Ekele n'Ala Igbo

Oct 21, 2017 - 01:05
Jan 22, 2021 - 07:20
 0
Ekele n'Ala Igbo

Izunna Okafor, Awka

Ekele bụ ụzọ mmadụ si ekwupụta ma ọ bụ egosipụta ka obi dị ya nyegara mmadụ ibe ya, mmụọ ma ọ bụ Chi kere ya. Ọ bụ ime obi e gosipụtara n'elu ọnụ, ma bụrụkwa echiche e mepụtara n'omume.

Ekele pụtara ọtụtụ ihe n'ebe ọtụtụ ndị nọ n'ihi na ọ bụ ezie na uche bụ uche, mana nghọta dị iche. Ndị ọbụla nwekwara ụzọ dị iche iche ha si ekele ekele maka na nkụ dị na mba na-eghere mba nri. Ọ bụkwa ihe ndị na-aghọta ka ha na-asụ. Ekele ndị ọbụla na-agbakwasịkwa ụkwụ n'asụsụ ha n'ihi na ekele niile nwere ụsa. Onye aghọtaghịkwa ihe e kelere ya apụghị ikwe ekele ahụ, maka na mmadụ abụghị oke ngwere na-ekwe n'isi nye ihe ọbụla ọ nụrụ; ma nke a gwara ya ma nke a gwaghị ya.

Nke a pụtara na ndị Igbo, ndị Awụsa, ndị Yoroba, ndị ọcha na ndị agbụrụ dị iche iche na mba ụwa nwere ekele nke ha, n'asụsụ ha dị iche iche.

N'ala Igbo, e nwere ụdị ekele dị iche iche, nwee oge e ji ekele ha, ma nwekwa ihe nke ọbụla na-egosipụta. Iji maa atụ, e nwere ekele ọrụ bụ nke a na-ekele ndị na-arụ ọrụ, dịka: daalụ, ndeewo, jisie ike, ma bụrụkwa nke na-egosipụta otuto na agbam ume nye ndị na-arụ ọrụ.

E nwere ekele onye ihe mere bụ nke e ji akasí mmadụ obi banyere ihe dakwasịrị ya, dịka ndo, dibe, kara obi. E nwekwara ekele oge ụbọchị, bụ ndị a na-ekele n'oge dị iche iche n'ụbọchị, dịka ụtụụ ọma, ehihe ọma, uhuruchi ọma, ka chi fo.

Ndị Igbo nwekwara ekele onye na-eme njem, dịka: ije ọma, ladị mma/ laa mma o, jee lọta, ka ọ dị, ije awele.

E wezuga ndị a, ndị Igbo nwegasịzịkwara ọtụtụ ekele ndị ọzọ dị iche iche ha na-ekele na mgbe na mgbe, ọ kachasị n'oge gboo. N'oge gboo, n'ala Igbo, ihe ndị kacha apụta ihe n'ekele ndị a niile bụ nghọta, nsọpụrụ, na obi e ji ekele ha.

Na mgbe ochie ahụ, bụ oge elu bụ ala ọsa na oge mmadụ ji uche eme ihe; ụmụaka nwere nsọpụrụ ma nwekwa egwu, ndị okenye na-ejikọlo ma na-akwanyere onwe ha ugwu iji wee dị mma ikele ekele, ndị mmadụ ghọtakwara ihe ekele pụtara. Nke a mezịrị na ekele na-atọ ụtọ n'ọnụ oge ahụ ma na-edozikwa ahụ. Ige ndị a bụcha ihe a na-ahụta n'oge gboo.

Mana oge ugbu a, ihe ndị a aghasasịala. Ụmụaka amaghịzịkwa onye bụ okenye ma ya fọdụzie inwe nsọpụrụ. Ndị okenye n'onwe ha adịghịzịkwa ejikọlo onwe ha, ma ya fọdụzie ime ka okenye. Onye ọbụla na-erezị ugwu ya, na-egoro ihere. Ndị okenye na-alụtazị ekele n'ọgụ, ebe ụmụaka na-akwazị ekele dịka iyi. Ekele wee na-akọzị ọkọ n'ahụ onye na-ekwe ya, ma na-adụzịkwa ogwu n'ọnụ onyd na-ekele ya. Ọ bụzị onye were ọnụ rịọta ekele, o were gịnị kwe ya?

