Gọọmenti Anambra Akụkpọsiala Ụfọdụ Ụlọ A Rụrụ Ebe Ezighị Ezi

Dec 12, 2019 - 02:33
Jan 24, 2021 - 03:26
 0
Gọọmenti Anambra Akụkpọsiala Ụfọdụ Ụlọ A Rụrụ Ebe Ezighị Ezi

Izunna Okafor, Awka

A sị na ọ na-abụ onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee ọ hụ ahụ. Ka ọ dị taa, gọọmenti steeti Anambra, site n'aka ụlọ ọrụ ya a kpọrọ Anambra State Physical Planning Board (ASPPB) abagidela ịkụkpọsị ụlọ ahịa na ọdụ ahịa dị iche iche a rụnyesìrì n'okpuru eriri ọkụ na ebe ndị ọzọ ekwesighị ekwesi.

Ịkụkpọsị ihe ndị a bụ nke weere ọnọdụ nso-nso a na mpaghara okpuru ọchịchị Oyi na Ọgbaru, nke gụnyere Kara, ụzọ Atani road nakwa mpaghara 'Toll-Gate' Ogbunike.

Ihe ndị á kụtùsìrì gụnyere mkpọmkpọ ebe dị iche iche a na-enyo ènyò na ndị omekoome na-anọ na ya arụ arụrụala, tinyere ọnụ ụlọ ruru iri ise na abụọ n'ọnụọgụgụ, bụ ebe a na-enyo enyò na ụmụagbọghọ na-anọ agba 'ì chè na mmadụ bụ ewu.'

N'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ oge ha kụtùchààra ihe ndị ahụ, onye duru ndị òtù ahụ wee bàgide na ya bụ ọrụ, ma bụrụkwa onye jigodi ọkwa dịka onyeisi ụlọ ọrụ ASPPB, bụ Maazị Anene Nwabufọ mere ka a mara na ha abagidebụọla n'ụdị ọrụ ahụ na mpaghara Kara n'ime ihe erubèghị otu ọnwa gara aga, mana ndị ahụ kachikwara ndị chìghata azụ ọzọ.

O kwuru na gọọmenti na-amà amụmà ịkpọchikọ mpaghara ahụ iji gbochie ndị mmadụ ịbànyègasịzị na ya, ma kwuo na e mebụọla ụdị ihe ahụ na mpaghara Toll Gate Ogbunike ugboro anọ esepughị aka.

Ọ sị na ọ bụ n'ụfọdụ mkpọmkpọ ụlọ ndị ahụ ka a na-anọ akụ akụmakụ dị iche iche, ọ kachasị n'oge abalị, tinyere ọtụtụ ihe egwù na ihe ize ndụ ndị ọzọ na-esi na nke ahụ apụta, bụzị nke mere o jiri dị mkpà na ha bàgidèrè n'ọrụ ahụ, iji wee kpochalata ya bụ ihe.

Ka ọ na-ekwupụta na e buru ụzọ nye ndị ahụ ozi ọtụtụ ugbòro, tupu ha wee bịa ịkụkpọsị ihe ahụ, Maazị Nwabufọ kpọkùrù ma dụọ ndị ahụ ka ha na-aña ntị ma na-erube isi nye ndụmọdụ na ntụziaka gọọmenti oge niile, n'ihi na ihe nke ahụ bụ maka ọdịmma ha, ndị bi na gburugburu ha nakwa steeti ahụ n'izugbe.

Otu ọ dị, ụfọdụ n'ime ndị nke ahụ metụtara gbàrà akaebe na gọọmenti dọrọ ha aka na ntị tupuu ụbọchị ahụ, ebe ụfọdụ ndị ọzọ kwùrù sị na ọ bụ eziokwu na a dọrọ ha aka na ntị, mana gọọmenti kwesiri inyekwu ha oge tupuu ụbọchị ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.