Gịnị kwa nụ na-ebu mmadụ isi n’elu ụwa nke a ọtụtụ ihe gbagwojuru ya anya?

Feb 26, 2015 - 08:56
Jan 22, 2021 - 05:17
 0
Gịnị kwa nụ na-ebu mmadụ isi n’elu ụwa nke a ọtụtụ ihe gbagwojuru ya anya?

By Abraham Madu, USA

Ụmụ nne Abrahamụọgụ Aṅụsịobi Madụ. Anya mụ ahụla ihe! Anya mụ hụrụ elu igwe, mana ụkwụ mụ apụghị ịkpasa ya.

Anya mụ hụrụ ntụrụzịza ugwu ma na ọkpa mụ apụghị ịkpatụ ya.

Anya mụ na-ele anyanwụ anya ugbu a, mana aka mụ apụghị ịkpasa ya, nke ụkwụ mụ ji ga imetu ya.

Anya mụ na-ahụ ọnwa mana apụghị mụ ịkpatụ ya ụkwa na aka.

Anya mụ ahụla kpụkpa ndọ buru ibu n’elu igwe, ma na apụghị mụ ịgụ ha ọnụ nke mụ ji ama ole ha dị.

Mmụọ mụ nọ n’Ala Igbo ugbu a mana ahụ mụ nọ na ala bekee.

Tupu mụ enwe ike zọrue ụkwụ mụ n’Ala Igbo, aga mụ agba ụgbọ elu ga-ebuga mụ ebe ahụ.

Igwe eji ekwu okwu ga akpọ onye nọ n’Ala Igbo ọ za na-agbanyeghị na ntị ha nọ na ebe tere anya.

Ụda egbe mmiri na-eru mụ ntị, mana aka mụ apụghị imetụ ya, nke anya mụ ji ahụ ya.

Ana mụ anụ ushi ahụ, mana apụghị mụ iji anya mụ hụ ya.

Ana mụ arọ nrọ mana apụghị mụ ịkwụsị ọtụtụ ihe mụ na-eme na nrọ.

Agụ na-agụ mụ, mana apụghị mụ ịsị ya kwụsị ma ọ bụghị na mụ nyere onwe mụ ihe oriri.

Ikuku na-eku mana ahụ mụ amaghị ma ọ na-ekpo ọkụ ma ọ na-ajụ oyi, mana anya mụ apụghị ịhụ ya bụ ikuku anya.

Ire mụ ga-amata ma nnu, suga, mmanụ aṅụ, ma ọ bụ olugbu ọ dị n’ihe oriri ọbụla anya apụghị ịhụ.

Ụwa nkea dị kwa egwu!

Gịnị kwa nụ na-ebu mmadụ isi n’elu ụwa nke a ọtụtụ ihe gbagwojuru ya anya?

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.