Edward Snowden na-akwado ịlọta Amerịka

Edward Snowden na-akwado ịlọta Amerịka

Mar 3, 2015 - 18:50
Jan 19, 2021 - 18:51
 0
Edward Snowden na-akwado ịlọta Amerịka

Nwa afọ mba Amerịka ahụ bizi na Rushịa kemgbe afọ 2013 maka ịgba ama megide otu CIA na-enwe nkwado ịlọghachi Amerịka. Onye ọkaikpe Snowden na Rushịa, Anatoly Kucherena, gwara ndị nta akụkọ na Snowden na ndị ọkaikpe si mba Amerịka na mba Jamini amalitego ịkpa ụbụbọ maka usoro ịhụ na Snowden lọghachiri Amerịka.

Ndị na-ekwuru gọọmenti Amerịka na Wọshintin kwuru si na mba Amerịka dị njikere ịnabata Snowden, kama na mgbe ọ bụ na Snowden jechara lọta, ọ ga-abịa zara ọnụ ya n’ụlọ ikpe n’Amerịka.

Edward Snowden bi na Rushịa, ebe ọ gbagara ọsọ ịzọ isi onwe ya n’afọ 2013, mgbe ọ gbara n’anwụ ihe niile Amerịka na-ezobu ezo maka otu ha si etinye anya n’akpa ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.