Gọọmenti Anambra Amàlitela Ịkụkpọsị Ụlọ Ọkụ Ọgbụgba Ọnịtsha Metụtarà

Jan 22, 2020 - 20:44
Jan 24, 2021 - 02:15
 0
Gọọmenti Anambra Amàlitela Ịkụkpọsị Ụlọ Ọkụ Ọgbụgba Ọnịtsha Metụtarà

Izunna Okafor, Awka

N'iji gbanahị ihe ọghọm maọbụ ihe ize ndụ ọbụla nwere ike ịdapụta; gọọmenti steeti Anambra amalitela ịkụkpọsị ụlọ dị iche iche ọkụ ọgbụgba ahụ gbara n'ahịa n'Ọnịtsha n'ahọ gara aga mètụtàrà.

Ya bụ atụmatụ ọrụ bụ nke a bàgidèrè site n'aka ụlọ ọrụ 'Anambra State Physical Planning Board' ma bụrụkwa nke onyeisi oche ụlọ ọrụ ahụ, bụ Maazị Chike Mmadụekwe dùrù ndị òtù ọrụ ya wee bàgide, bụ onye kọwárá na ótù n'ime ụlọ ahụ dààrà onwe ya n'abalị iri abụọ na isii nke ọnwa ekeresimeesi ahọ gara aga. Ma otu ọ dị, e kwuru na o nweghị onye o mèrụrụ ahụ.

O kwuru na ịkụkpọsị ụlọ ndị ahụ ọkụ metụtàrà dabàrà adaba na mmasị ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ ichekwaba ndụ na ngwongwo ọhanaeze na steeti ahụ, ma forokwazie ntutu taa, sị na ụlọ ọrụ ahụ agaghị ada mbà itinye anya n'usoro e si abàgide n'ewumewu ụlọ na steeti ahụ, iji hụ na e mere ya n'ụzọ kwesiri ekwesi na n'ogoogo dị elu.

Maazị Mmadụekwe gakwara n'ihu kwuo na ngwangwa a kụtùchàra ụlọ ndị ahụ ma kpochasịa ebe ahụ, na gọọmenti steeti ahụ ga-amà amụmà imeghepụkwà ya maka ndị nkịtị ji ego achụ ego ịbịa wunyesie ụlọ n'ebe ahụ.

N'okwu ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndị dị iche iche nwere ụlọ ebe ahụ, nke gụnyere Maazị Chinedu Okonkwọ, na Maazị Charles Udegbe kọwara ịkụtùsi ụlọ ndị ahụ dịka nke ziri ezi, n'ihi na ụfọdụ n'ime ha nọzị ọdụ ka ọnyà ọnwụ na-eche onye ha ga-ata isi ya, ma kelekwazie Gọvanọ Obianọ maka ịgbatara ha ọsọ enyemaka n'ọnọdụ ahụ, bụ nke dịbara otu ahụ kemgbe ahọ gara aga, bụ oge ọkụ ahụ gbachara.

Ha kpọkuzịkwara ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ ka ha gbaa mbọ hụ na a na-erubère isi nye usoro iwu na-ahụ maka adịmọcha na steeti ahụ, iji gbochie ndị mmadụ ikpofù ahịhịa aghara aghara maọbụ n'ebe ekwesighị ekwesi, ma sikwa n'ụzọ dị otu ahụ gbanahị mbize, iju mmiri maọbụ ọkụ ọgbụguba ọzọ ịdapụtà n'ọdịnihu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.