EFCC Anwụchiela Ndị 'Yahoo Yahoo' Iri na Anọ n'Anambra

Sep 2, 2020 - 21:02
Jan 28, 2021 - 21:03
 0
EFCC Anwụchiela Ndị 'Yahoo Yahoo' Iri na Anọ n'Anambra

Izunna Okafor

Onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ.

Ka ọ dị taa, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide igwù ojoro na ịmazụ ego ọhaneze n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ 'Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)' anwụchiela mmadụ iri na anọ a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-egwu ojoro site n'usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụụ ịntaneetị a maara dịka ndị 'Yahoo Yahoo'.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mgbasa ozi n'ụlọọrụ EFCC, bụ Maazị Dele Oyewale siri kọwaa, mmadụ iri na anọ ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ site n'aka ngalaba ụlọọrụ ahụ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, ma bụrụkwa ndị a nwụkọtara dịka ụmụ ọkụkọ site na mpaghara ebe dị iche iche n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, nke gụnyere Ọkpụnọ, Agụ Awka, na Ngọzịka Esteeti.

Dịka o siri kọwaa, ndị ahụ a nwụchiri bụgbado ụmụokorobịa, ma bụrụkwa ndị nọ n'agbata ahọ iri abụọ na ótù, wee ruo n'ahọ iri abụọ na asatọ. Ọ sịkwa na ihe e nwekọtara n'aka ndị ahụ gụnyere ụgbọala oke ego dị iche iche, nke gụnyere 'Mercedes Benz 4matic' atọ, 'Mercedes Benz AMG' na 'Lexus Rx Salon' abụọ, tinyere ụfọdụ akụrụngwa dị iche iche ha ji arụ ọrụ 'Yahoo Yahoo' ha.

Maazị Oyewale kọwara na obere nnyocha e megoro n'ekwentị ndị ahụ gosiri na ha bụ ndị sigoro n'usoro ịntaneetị wee gwùó ndị mmadụ ojoro site n'ịtụ mgbere bitcoin adịgboloja, ịhụnanya adịgboloja, ikweta na ha bụ onye ha abụghị, na usoro ndị ọzọ.

Ọ gakwazịrị n'ihu mee ka a mara nnyocha ka na-aga n'ihu banyere ndị ahụ na arụrụala ha, nke mgbe e mechaara ya, a kpụpụ ha ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.