Egwuregwu Ndị Uwe Ojii Nke Ahọ 2020 Abịala Na Njedobe n'Awka

Mar 11, 2020 - 23:32
Jan 22, 2021 - 21:58
 0
Egwuregwu Ndị Uwe Ojii Nke Ahọ 2020 Abịala Na Njedobe n'Awka

Izunna Okafor, Awka

Igbo sị na ọ na-abụ a nyụchaa nsị a kapnaghị ya ọnụ ọ dị ka òtòrò, maka na ihe a mara bido na-adị mma ịma emechi. Ọ bụ n'ịgbakwasị ụkwụ na nke a ka e jiri were oke mmemme dị dara ụda wee wèta n'isi njedobe, asọmpi egwuregwu ndị uwe ojii ala Nigeria nke ahọ 2020, bụ nke weere ọnọdụ n'ime steeti Anambra.

Oke mmemme ahụ, bụ nke a chịkọbàra n'ogige Alex Ekwueme dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ dọtàrà puku kwùrú puku mmadụ, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị iche iche n'ala Nigeria sonyere na ya, nke gụnyere onyeisi ala Nigeria, bụ Muhammadụ Buharị.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi ala, Buharị, nke ọ bụ Minista ntà na-ahụ maka gburugburu, bụ Oriakụ Sharọn Ikeazọr nọchitère anya ya, kọwàpụtarà na obi dị ya ka ọkà e ghunyere n'éjù maka etu ya bụ asọmpi egwuregwu siri wee gaa siriri werere, ma bụrụkwa nke a na-atụzị anya na mpụtàrà ya ga-amalite ịchawàpụtà n'uju na mpaghara niile nke ala Nigeria n'oge adịghị anya, ọ kachasị dịka o siri metụta ịkwakite ezi ọnọdụ nchekwa.

N'ihi ọtụtụ úrù a tụrụ anya na nke ahụ ga-eweta, ya bụ onyeisi ala kèlere ndị dị iche iche tụnyere ụtụ n'ọtụtụ ụzọ dịkwa iche iche iji hụ na ya bụ asọmpi egwuregwu gàrà siriri wèrèrè, ọ kachasị gọọmenti Anambra, nke ọ bụ steeti ya lèrè ọbịa na ya bụ asọmpi nke ahọ a.

Ọ kpọkukwazịrị ndị uwe ojii ahụ sonyere na ya bụ asọmpi egwuregwu ka ha tinye ihe dị iche iche ha mụtara site n'asọmpi ahụ n'ọrụ, ma sikwazie n'ụzọ dị otu a rụpụtàzuo mpụtara nke ebumnobi e jiri hibe ya bụ asọmpi egwuregwu.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ndị uwe ojii n'ala Nigeria, bụ Maazị Mohammed Abụbakar Adamu kọwàrà ya bụ asọmpi dịka ọpụrụ iche nakwa ọkacha mma kemgbe a malitere ya bụ asọmpi n'ala anyị, ma kwuo na nke ahụ bụ n'ihi ezi njikere na ezi ọrụ gọọmenti steeti Anambra lere ọbịa n'asọmpi ahụ, ya na ezi agbambọ nke òtù ọrụ haziri ya bụ asọmpi; ma gosipụtakwazie olileanya o nwere na nke ahọ 2022 ga-akawanye mma.

O kelekwazịrị ndị uwe ojii dị iche iche sonyere na ya bụ asọmpi nakwa ọchịchị steeti Anambra lere ọbịa na ya, ma kwuo ya na ọ na-atụ anya na steeti ndị ọzọ ga-ele ọbịa n'asọmpi ahụ n'ọdịnihu ga-elere steeti Anambra anya ma mee nke ọma karịa.

N'akụkụ nke ya, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ mere ka a mara na ọ bụ ihe iji nye Chineke ekele na asọmpi ahụ, bụ nke weere ọnọdụ otu izuụka, bịàrà n'isi njedobe na-enweghị akụkọ ọjọọ ọbụla a nụrụ n'ime ya site na mpaghara ebe ọbụla.

Ọ kpọpụtasịrị ọtụtụ urù ya bụ asọmpi wetààrà steeti ahụ site n'ụzọ dị iche iche, ma mee ka a mara na a ga-aga n'ihu iji akụrụngwa egwuregwu ahụ a rụnyesiri n'ebe dị iche iche n'ime steeti ahụ n'ogologo oge egwuregwu ahụ, mee ka egwuregwu na-agawanye n'ihu n'ime steeti ahụ.

Ka ọ na-ekele isi ọchịchị na ndị omebe iwu steeti ahụ, nakwa ndị ọzọ soro nye aka ịhụ na asọmpi gara nke ọma, Gọvanọ Obianọ kelekwazịrị ụfọdụ ụlọọrụ njem okporoụzọ na steeti ahụ, nke gụnyere ụlọọrụ Chisco, G.U.O, na Ifeanyịchukwu maka ibupụta ụgbọala ha maka ibugharị ndị uwe ojii ahụ; kelee ụlọọrụ na-emepụta osikapa Coscharis nakwa Stine Rice maka ịtụkọta osikapa ma bunye ndị uwe ojii ahụ, iji hụ na onye ọbụla n'ime ha buru ótù akpa osikapa were laa.

Asọmpi egwuregwu ndị uwe ojii nke ahọ 2020 a kpọrọ "Anambra 2020" bụ agba nke iri na abụọ ya, ma bụrụkwa nke were otu izuụka n'ime steeti Anambra.

Na ya bụ asọmpi, ndị sitere mpaghara isi ala anyị na isi ụlọọrụ uwe ojii gbara ndị nke mbụ site n'irita mkpokọta ihe nrita dị 239 n'ọnụọgụgụ; ndị sitere mpaghara nke abụọ gbara ndị nke abụọ site n'irita ihe nrita dị 198, ebe ndị mpaghara nke iri na otu gbara ndị nke atọ site n'irita mkpokọta ihe nrita dị 119.

A nọrọ na mmemme ahụ tie ma gbaa ụdị egwu dị iche (bụkwa nke Gọvanọ Obianọ na nwunye ya soro gbaa); sọọ mpi ịdọ ndịdọ eriri n'etiti ndị ọrụ agha mmiri na ndị ọrụ agha elu Nigeria, tinyere ọtụtụ ihe nkiri na obi añụrị dị iche iche weere ọnọdụ n'ebe ahụ ụbọchị ahụ, bụ nke mezịrị ka mmemme ahụ zaa aha a kpọrọ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.