Gọọmenti Anambra Ekwenwòóla Nkwà Ezi Ọnọdụ Maka Ndị Ji Ego Achụ Ego

Aug 14, 2021 - 20:59
 0
Gọọmenti Anambra Ekwenwòóla Nkwà Ezi Ọnọdụ Maka Ndị Ji Ego Achụ Ego

.

.
Izunna Okafor dere akụkọ a

.
Ọchịchị steeti Anambra ekwenwòóla nkwà ịga n'ihu na-akwàlite ezi ọnọdụ dị larịị maka ndị ji ego achụ ego na ndị na-ewunye ihe mwunye na steeti ahụ, tinyere ndị na-azụ ahịa na ndị ọzọ na-arụ ọrụ n'ime steeti ahụ.

Ọ bụ onyeisioche ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ewumewu ụlọ obibi na steeti ahụ, bụ Maazị Ifeanyi Ibezi kwupụtara nke a oge ya na ụfọdụ ndị òtù ọrụ ya gara njem nleta ịmara ka ọrụ si aga n'ebe ahụ a na-arụ okporoụzọ n'ogige ewumewu ụlọ obibi 'Green Valley Housing Estate' dị n'Awka.

O gosipụtara afọojuju ya banyere etu ọrụ si agawanye n'ihu n'ebe ahụ nà ogoogo e ji arụ ya bụ ọrụ, ma kọwaa na ọrụ ahụ nọ n'àgbata pasenti iri ise ruo pasenti iri asaa nke nrụcha ya ugbua.

O mere ka a mara na oge adịghị anya, na ụlọọrụ ahụ gà-amàlite mgbasa ozi n'uju n'íkùkù banyere ogige ahụ ma rekwa ohere dị iche iche dịgasị n'ebe ahụ n'usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ụmụafọ steeti Anambra ka ha kpara ya bụ ọjị nkụ n'oge, iji kwàdo atụmatụ 'Akụ Ruo Ụlọ' ahụ Gọvanọ Obianọ ji n'aka. 

O kelere Gọvanọ Obianọ maka atụmatụ ewumewu ụlọ ahụ na ndị ọzọ o wepụtara iji hụ na ụmụafọ steeti ahụ nwèrè ezigbo ụlọ obibi, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị Anambra ka ha gaa ebe ahụ nweta ebe obibi, ma kọwakwa na e nwere ngalaba ebe obibi maka ndị ọrụ oyibo n'ogige ebe ahụ, bụkwa nke e mere ichè maka ndị na-arụ ọrụ oyibo na steeti ahụ.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Housing Development Corporation', bụ Maazị Willie Okafor kọwara na ụbara ala ogige ụlọ obibi ahụ dị obosara ala hekta iri iteghete, ma kọwaa na ọ ga-abata ọtụtụ ihe nakwà akụrụngwa dị iche iche e ji akwàlite ọnọdụ obibindụ ụmụ mmadụ, dịka e si ahụtagasị ya n'obodo ndị mepere emepe.

Dịka ọ na-eme ka a mara na ya bụ ogige ewumewu ụlọ obibi adọtala ndị oji ego achụ ego sitere n'ime steeti ahụ nà mpụga ya; Maazị Okafor gakwara n'ihu gbaa akaebe na atụmatụ 'Akụ Ruo Ụlọ' ahụ Gọvanọ wepụtara na-amịta ezigbo mkpụrụ n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche, n'ihi na ọtụtụ ndị ghọtara uru nke ahụ bara nà-esonyesi ike na ya ma na-azakwa ọkpụkpọòkù ahụ.

O kwèkwàrà nkwà na a ga-arụchàpụ ogige ahụ ma gbapee ya n'oge adịghị anya, n'ilekwàsà anya n'etu ọrụ si aga n'ebe ahụ ugbua nà ogoogo ya bụ ọrụ nọkwàzị na ya.

Ndị òtù ahụ mèchàkwàrà wee gaa njem nleta n'ebe ahụ a na-arụ ogige ewumewu ụlọ obibi a maara dịka 'Liberation Housing Estate' dịkwa n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa ebe a hụrụ na ọrụ na-agawanye n'ihu n'ebe ahụ n'ọkụ n'ọkụ na n'ogoogo a tụrụ anya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484