Ezenyimulu AKpọkuo Ndị Anambra Ka Ha Sonye n'Ịgba Ọgwụ Korona

Mar 25, 2021 - 08:37
 0
Ezenyimulu AKpọkuo Ndị Anambra Ka Ha Sonye n'Ịgba Ọgwụ Korona
Ezenyimulu AKpọkuo Ndị Anambra Ka Ha Sonye n'Ịgba Ọgwụ Korona
Ezenyimulu AKpọkuo Ndị Anambra Ka Ha Sonye n'Ịgba Ọgwụ Korona

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola ma dụọ ndị Anambra ọdụ ka ha leghara asịrị anya, debanye aha ha, ma sonyesie ike n'ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa korona ahụ a maara dịka 'Oxford-Astrazeneca' bụ nke a na-gba n'ime steeti ahụ ugbua, n'ihi na o nweghị mpụtara ọjọọ ọbụla o nwere.

Oku a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Primary Health Care Development Agency (ASPHCDA)' bụ Dọkịta Chioma Ezenyimulu n'okwu ya na mmemme ọgbakọ ndị Bishọọpụ, bụ nke weere ọnọdụ n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti ahụ. 

Ọ kọwara na akụkọ ọjọọ ahụ ndị mmadụ na-akọ banyere ọgwụ ahụ bụ asịrị enweghị isi na ọdụ, ma mee ka a mara na a gbaala mmadụ ruru puku ise ọgwụ ahụ n'ime steeti ahụ ọgwụ ahụ, n'enweghị mpụtara ọjọọ ọbụla si na ya. 

Ọ gara n'ihu gwa ndị mmadụ ka ha kwụsị ịtụ ụjọ banyere ịgba ya bụ ọgwụ, kọwaa na a rụrụ ya n'ụdị ọ ga-adị mma na mba Africa na n'ahụ ndị bi n'ime ya; ma kwuo na a pụrụ ichekwaba ya bụ ọgwụ n'igwe njụ oyi e tinyere n'agbata 2 digririi wee ruo 8 digirii. O mekwara ka a mara na, n'ihi na ọ bụ akụrụngwa njụ oyi ji ọkụ si n'ike anyanwụ arụ ọrụ ka e ji echekwaba ọgwụ ahụ na steeti ahụ, n'ábụghị ọkụ latiriiki; na e chekwabara ya bụ ọgwụ nke ọma n'ime steeti Anambra, nke na o mebighị emebi maọbụ nwee mpụtara ọjọọ ọbụla si na ya.

O mere ka a mara na isi sekpụ ntị n'ime ebumnobi o jiri bịa n'ọgbakọ ahụ bụ iji gwa ndị Bishọọpụ ahụ na ndịisi ụka nke bụ eziokwu banyere ya bụ ọgwụ korona a na-agba, ka ha wee buruzie ya bụ ozi ga gbasaara ndị ụka ha, site n'ịkụziri ha ihe ha kwesiri ịma na nke bụ eziokwu banyere ya bụ ọgwụ.

O kwuru na ọ bụ ndị e ji okwu ha agba izu, ndị ndu obodo, ndịisi ọrụ gọọmenti na ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu ka e jiri wee màlite ịgba ọgwụ ahụ, ka ndị nọ n'okpuru ha na ndị ha na-achị wee kweta na ọ dị ìrè, ghara ịtụ ụjọ maọbụ daa mba n'isonye n'ịgba ya bụ ọgwụ, ebe ha hụgoro ka ndịisi ha gbara ya bụ ọgwụ ma kwụrụkwa chịm n'enweghị nsogbu ọbụla.

Ọ dụzịkwara ndị Anambra ọdụ ka ha leghara asịrị anya ma sonyesie ike n'ịgba ya bụ ọgwụ n'ihi na nke ahụ so n'otu ụzọ pụtakarịchara ihe a pụrụ isi wee gbochie mgbasa ya bụ ajọ ọrịa korona, bụ nke na-ebi mba ụwa aka ọjọọ n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche ugbua, malite n'ime ahọ abụọ gara aga.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484