N'oge mbụ, nwa agbọghọ hụ okenye (ọkachasị nwoke) ka ọ na-aga n'ụzọ, ọ ga ehu ala kelee ya tupuu ọ gafee. Ọ bụkwa site n'ụzọ dị otu a ka ụfọdụ si ahọta nwa agbọghọ nwere nsọpụrụ ha ma ọ bụ ụmụ ha lụrụ, maka na omume onye na-edu ya.

Mana ugbu a, nwata nwa agbọghọ ahụ okenye n'ụzọ, kama ọ ga-ekele ya ekele ya ekele nkịtị ma ya fọdụzie nke ihukpu ala; o letọba onye ahụ anya na mkpụrụ anya ma ọ bụ sèé ihu ka nwa enwe imo Ọka gafere, dịka a ga-asị na ọ chọrọ ịgba ya enyi, ma ọ bụ na ya na ndị ka ya jide ego emekọọla ihe.

Ihe ndị a wee bụrụ nnọọ nzuzu dị oke ọnụ ahịa n'ebe ọtụtụ ndị mmadụ nọ, ọ kachasị ụmụ agbọghọ na ụmụ okorobịa. Ụfọdụ hụkwuzie mmadụ, ha atụfuo ihu, ma ọbụ malite ịza oku ekwentị ndị mmụọ. Ekele n'ala Igbo n'elu ugbu a bụzịkwa nchi taa arụ, o wee taa, maka onye echetereghị, ọ gaghị ekele.

N'aka nke ọzọ, ikele ụfọdụ ndị okenye ekele ugbu a bụzị iticha aka n'akpụkpụ ehi na ịgbasa mmiri n'elu okwute n'ihi na obi ọjọọ na ọnụma na-ekojuzịkwa obi ụfọdụ oge niile. E kelee ha ekelee, ha araa ntị mmanụ ka ngwere aghọ, ọ bụrụ na e keleghị ha, ha achọba onye ga-ebo ibu ọnụma. Ụfọdụ anaghịzịkwa ekweputa ekele ekweputa; E kelee ha ụtụtụ, ehihe, abali, naanị ihe a ga na-anụ bụ 'mmn'. Ngọzị anaghịzịkwa eso ekele dịka n'oge gboo maka na onye nkele ejighị obi ya ekele, onye na-ekwe ekwe ejighịkwa obi ya ekwe.

Ihe niile na-adazịkwa nghata nghata; nkọcha wee na-esozị ekele karị ngọzị dịka ọ dị n'oge gboo. Ugbu a bụ oge a ga-ekelechaa onye na-eme njem ''ije ọma'', ọ pụọ n'ụzọ o nwee ihe mberede okporo ụzọ, nwụọrọ onwe ya, ma ọ bụ oge a ga-ekelechaa mmadụ "ka chi fo" ma ọ bụ "rahụọ nke ọma"; onye ahụ lakpuo ụra, o kwogide ọnwụ, nwụọrọ onwe ya. Nke ahụ wee bụrụ n'ihi na ekele esighịzị n'obi apụta.

Ekele bụ ụtọ nwanne. Eke bụ isi udo. Ekele bụ onye nye ọ nara. Ekele bụ nsọpụrụ. Ekele bụ nghọta. Ekele bụkwazị omenala. Ya mere ndị Igbo, ka anyị werenụ ekele kpọrọ ihe ma chukwaa ya dịka otu n'ime omenala na ejirimara anyị pụrụ iche.

Ọ dịkwa mma ka m mee ka a mara na ekele, oge ụfọdụ abụghị site n'onye tọrọ ma ọ bụ onye bụ okenye; ọ bụ ihe mmadụ na-echere mmadụ ibe ya. Ya bụ na ikele ekele bụ ọrụ dịịrị onye ọbụla n'ala Igbo -- ma okenye ma ụmụaka. A sị na a na-egosi nwata awọ n'ipko okwute, a na-ebibe ya aka. A sịkwa na ọ bụ nne ewu na-ata agba, nwa ya ana-elere ya anya.

Ngwa ngwa anyị malitere ịghọta uru ekele bara na iji ya kpọrọ ihe, ngwa ngwa ka anyị malitere itinye aka n'ịkwalite omenala, ezi njirimara na ọdịnala ndị Igbo.

Onye a gwara kwe, a hụ ọzọ, agwakwa ya. Omenala Igbo ga-adị!

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.