Ekeresimeesi: NEMA Arịọla Mbelata Ihe Mberede Okporoụzọ, Kpọtụrụ FRSC

Dec 18, 2021 - 22:08
 0
Ekeresimeesi: NEMA Arịọla Mbelata Ihe Mberede Okporoụzọ, Kpọtụrụ FRSC

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ọnọdụ ntụmadụ na ihe mberede n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ 'National Emergency Management
Agency (NEMA) akpọọla òku ka e nwee mbelata ọnụọgụgụ ihe mberede okporoụzọ na ihe mberede ndị ọzọ na-adapụtakarị n'okporoụzọ, ọkachasị n'ime oge mmemme ekeresimeesi a a na-achọ ịbanye na ya n'uju. 

Onyeisi ụlụọrụ ahụ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, bụ Maazị James Eze bụ bụ ya kpọrọ oku a oge ya na ndị òtù ọrụ ya gara njem mkpọtụrụ n'isi ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps, FRSC' n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, bụkwa ebe ọ nọrọ wee kelee ụlọọrụ ahụ maka ezi ọrụ dị icheiche ha na-arụ, ma kpọkukwa ha ka ha welitekwuo aka n'ọrụ n'ime oge mmemme.

Ọ kọwara ụlọọrụ FRSC dịka ụlọọrụ bara nnukwu uru ma nwekwa ọtụtụ ọrụ dị icheiche dịịrị ha, dịka o siri metụta nchekwa ndụ n'okporoụzọ na ibelata ihe mberede dị icheich na-adapụta n'okporoụzọ.

Ọ rịọkwazịrị ndị ọrụ ahụ na ndị ụlọọrụ nchekwa dị icheiche ka ha ghara itinye aka n'ihe ọbụla ga-akwàlite maọbụ bawanye ihe mberede okporoụzọ maọbụ ihe ọdachi ndị ọzọ, ọkachasị site n'ịnakọsị ndị na-eme njem ego iwu akwadòghị, idochisi ihe ebe ekwesighị ekwesi n'okporoụzọ, bụ nke na-eweta agbakata akwụrụ, tinyere ajọ akparmagwa ndị ọzọ ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa na-akpa n'okporoụzọ. 

Dịka ọ na-echetara ndị ọrụ nchekwa dị icheiche nọ n'isi akwammiri Niger na àkwàmmiri ahụ ekwesighị ịdị na-ebu oke ibu, ọ kpọkuru ha ka ha rụọ naanị ọrụ e dunyere ha n'ebe ahụ, ma kwụsị ime ihe ga-eme ka a na-enwe agbakata akwụrụ maọbụ ihe mberede okporoụzọ n'elu àkwà mmiri ahụ maọbụ n'ebe ndị ọzọ.

Na nzaghachi, onyeisi ụlọọrụ FRSC n'ime steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi kelere ndị ụlọọrụ ahụ maka ịhụta mkpa ọ dị ịbịa kpọtụrụ ya na ndị ọrụ ya.

Dịka ọ na-enye nkọwa banyere arụmọrụ ha, ọ kpọpụtasịrị ihe dị icheiche ụlọọrụ ya megoro na nke ha na-eme eme ugbua, iji kwàlite nchekwa okporoụzọ na steeti ahụ ma belatakwa ọnụọgụgụ ihe mberede okporoụzọ.

Ọ kpọpụtasịkwara ụfọdụ ebe a kacha enwe ihe mberede okporoụzọ na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ, ma mekwa ka a mara ọmarịcha atụmatụ dị icheiche ha a wepụtara iji kwalite arụmọrụ ha na mgbataọsọ ha na mpaghara ebe ahụ.

CC Irelewuyi, onye nọrọ ụbọchị Fraịdee wee kpọkuo ma gwa ndị nta akụkọ Anambra banyere ezi njikere na nkwadobe ha dị maka ọrụ ekeresimeesi a, jìkwàzịrị ohere ahụ kpọkuo ndị na-anya ụgbọala maọbụ ihe ọbụala a na-anya ànyà ka ha zèéré ịgba oke ọsọ, ọkachasị n'ime ekeresimeesi a. Ọ dụkwara ha ka onye ọbụla gba mbọ leruo anya nke ọma ma hụ na ụgbọala ya kwụ n'egwu, tupu o buru ya banye n'okporoụzọ, maka adị ama ama.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484