Gọọmenti Ga-Akụkpọ Ụlọ Ọbụla E Ji Eme Mpụ Na Arụrụala -- Obianọ

May 1, 2019 - 22:05
Jan 21, 2021 - 22:05
 0
Gọọmenti Ga-Akụkpọ Ụlọ Ọbụla E Ji Eme Mpụ Na Arụrụala -- Obianọ

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

E meela ka a mara na gọọmenti steeti Anambra ga-amalitekwa ịkụtùsi ụlọ ọbụla e ji were eme mpụ ma na-arụkwa arụrụala dị iche iche dịka izo ohi, idebe ndị a tọọrọ atọrọ na omekoome ndị ọzọ na-eweta ala adịghị mma na steeti ahụ.

Aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ mere ka a mara nke a na nzukọ isi ọchịchị steeti ahụ, bụ 'State Executive Council Meeting' nwere n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ ụbọchị Mọnde. Gọvanọ Obianọ kwupùtara nke a dịka ọ na-aja ndị ọrụ nchekwa na steeti ahụ ike maka ezi mbọ ha gbàrà n'ịnwụchikọ otu n'ime ndị ahụ a na-enyo ènyò na ọ bụ ha gburu onyeisi ọchịchị obodo Nimo dị n'okpuru ọchịchị Njikọka, bụ maazị Frank Anthony Igboka, bụ onye a gbàgbùrù n'abalị iri na isii nke Ọnwa Epure.

N'ihe gbasaara nde Naịra ise o kwere na nkwa maka onye ọbụla ga-agba ezi àmà ga-enye aka n'ịnwụchikọ ndị ahụ gburu ya bụ nwa amadi, gọvanọ Obianọ mere ka a mara na onye gbara ama e jiri nwụchikọ onye nke ahụ a nwụchikọrọ ugbua anatalarị ma fọlaa ego ya àkpà kemgbe, dịka gọọmenti kwere na nkwà. O mekwazịrị ka a mara na e buliela ọnụ ego ahọ ka ọ bụrụzie n'isi n'isi, nke pụtara na onye ọbụla gbara ama ga-enye aka n'ịnwụchikọ otu onye n'ime ndị ahụ ga-enweta nde Naịra ise, ebe gbara ama ga-enye aka n'ịnwụchikọ mmadụ abụọ ga-enweta nde Naịra iri, wee dịrịzie gaba.

Gọvanọ Obianọ kwupùtanwòrò njikere steeti ahụ nà mbọ ya ịhụ na e nwere ezi nchekwa ndụ na ngwongwo ụmụafọ steeti ahụ site n'ịhụ na ndị arụrụala na ndị omekoome enweghị ọnọdụ ọbụla na steeti ahụ. Ọ kpọkùrù ndị dị iche iche nwere ụlọ na steeti ahụ, ka ha na-eleru anya ma na-akpachàpụkwa anya ịhụ na ndị ha na-etinye n'ụlọ ha bụ ndị nwere ebe doro anya ha sì, ma nwekwa ihe doro anya ha na-arụ, na-abụghị ndị na-etinye aka n'ihe arụrụala ọbụla, ma ọ bụ ndị obibi ndụ ha na-adabachaghị adaba, n'ihi na gọọmenti agaghị egbu ogè ịkụtù ụlọ ọbụla ndị dị otu ahụ nọ na ya were akụ akụmakụ n'ụdị ọbụla.

Ọ gara n'ihu mee ka a mara na otu nzuzo abụrụkwala otu n'ime ihe ndị na-eweta ala adịghị mma ugbua, kwuo na otu pụrụ iche e guzòbere maka nke ahụ amalitela ibu agha megide ya bụ ajọ ọnọdụ, ma dụkwazie ndị ntorobịa na steeti ahụ ka ha zèéré ma kwụsị itinye aka n'ihe ọbụla bụ mpụ na arụrụ ala, maka na onye ọbụla e nwetara ga-eji anya ya abụọ wee hụ ntị ya na-ejighị ènyò.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.