Ego Mbute: EFCC Anwụchiela Mmadụ 11 Maka 'Yahoo Yahoo'

Oct 17, 2021 - 20:36
 0
Ego Mbute: EFCC Anwụchiela Mmadụ 11 Maka 'Yahoo Yahoo'

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na ọ na-abụ onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ.

Ka ọ dị taa, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide igwù ojoro na ịmazụ ego ọhaneze n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ 'Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)' anwụchiela mmadụ iri na otu a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-egwù ndị mmadụ ojoro site n'usoro nzikọrịtaozi ọgbara ọhụrụ ịntaneetị, bụ ndị a maara dịka ndị 'Yahoo Yahoo'.

Dịka ozi a kụpụrụ na nsonso a site n'aka ngalaba na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ EFCC ahụ siri kọwaa, mmadụ iri na otu ahụ bụ ndị e jidere na Benin bụ isi obodo steeti Edo. Ozi ahụ kọwakwara na a nwụchiri ndị ahụ na mpaghara ebe dị icheiche na Benin, site n'ịgbaso ozi ha nwetere banyere ha, ebe ha nọ, nà arụrụala ha dịka ndị na-etinye aka n'ihe gbasaara isi n'ụzọ ịtaneetị wee na-ezu ndị mmadụ aka ha dị ọcha ohi.

Ụlọọrụ ahụ kpọpụtàsịkwàrà aha ndị ahụ dịka Osahon Bright, Aigbe Joseph, Stephen Isibor, Trust Odagwe, Francis Ezomo, David Courage, Ehis Okenedo, Omoragbo Paul, Obehi Owman na Godwill Jacob.

Ihe dị icheiche e nwetere n'aka ndị ahụ gụnyèrè ụgbọala asatọ dị oke ọnụ ahịa, nke gụnyere ụgbọala Mercedes Benz GLK 350, Mercedes Benz C300, Mercedes-Benz C250, Mercedes-Benz C300, Mercedes Benz GLE63, Range Rover, Toyota Camry na Toyota Venza.

Ụlọọrụ EFCC ahụ mèkwàzịrị ka a mara na ndị ahụ e jidere na-enye ha ụfọdụ ozi dị mkpa ugbua iji rụọ ọrụ ha nke ọma; ma kwe nkwà na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyocha banyere nke ahụ, ebe a ga-eji usoro iwu wee a nyụọ ha ịkpakwụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484