Egwu

Nov 6, 2017 - 21:14
Jan 22, 2021 - 07:18
 0
Egwu

Izunna Okafor, Awka

Egwu bu onye amaghị agba, o kwebe n'isi. Ọ bụ ọtọpuru keleke isi. Egwu bụ ụda ọma a nụrụ na ntị ma bụrụkwa okwu ọnụ a gụrụ agụ, gbaa ya agbaa. Egwu bụ nri mkpụrụobi, ma bụrụkwa ọgwụ apa ime mmụọ. Ọ bụ ọgọdọ mkpuchi iwe, maka na egwu bata ọgbọ, ọnụma alakpuo ụra.

A na-ekwe egwu ekwe, a na-ege egwu ege, a na-akụ egwu akụ, a na-agbakwazị egwu agba. A sị na e kwee egwu emeghị ọkpa n'ala, ị mara na isi apụtaraghị keleke, maka na e kwee 'yaa', a nụghị 'yoo, ị mara na onodo adịghị n'otu. Ya bụ na egwu ọma na-adọta ụkwụ.

Ndị obodo dị iche iche nwere egwu ha na-agba, bụkwa nke e jiri mara ha; dịka a sị na ọkwa mba na-achị n'olu n'olu, na ọ bụkwa ihe ndị nwere ka ha ji eme ngala. Ndị Igbo, ndị Yoruba, ndị Awụsa, tinyere ndị ọcha na ndị agbụrụ/mba ọzọ dị iche iche, nwechara egwu e jiri mara ha, bụ nke ọ ga-abụ onye nụ ozigbo, ọ mara ndị nwe ya. N'ihi na a sị na a kọrọ pụọ ama, a kọlaruo ụlọ; ka e wedata ya n'ebe ndị Igbo nọ maka na a dịghị ahapụ egwu n'ụlọ gbaa n'ama. Ndị Igbo nwere ụdị egwu dị iche iche e jiri mara ha.

E nwere egwu nkpọkịtị, uhie, egwu ọgbamgbada, egwu ijele, egwu ekpo, egwu adaka, egwu mmọnwụ, ịgbaeze, egwu egedege, tinyere ọtụtụ egwu ndị ọzọ e jiri mara ndị Igbo. A bịakwa n'iti egwu, ndị Igbo nwekwara ọtụtụ egwu dị iche iche ha na-eti, nke gụnyere: egwu ogene, egwu ekpiri, egwu ịgbà, tinyere ọtụtụ ndịṅ ọzọ. Egwu ndị a niile bụgbado egwu e jiri mara ndị Igbo ma bụrụkwa egwu ọdịnala ha.

Egwu ọdịnala ndị a kacha apụta ihe n'oge gboo n'ihi na ọ bụghị naanị na ọ na-egosiputa ịma mma nke ọnatarachi ndị Igbo, kama oge ahụ bụ oge ndị na-eti egwu ghọtara ihe ha na-eti.

N'oge gboo ahụ, egwu ọbụla onye igbo kụrụ na-ejuputaa n'amamihe, nwee nghọta dị n'ime ya, na-akọwa ihe ma na-akụzikwa ihe. Ọ bụ oge a na-echemi echiche ime were akụ egwu, n'ihi na ndị Igbo na-ti egwu oge ahụ anaghiṅ eti ya ka e were sịchaa na ha tiri egwu, ma ọ bụ ka aha ha were wuo ewuo na mba ụwa, ma ọ bụkwanụ ka wee bute ego niile dị n'ụwa, bịa dọba be ha.

Ọ bụ ezie na ihe ndị a abụghị ihe mbụ na mbụ ndị a na-ebu n'obi were eti egwu; mana oge na-adịghị anya, ihe ndị ahụ niile na-eji aka ha abịa, maka na a sị na ahịa ọma na-ere onwe ya, ma sịkwa na oke ehi anaghị ezo n'irùrò, maka na ugo gbuzuo, ọ chakee.

N'oge ahụ, bụ oge elu bụ ala ọsa; ụmụafọ Igbo a ma ama n'iti egwu amamihe juputara na ya, ma bụrụkwa ndị aha ha na-ewu ewu n'ogoogo mba ụwa gụnyere: maazị Oliva De Coqué, Maazị Osita Ọsadebe, Emeka Moroko Mmadụka, Pati Ọbasị, Mike Ejeagha, Nico Mbaga, Teriza Ọnụọra, Orienta Brọdas, Braịtị Chimezie tinyere ọtụtụ ndịṅ ọzọ, ma ndị na-eti egwu ụka ma ndị egxu ọdịnala.

Ndịa na-eji ngwa egwu e jiri mara ndị Igbo wee na-eti egwu, dịka ọja, ekwe, udu, mkpọmkpọ, ịchaka, ogene, ụbọ na ọtụtụ ngwa egwu ndị ọzọ, ma sikwa n'egwu ha na-akụzi ihe, na-agbazi ihe, ma na-akọwakwa ihe n'elu n'ụwa.

