NDLEA Anwụchiela Onye NYSC, Ndị Ọzọ, Maka Ọgwụ Ike

Sep 10, 2021 - 22:45
 0
NDLEA Anwụchiela Onye NYSC, Ndị Ọzọ, Maka Ọgwụ Ike

Izunna Okafor dere akụkọ a


Aka ndị ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ọgwụ ike n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ 'National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA)' anwụchiela otu nwata nwoke ji otu ahọ efe ala nna ya n'okpuru atụmatụ 'National Youths Service Corps (NYSC)', maka ịtụbata n'ala Nigeria.

Nwatanwokorobịa, bụ Maazị Arnold Maniru ka e kwuru na ọ gbara ahọ iri abụọ na abụọ, ma bụrụkwa onye si na mba United Kingdom wee tụbàta ihe oriri (nke gụnyere ihe na-atọ ụtọ a na-aracha aracha na nke a na-ata ata a maara dịka Candy) ma bụrụkwa nke e jiri ọgwụ ike arọ ya ruru kilogram anọ wee rụọ; ndị ọrụ NDLEA wee nwụchikọọ ya. 

Ozi a kụpụrụ site na ngalaba mgbasaozi ụlọọrụ NDLEA ahụ na-akọwa na Maazị Maniru bụ onye ji otu ahọ efe ala nna ya n'otu okpuruọchịchị ime obodo dị n'Abụja; ma na-akọwakwa na 'Candy' ndi ahụ ọ tụbatasịrị bụ nke e jiri ọgwụ ike arizona, cannabis, na ọgwụ ike ndị ọzọ wee rụọ.

N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibè ya, ndị ọrụ NDLEA agbachìbìdola ụfọdụ ihe oriri ndị ọzọ e jiri ọgwụ ike cannabis arọ ya ruru 1.2kg wee rụọ, ma bụrụkwa nke a chọrọ isi na steeti Lagos wee bupu gaa mba Dubai, UAE; gbachìbìdo ọgwụ ike koken arọ ya ruru 920g, bụ nke e zoro n'ime ntutu isi, ma sikwa steeti Lagos na-ebupu ya mba Saudi Arabia.

Ha jidekwara ọgwụ ike cannabis ọzọ arọ ya ruru 1.08kg e zoro n'ime mkpọ komkom, na-achọ ibupu ya mba Pakistan; ya na ọgwụ ike 'methamphetamine' arọ ya ruru 625g e zoro n'ime ákwà, bụkwa nke a na-achọ ibupù mba Australia

Ndị ọrụ ụlọọrụ ahụ nwụchikọzịkwara ọtụtụ ọgwụ ike ndị ọzọ nwere arọ dị icheiche, nà ndị ọzọ a na-enyo ènyò na ha na-atụ mgbere ọgwụ ike n'ime steeti dị icheiche, nke gụnyere steeti Kogi, steti Lagos, steeti Niger, steeti Rivers, steeti Kano, steeti Niger, steeti Borno, steeti Nasarawa na steeti Ebonyi.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ NDLEA n'ala Nigeria, bụ Maazị Mohammed Buba Marwa kwupụtara obiụtọ ya banyere ezi ọrụ ahụ ndị ọrụ ya rụrụ site n'ịnwụchikọ ndị ahụ, kelee ha, ma kwezie nkwa na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ, dịka ihe ha metara siri dị. 

Ọ kwara arịrị na ihe kacha njọ bụ na ndị ahụ macha ụma wee na-eresi ọhaneze, ọkachasị ụmụaka ụmụakwụkwọ ihe oriri ahụ e jiri ọgwụ ike wee rụọ, ma kọwaa nke ahụ dịka arụrụala jọgburu onwe ya, nakwa nke nwere ike iwèta ọtụtụ mpụtara ọjọọ dị iche iche n'obodo.

Dịka ọ na-ekwe nkwà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma kpee ha ikpe banyere ihe ha mere, ọ kpọkuzịkwara ma dụọ nne na nna ọdụ ka ha na-eleru ụmụ ha anya nke ọma, ma na-akpachàpụkwa anya n'ụdị ihe oriri na ihe ọñụñụ ụmụ ha na-eri n'ụzọ maọbụ n'ụlọakwụkwọ, maka na ndị na-edozi ụgbọala ekweghịzị sị màra ndị bụ ndị ara na ndị isi dị mma.

Ọ dụkwara ndị na-etinye aka n'ọgwụ ike ka ha sepu aka na nke ahụ, n'ihi na ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya agaghị ada mbà n'ibu agha megide ihe ọbụla bụ ọgwụ ike n'ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484