Gọọmenti Abịa Ekwuona Onye Apụtakwụna Iro

Sep 18, 2017 - 06:19
Jan 23, 2021 - 17:44
 0
Gọọmenti Abịa Ekwuona Onye Apụtakwụna Iro

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Gọọmenti steeti Abịa ekwuona onye apụtakwụna iro n'Aba ruo ụbọchị atọ iji hụ na e wetara udo tọrọ atọ na steeti ahụ. Aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ Okezie Ikpeazụ kwuputara nke a ụbọchị Tuuzdee ka e mechaara nzukọ ya na ndị isi nchekwa na steeti ahụ nwere ma sị na nke ahụ bụ n'ihi ọgba aghara na ihe ndị ahụ

Gọọmenti steeti Abịa ekwuona onye apụtakwụna iro n'Aba ruo ụbọchị atọ iji hụ na e wetara udo tọrọ atọ na steeti ahụ.

Aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ Okezie Ikpeazụ kwuputara nke a ụbọchị Tuuzdee ka e mechaara nzukọ ya na ndị isi nchekwa na steeti ahụ nwere ma sị na nke ahụ bụ n'ihi ọgba aghara na ihe ndị ahụ na-ekwo na steeti ahụ kemgbe ụbọchị ụka, tinyere arụrụ ala ahụ ndị ọrụ agha ala anyị rụrụ na steeti ahụ nso nso a, na mkpagharị egwu-eke agba nke abụọ ahụ ndị ọrụ agha malitere na mpaghara Ndịda-Ọwụwa anyanwụ ala anyị kemgbe ụbọchị.

Ọ sị na ya bụ 'onye apụtakwụna iro' ga amalite n'elekere isii nke ọnụ ụtụtụ wee ruo elekere isii nke mgbede bido ụbọchị Tuuzdee wee ruo ụbọchị Tọọzdee.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.