Oge ahụ bụ oge egwu nwere, ùgwù, nwee isi na ọdụ, ma bụrụkwa oge a na-akwado akwado tupu agbapụta n'ihu ọgụ maka na onye emeghị nkwado sụnye isi n'utokokpiri, o seghị ese, o die edie. Oge ahụ bụ oge egwu bụ ọgwụ obi mgbu, ọgwụ iwe na ọgwụ ike ọgwụgwụ, maka na onye ọrịa nụ egwu metụrụ ya, o tee n'ike, ma chezọọ na arịrịa ji ya aka. E sikwa n'ụdị egwu dị otu a wee na-belata ihe ọjọọ na-emegasị n'ụwa n'oge ahụ, na-akasi obi ma na-akwalitekwa udo na mmekọrịta mmadụ na ibe ya. A sị na egwu ọma bu akpa uche apụta ọgbọ; onye tụnye ntị ya, o kere nke ya.

Ihe dịzị ajọ mwute ugbu a bụzị na a hụpụziela igwu mbazụ n'ala, gwubezie n'isi ji, e wee na-asụtọsịzị ji asụtọsị, maka na a hapụ ịsụ n'ikwe sụọ n'ala; ma nri ma ofe ebebe aja aja.

Mkpokọta ya bụ na ndị ugbu a ahapụziela ige a na-akụ n'egwu, kụghara ihe ọzọ. Egwu wee na-adazị aja aja. Egwu a na-akụzị ugbu a abụghịzị ka ndị gboo si akụ ya. Ọ bụ ezie na ihe na-eme mgbanwe, mana ajọ mgbanwe bu ọghọm.

Ndị na-etizị egwu ugbu a na-etizị ọchaa achaa gbute, ọ chaghị acha gbute. Ihe niile wee na-adazị nghatangha; maka na e sighị n'ọdụ agbọ akwụ.

Onye ọbụla na-etizị egwu ugbu a, ma ndị nwere ya dịka ọnatarachi, ma ndị gwọtara nke ha n'ọgwụ, na ndị na-eti maka na ibe ha tiri, ma ọ bụ ka wee zaa oti egwu, ma ọ bụkwanụ bukọtachaa ego niile dị n'ụwa. A sị na ofeke kpuru okwu ọzọ, echichi aghọọ ihe ịchọ mma, maka na ihe a kpọghị onye abụghị akara ya.

Egwu a na-etizị n'oge ugbu a na-eluzị ilu na ntị, na-edufu edufu, ma na-emebikwa emebi, karịa idozi edozi. Oge agaala mgbe ndị egwu bụ ndị nkụzi na ndị ozi. Ihe a na-amazị aka ya ugbu bụ ka a mara onye egwu nke ya ga-aka wee mebi ụmụ mmadụ, juputa n'ihe arụrụ ala, ma ọ bụ wusaa n'ogoogo mba ụwa.

Ugbu a bụzịkwa oge mmadụ na-ahapụ itiri Chi ya egwu, ma kọchaba mmadụ ibe ya, kụba asịrị a kwụrụ ụgwọ ya, ma ọ bụ chọba ihe ọ ga-ekote. Ihe ụfọdụ dịzịkwa mma ya bụ ịkọpịrị ma ọ bụ kụgharịa egwu onye ọzọ kụrụ n'ụzọ ọzọ, ma bagharịa ya aha, ka o wee zaa nke ha, ma ọ bụ ka ha wee rie otuto, ma ọ bụ zaa ọkụ egwu.

Ọka n'ọnụ ọgụ n'ime ndị na-eti egwu ugbu a bụzịkwa ajambele na akụkọ abaghị n'ihe ka ha ga-akọgide, egwu agwụ. O nweghị otu ihe ọbụla mmadụ ga-amụta n'ọnụ ha, rukwaa oge egwu gwụrụ.

Amamihe na nghọta kọzịkwara ụkọ n'egwu. A sị na ndị ara juputa n'ahịa Ọnịsha, ótú Ọnịsha aghọrọ ọmà ara, karịzie ịbụ ọmà ahịa, maka na a kpodo ọgụ isi n'ala wee gbuo, aja eju onye ọbụla anya.

Ya mere, ndị be anyị, ka anyị laghachinụ azụ n'ebe anyị si, ma ghọta uru egwu bara na ndụ mmadụ. Dịka m kwuru n'ọkwa mba na-áchị n'olu n'olu; ka anyị ghara iji maka na ndị ọzọ na-eme otu ahụ, wee so ha mebe, maka na ọ bụ ezie na anụ yiri onwe ha, mana nke ọbụla nwere ihe ọ na-asọ. Eleghị anya, ọ naghị agbata ndị mba ọzo n'uche na e si n'egwu akwalite omenala, si na ya na-akụzi ihe bura uru, si na ya na-adụ ọdụ, ma sikwazie na ya na-ezi ozi. Mana ihe ndị a bụ nnọp ihe mbụ ezi nwaafọ igbo ọbụla na-akụ egwu na-ebu n'uche tupuu o tinye aka na ya, maka na ọkụkọ sị na ya na-ajụwu ajụwu tupu ribe.

Ka anyị mara na nke anyị bụ nke anyị, na ọ bụkwa site n'egwu naṅihe ndị ọzọ anyị na-eme ka anyị si egosi ụwa ihe anyị bụ, na ihe e jiri mara anyị. Nke ahụ pụtara na anyị iti egwu abaghị n'ihe bụ ite onwe anyị ure na ịkọrọ ụwa otu anyị siri dịka njọ, n'ihi a na-esi n'isi ahụrụ wee mara ụtọ nsị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.