Gọọmenti Anambra Ekwenwòóla Nkwà Ịrụchapụ Ogige Ebe Ahụ A Na-Azụ Azụ

Jul 24, 2021 - 20:03
 0
Gọọmenti Anambra Ekwenwòóla  Nkwà Ịrụchapụ Ogige Ebe Ahụ A Na-Azụ Azụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Gọọmenti steeti Anambra ekwenwòóla nkwà ịrụchapụ ogige ebe ahụ a ga na-azụpụta azụ, bụ nke a maara dịka 'Fish Village'  ma bụrụkwa nke a na-arụ na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ n'oge adịghị anya.

Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo na steeti Anambra, bụ Maazị Nnamdị Onukwuba bụ ya kwupụtara nke a n'okwu ya oge ya na ndịisi ụlọọrụ ahụ gara njem nleta n'ebe ahụ a na-arụ ogigè ịzụ azụ ahụ n'Adazi-Nnukwu, dị n'okpuruọchịchị Anaọcha nke steeti ahụ, bụ njem ha gara iji mara ka ọrụ si aga n'ebe ahụ.

Dịka o siri kọwaa, ogige mmepụta azụ ahụ ga-abụ otu n'ime ọtụtụ nnukwu ihe dara ụda ọchịchị Gọvanọ Obianọ mepụtara ma ọ bụrụ na a rụchaa ha, ma bụrụkwa otu n'ime ihe a ga-eji na-echeta ọchịchị ya ma ọ chịchaa rịtugodi n'ọkwa.

Ka ọ gagharịchara na gburugburu ebe ahụ, Maazị Ọnụkwụba kwupụtara afojuju ya banyere etu ọrụ si aga n'ebe ahụ nàkwà ogoogo e ji arụ ya, ma kwupụtazie olileanya o nwere na gọọmentị ga-arụcha ya bụ ọrụ n'oge adịghị anya, n'ilekwasa anya n'etu ya bụ ọrụ si agawanye n'iké n'iké.

Dịka ọ na-akpọpụtasị ihe dị iche iche ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ mepụtagoro na ngalaba ọrụ ugbo, nà etu ọchịchị ya sigoro kwàdo ma mee ka ihu ọchị waa ndị ọrụ ugbo steeti ahụ; ya bụ Kọmishọna jikwazịrị ohere ahụ wee kpọkuo Ndị Anambra, ọkachasị ndị ntorobịa, ka ha sonyesie ike n'ọrụ ugbo, n'ihi na akụrụngwa ọgbaraọhụrụ emeela ka ọrụ ugbo dị mfe, tinyekwuoro na Gọvanọ Obianọ emeela ka ọrụ ugbo na-adọ akpịrị na steeti ahụ.

N'okwu nke ya, onye ọzọ soro wee gaa njem nleta ọrụ ahụ ma bụrụkwa onyeisi ngalaba na-ahụ maka ilekọta ọrụ ngo n'obi gọọmenti dị n'Awka, bụ Maazị Obumneme Akunyili kpọpụtasịrị ọtụtụ úrù dị iche iche ogige ịzụ azụ ahụ ga-ewètara na steeti ahụ ma a rụchaa ha, ọkachasị dịka o siri metụta imepụta azụ nà erimeri, ịkwàlite ọnọdụ mmepe akụnụba steeti ahụ, ikewàpụtara ụmụafọ steeti ahụ òhèrè ọrụ, na ime ka Ndị Anambra mara nke ọma banyere etu e si emepụta azụ.ụ, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ.

O kwezịrị nkwa na ha ga na-abagide na njem nleta ọrụ ahụ na mgbe na mgbe, iji hụ na a rụchara ya na mgbe kwesiri ekwesi na n'ogoogo a tụrụ anya.

N'okwu nke ya oge ọ na-edugharị ndị òtù ahụ n'ihu ọrụ ya, onye ji ọrụ ngo ahụ na mpaghara ọgbọ nta nkwàdo 'Anambra Central' bụ Maazị Edmund Chukwuemeka, nke ụlọọrụ 'Editrust International Limited', kọwààrà ha ka ọnọdụ ọrụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, ma kwe nkwà na a ga-arụchapụ ya bụ ọrụ n'oge a kara aka. O mekwara ka a mara na njem nleta ahụ a kaghị àkà ndị ahụ bịara gosiri n'eziokwu ụdị mkpa ọrụ ahụ dị ha na mmasị ha nwere n'ịmara etu ọrụ si aga n'ebe ahụ.

Ogige ebe ịzụ azụ ahụ, bụ nke a na-arụkwa n'ebe dị iche iche na mpaghara ọgbọntankwàdo sineetị atọ e nwere na steeti ahụ.

Ya bụ ogige a na-arụ n'Adazi-Nnukwu nwèrè ime ebe ruru narị atọ a ga na-azụ azụ, nwee mmiri a gbapuru agbapu, nwee aja ngwùrù, nwee ebe obibi ga-eritenwu àkwà ndina iri ise, nwee igwe na-enye ọkụ ike ya ruru 75-KVA, ma nwekwa okporo ebe ọkụ latririiki ga-esi wee gaa, ruru iri abụọ na ise n'ọnụọgụgụ, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ a na-arụnye n'ebe ahụ, iji mee ya ka ọ bụrụ obodo azụ n'eziokwu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484