Ehi Igbo

Jan 28, 2021 - 04:41
 0
Ehi Igbo

Izunna Okafor dere abụ a


Pòkòpòkò ka ọ na-ézè
N'anya Chukwu na n'anya mmadụ
Ihe dị mma na anya gbàrà
Ị hụkwàrà anụ na mma 
Ehi Igbo ka ọ bụ.

Lekene ụyọkọtọ ara ya
Na àkpàkwùrù amụ ndị bụ óké
Ìtè afọ ya, na àpàtà ụkwụ ya
Ihe ndị a niile bụcha anụ anụ
Ehi Igbo ka ọ bụ.

Ọ naghị achọ nwoke okwu
Nke o ji achọ nwaanyị
Ọ naghị ebíbì ihe a kọrọ n'úgbō
Ma ya fọdụzie ịràkọ mmadụ na onye nwe ya
Ehi Igbo ka ọ bụ.

Ehi Igbo anaghị eri óké egō
Mana úrù ya kàrịrị nke ndi ọzọ
Ịzụ ya anaghị ewèta ihe arụ
Maka na onye nwe ya ñụjùrù mmiri ara afọ
Ehi Igbo ka ọ bụ.

Ehi Igbo na-amụ nwa juru eju
Ụmụ ya na-etokwa ọsọọsọ
Ehi Igbo na-agba óké anụ
Anụ ya bụkwa ezigbo ihe ụtọ
Ehi Igbo ka ọ bụ

Ehi Igbo anaghị anwụ hịam 
Dịka nke ndị ngō
Ọ bụghị ọrịa niile na-atụkwa ya
Maka na onye nwe ya ma ihe o jìrì zụọ ya
Ehi Igbo ka ọ bụ

Ehi Igbo achọghị AK47
Ehi Igbo achọghịkwa RUGA
Maka na agbụgbọ dị ya ahụ mma
Ehi Igbo bụ anụ ụlọ
Ehi Igbo ka ọ bụ

Ehi Igbo na mmadụ anaghị akwàkọ iko
Maka na nke ahụ bụ ihe arụ
Ehi Igbo anaghị àwá isi
Okwu na ụka abụghịkwa njirimara ya
Ehi Igbo ka ọ bụ.

Ehi Igbo dị mfé ọkpụkpa
Ehi Igbo na-agbasi ike
Ehi Igbo na-adị ọcha
Ehi Igbo bụkwa sọ mma
Ehi Igbo ka ọ bụ.

Ụmụ Igbo zụbanụ ehi Igbo
Ụmụ Igbo ribenụ ehi Igbo
Maka na nke a bụ nke anyị
Ehi Igbo atọgbuo m
Kpọọ nụ ya ehi Igbo...
Ehi Igbo...


© Izunna Okafor

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.