosipụta mmụọ Onye Anambra, maka na Anambra na ụmụafọ ya na-emewanye nke ọma oge niile ma na-ebutekwa ụzọ n'ezi ihe niile. 

Ọ gwara ndị ahụ ritere ọlaedo ka ha jidesie ya ike, ghàrá ikwe ka ndị ọzọ napụ ha ya n'ọdịnihu; gwa ndị nke nwetara ọlaọcha na ọlanchara ka ha gbasie mbọ ike inweta ọlaedo mgbe ọzọ; ọbụladị dịka ọ gwakwara ndị eriteghị ihe ọbụla n'asọmpi ahụ ka ha gbasiekwa mbọ ike, nwee ezigbo ọzụzụ, iji wee nwe ike irite ihe nrite n'asọmpi ndị na-abịa n'ihu.

Gọvanọ Obianọ, onye kpọpụtasịrị úrù dị iche iche dị n'egwùrégwu, gàkwazịrị n'ihu kwe nkwà na ọchịchị ya agaghị ada mbà n'ịkwàlite na ịkwàdò ngalaba egwuregwu na steeti ahụ; ma kelekwazie ndị mgbàzi ịa ndị nkụzi egwuregwu Anambra duru ndị ahụ wee gaa asọmpi ahụ.

N'okwu nke ya, onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka nkwàlite egwuregwu na steeti Anambra, bụ Maazị Tony Oli mere ka a mara na tupu ọ bata n'ọkwa, na ọ bụ naanị otu ihe nrite ka òtù egwuregwu Anambra nwetara n'asọmpi ikpeazụ ha gara. 

O kwukwazịrị na ọchịchị Gọvanọ Obianọ enwògharịala ngalaba egwuregwu steeti ahụ, ma kpọpụtasịakwa ihe dị iche iche ụlọọrụ ya mepụtagoro, nke ha na-eme ugbua, na nke ha ga-eme n'ọdịnihu. Ọ kpọpụtasịkwara asọmpi egwuregwu ndị nke ha ka na-akwadobe ịga n'ọdịnihu, ma kwupụta olilanya o nwere na ha ga-eturu ugo ma ritekwa ọtụtụ ihe nrita n'ebe ahụ.

Ndị ọzọ sonyere na mmemme nnabata ahụ gụnyèrè eze ọdịnala Agụleri, bụ Igwe Michael Idigo; nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nyegara Gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara ndị ikedịnobi, bụ Ọkaiwu Chuks Ezewuzie, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

A nọkwara na mmemme ahụ wee mee obere ihe ngosi mmegharịahụ site n'aka obere nwaada Stephanie Onuzuruike gbara naanị ahọ iri, bụ onye ritere otu ọlaedo, ọlaọcha abụọ na otu ọlanchara. 

Site n'aka gọọmenti steeti Anambra, ndị ahụ ritere ọlaedo n'asọmpu ahụ nwètara otu nde naịra n'ótù n'ótù, ebe ndị nke ritere ọlaọcha nwètàrà narị puku naịra ise n'ótù n'ótù. Ndị nke ritere ọlanchara n'asọmpi ahụ nwetèkwàrà narị puku naịra abụọ na puku iri ise; ebe onye mgbazi egwuregwu kacha wee mee nke ọma nwètàkwazịrị otu nde naịra site n'aka gọọmenti steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484