Gọọmenti Anambra Ebidola Ịgba Ọgwụ Na-Egbusi Nje n'Ahịa

Apr 9, 2020 - 04:16
Jan 22, 2021 - 21:29
 0
Gọọmenti Anambra Ebidola Ịgba Ọgwụ Na-Egbusi Nje n'Ahịa

Izunna Okafor, Awka

Dịka otu ụzọ iji gbochie mfesà ọrịa, nje, na ihe dị iche iche n'ebute ọrịa, gọọmentị steeti Anambra amalitela ịgba ọgwụ na nnukwu ahịa dị iri isii na atọ e nwere n'ime steeti ahụ.

Ịgba ọgwụ ahụ bụ nke a malitere na nnukwu ahịa mba ụwa dị n'Ọnịtsha, mekwa ya n'ahịa eke Awka, ma bụrụkwa nke ahịa niile dị na steeti ahụ ga-eketa òkè na ya.

N'okwu ya oge ọ na-agbape atụmatụ ịgba ọgwụ ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka azụmahịa na steeti ahụ, bụ Uchenna Okafọr, mere ka a mara na isi sekpụ ntị n'ihe e jiri bagide na ya bụ ọrụ, bụ ka e wee gbochie mgbasawanye nke ọrịa nje ọrịa coronavirus, na ụmụ nje na-ebute ọrịa ndị ọzọ dị iche iche.

Oge ọ na-ekwupụta na gọọmenti nwère ezi mmasị n'ahịa dị iche iche dị na steeti ahụ, o kwuru na ihe mere ha jiri họrọ nnukwu ahịa Ọnitsha dịka ebe a ga-anọ gbape ya bụ atụmatụ, bụ maka ụdịdị ya dịkà nnukwu ahịa mba ụwa na-azụ. O kwukwazịrị na gọọmenti agaghị ada mba n'agha ahụ ọ na-ebu megide ọrịa nje 'coronaviru', iji hụ na ya bụ ọrịa abataghị na steeti ahụ ma ya fọdụzie ịgbasa agbasa.

Otu ọzọ sonyekwara na ya bụ atụmatụ ịgba ọgwụ n'ahịa, bụ Kọmishọna na-ahụ maka ahụike, Maazị Vincent Okpala kwuru na ibu agha megide nje ọrịa 'coronavirus' bụ ọrụ dịịrị onye ọbụla, ma keleekwa Gọvanọ steeti ahụ maka ezi mbọ pụtara ihe ọ gbagoro n'ibu ya bụ agha n'ime steeti ahụ.

Ọ gakwara n'ihu kọwaa na ya bụ ọgwụ agbara abụghị naanị maka nje ọrịa COVID-19, kama na nke ahụ ga-enyekwa aka n'imemìla ọrịa Lassa Fevere, bụ nke ka na-emekwa mkpa mkpa n'ụfọdụ ebe dị iche iche n'ala Nigeria.

Na ntụnye ya, onyeisi otu ahụ jikọtara ndị ahịa na steeti Anambra, a maara dịka 'Anambra State Markets Amalgamated Traders Associaton' (ASMATA), bụ Maazị Ikechukwu Ekwegbalụ kèlere gọọmenti steeti ahụ maka ezi mmekọrịta ya na ndị ahịa n'ime steeti ahụ, rịọ ka nke ahụ dịgide ọkpụtọrọkpụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.