Na Lagos, E Jidela Ụmụejima Abụọ Yiri Onwe Ha MNa-EzuOhi

Apr 10, 2021 - 14:49
 0
Na Lagos, E Jidela Ụmụejima Abụọ Yiri Onwe Ha MNa-EzuOhi

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ dinta hụ ènwè hụ edi, ọ gbara ha abụọ, maka na a gaghị ejizị na nwanne enwe bụ edi wee hapụ enwe gbuo naanị edi.

O wee bụrụ etu ahụ ka e siri nwụchikọọ ụmụejima abụọ yiri onwe ha nke ọma na steeti Lagos maka izu ohi na itinye aka n'ụmụ arụrụala ndị ọzọ dịgasị iche iche.

Mmadụ abụọ ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ n'otu ụlọ nkwariakụ dị n'Isheri-Idimu dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Alimosho dị na steeti Lagos, tinyere mmadụ abụọ ọzọ ha na ha na-atụ atụmatụ etu ha ga-esi wee zuo ndị mmadụ ohi site n'ime na ha bụ ndị ọrụ agha ala Nigeria, ndị na-anyà ụgbọala, ndị kọndọktọ na-eso ụgbọala, ndị na-eme njem, wee sizie n'ụzọ dị etu ahụ zuo ụmụ mmadụ ohi.

Akụkọ kọrọ na ndị eweojii ahụ jidere ndị ahụ nwèrè ezigbo nsogbu na ọgbaghara ịkọwa onye bụ onye n'ime ụmụnne abụọ ahụ, n'ihi na ha abụọ nwere otu ihu, otu ụdị ahụ, otu olu, ma harakwa n'ogologo; nke na ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu onye bụ onye ohi ebe ahụ, na e nwere ike ịkpụrụ onye nke aka ya dị ọcha, chèé na ọ bụ ya zuru ohi. Ọ bụzị oge ndị uweojii ahụ mezịrị nnyòcha ka ha chọpụtara na ọ bụ ụmụejima ka mmadụ abụọ ahụ bụ, ma bụrụkwa otu nne na nna mụrụ ha abụọ.

Ụmụejima ahụ aha ha bụ Taiwo Ojomo na Kehinde Ojomo ka e kwuru na ha gbara ahọ iri abụọ na iteghete, ma bụrụkwa ndị Oke Oka dị na steeti Ondo; ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ e jidekọrọ ha na ha bụ Peter Samuel (gbara ahọ iri abụọ na abụọ), na Emmanuel Bamidele (gbara ahọ iri abụọ na iteghete). Ọ bụkwa ihe ịtụ n'anya na ha anọ bụcha ụmụ ndị ọrụ agha ala Nigeria lagoro ezumike nke n'ọrụ. Taiwo na Kehinde sokwà nne ha biri n'ụlọikwuu ebe obibi ndị agha a maara dịka 'Ojo Military Cantonment, Lagos'.

N'ajụjụọnụ a gbara ha, ha kọwara na ọ bụ n'ihi iheisiike ka ha jiri malite izu ohi.

E wezuga ọgụgụusi ha nwere, ákwà ndị ọrụ agha ala Nigeria, égbè, aghụghọ na nduhie sókwa n'akụrụngwa ndị ọzọ ha ji arụ ọrụ ọjọọ ahụ, ma bụrụkwa ihe ndị na-enyere ha aka ime ka ọrụ ha gaa siriri-wèrèrè.

Dịka ha siri kọwaa, Taiwo bụ onye na-anya ụgbọala, Kehinde bụ onye na-edozi ụgbọala, ebe Peter bụkwazị onye na-edozi akpụkpụụkwụ; mana ha kpebiri ịhapụ ihe ndị ahụ ma malite zube ohi n'ihi na ha nwere olileanya na nke ahụ ga-aka nye ha ego ma mekwa ka ha bute ike n'oge adịghị anya, dịka ha sigoro hụta ya na ndụ ndị ọzọ.

Dịka ha kọchara akụkọ ndụ ha, etu ha siri malite izu ohi, ihe ha zugoro, nakwa etu ndị uweojii siri wee nwụchikọọ ha ụbọchị ahụ, ha mee ka a mara na ha egbubeghị mmadụ ọbụla kemgbe ha jiri malite zube ohi, ma rịọ ka a gbaghara ha n'ihi na nke ahụ bụ ọrụaka ekwensu.

Ka ọ dị taa, nnyocha ka na-agazịkwa n'ihu ugbua iji nwụchikọọ ndị òtù ha ndị nke nọ n'ọsọ ugbua, nke mgbe e mechaara ya, a kpụpụ ha ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee kwụọ ha ụgwọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484