Enwetala Ọgwụ Mgbochi na Ọgwụgwọ Ebola - WHO

Nov 21, 2019 - 20:18
Jan 24, 2021 - 05:17
 0
Enwetala Ọgwụ Mgbochi na Ọgwụgwọ Ebola - WHO

Ibe Kelechukwu, Ibadan

Ụlọọrụ Ahụike Mba Ụwa, WHO, akwadola ọgwụ mbụ maka iji gwọọ ma gbochie ọrịa Ebola. Nkea by ọgwụ mbụ ụlọọrụ ahụ kwadoro ngwangwa. Nkwado a gosiri na ọgwụ ahụ zuru okè n'ihe niile WHO chọrọ iji were rụọ ọrụ nke ọma ma ghara imerụ mmadụ ahụ. Ihe nchọpụta pụtara na Otu Mba Ụwa, UN, nwere ike igote ya bụ ọgwụ maka obodo ọ bụla ọrịa ahụ bakwutere dịka usoro WHO siri dị.

"Nkea bụ nchọpụta dị egwu iji hụ na ndị chọrọ ọgwụ ahụ maka igbochie na ịgwọ ya bụ ọrịa nwetara ya, ma zọta ndụ ha," dịka Dọkịta Tedros Adhanom Ghebreyesus, bụ Onyeisi WHO kwuru. "Afọ ise gara aga, anyị nọ n'aka Chukwu n'ebe ọrịa ahụ dị maka enweghị ọgwụ dị ma ọ bụ nke mgbochi. Mana dịka nkwado na ọtụtụ nyochaa gara, Ebola bụ ọrịa enwere ike igbochi ma gwọkwaa."

Ọgwụ Ebola ahụ hụ nke a na-agba agba, Ervebo, bụ nke Merck, amara dịka MSD na mba ndị ọzọ abụghị US na Canada, rụpụtara. Ngalaba WHO Ndụmọdụ dị n'aka egosila na ya bụ ọgwụ na-egbochi ndị mmadụ n'ebe nje Ebola ahụ bụ Zaire dị, ma bụrụ nke ọ kwadoro maka iji chụọ ọrịa Ebola ọsọ ụkwụ eru ala.

Anyị ga-echeta na n'afọ 2014, ya bụ ọrịa kpara ajọ ike n'ala anyị bụ Naijiria na ọtụtụ mba ndị ọzọ, nke mere onye ọ bụla ụra aga n'anya, mee nwa na-ézé nne ya, enyi na-agbara enyi ya ọsọ. Nke a bụ oge otu nwoke si mba Liberia were buru ọrịa ahụ bata Naijiria. Ụfọdụ ndị mmadụ nwụrụ maka ọrịa ahụ nke gụnyere otu dọkịta nwaanyị na Abuja.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.