Gọọmentị Anambra Ebidola Ikesàrà Ndị Ọrụ Ugbo Ihe Ubi n'Efù Maka Ọrụ Ugbo Ahọ 2021

Jun 15, 2021 - 18:32
 0
Gọọmentị Anambra Ebidola Ikesàrà Ndị Ọrụ Ugbo Ihe Ubi n'Efù Maka Ọrụ Ugbo Ahọ 2021

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ka ọ gachaara ihe dịka otu izuụka gọọmentị steeti Anambra jiri mechaa mmemme ịgbape amụmà ịkọ ọrụ ugbo udummiri nke ahọ 2021, ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ugbo na steeti ahụ amailtela ikesàrà ndị ọrụ ugbo steeti ahụ mkpụrụ akụkụ dị iche iche e ji akọ ugbo maka ịkọ ọrụ ugbo nke ahọ a.

Mmemme ikesà akụrụngwa a bụ nke a na-eme n'okpuru ọchịchị ime obodo dị iche iche na steeti ahụ ma bụrụkwa nke a màlitèrè n'okpuru ọchịchị ime obodo Anaọcha na Dunukọfịa. Atụmatụ a bụ mgbakwụnye na mmemme ịgbape ọrụ ọrụ ugbo ahụ Gọvanọ mere n'izuụka gara aga.

Ihe ubi nà mkpụrụ akụkụ dị iche iche e kesààrà ndị ahụ gụnyèrè okpòròakpụ/osisi akpụ TME 4-19, tomatò, mkpụrụ ọkwụrụ, mkpụrụ ọkà, nà mkpụrụ akụkụ ndị ọzọ, ma bụrụkwazie nke e kesààrà ha n'efù maka ịkọ ọrụ ugbo udummiri nke ahọ a.

N'okwu ya n'ebe ahụ, nnukwu onye enyemaka pụrụ iche Gọvanọ Obianọ n'ihe gbasaara ọrụ ugbo, bụ Maazị Obioma Mbanefo kọwàrà ọrụ ugbo dịka ihe dị óké mkpà n'ihi ọtụtụ uru dị iche iche dị na ya, nke gụnyere na ọ na-enye ego ma na-emekwa ka nri baa ụba ma dịkwa gbàànyụụ n'obodo.

Dịka ọ na-eme ka a mara na ọrụ ugbo so na ngalaba dị iche iche Gọvanọ Obianọ kacha etinye uchu na ya, ya bụ nnukwu onye enyemaka Gọvanọ kpọpụtàsịrị ihe dị iche iche ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ mepụtagòrò na ngalaba ọrụ ugbo steeti ahụ na nkwàdo dị iche iche ọ na-enye ndị ọrụ ugbo kemgbe o jiri batara n'ọkwa.

Maazị Mbanefo kwuru na ọchịchị Gọvanọ Obianọ enwògharịala ngalaba ọrụ ugbo steeti ahụ na ngalaba ndị ọzọ, ma dụọ ndị ọrụ ugbo ahụ ọdụ ka ha jiri mkpụrụ akụmakụ ahụ e kesààrà ha wee kọpụta erimeri gbaanyụụ na steeti ahụ, dịka a tụrụ anya n'aka ha.

Atụmatụ ikesà mkpụrụ akụmakụ a bụ nke Gọvanọ Obianọ na-eme kwà ahọ ọbụla, ma bụrụkwa nke mịtagoro ọtụtụ ezi mkpụrụ dị iche iche na ngalaba ọrụ ugbo steeti ahụ na mmepụta erimeri.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484