Gọọmenti Steeti Anambra Ekwupụtago Njikere Ya Ịkwalite Ọdịmma Ndi Ntorobịa

Sep 19, 2017 - 10:47
Jan 23, 2021 - 17:34
 0
Gọọmenti Steeti Anambra Ekwupụtago Njikere Ya Ịkwalite Ọdịmma Ndi Ntorobịa

Izunna Okafor, Awka

Gọọmenti steeti anambra n'ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ emego ka a mara njikere ya na mkpebi ya ịkwalite ezi ọnọdụ obibi ndụ na ọdịmma ndị ntorobịa na steeti ahụ, iji mee ka ha bụ ndị kwụụrụ onwe ha. Nwunye aka na-achị steeti ahụ bụ Oriakụ Eberechukwu Obianọ mere ka a mara nke a n'ọgbakọ ekpere pụrụ iche e mere maka iche nhọpụta na-abịa n'ihu na steeti ahụ n'aka Chineke, bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọ ụka St. Luke (Anglican) dị na Nsugbe n'okpuru ọchịchị 'Anambra East' na steeti ahụ.

Gọọmenti steeti anambra n'ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ emego ka a mara njikere ya na mkpebi ya ịkwalite ezi ọnọdụ obibi ndụ na ọdịmma ndị ntorobịa na steeti ahụ, iji mee ka ha bụ ndị kwụụrụ onwe ha.

Nwunye aka na-achị steeti ahụ bụ Oriakụ Eberechukwu Obianọ mere ka a mara nke a n'ọgbakọ ekpere pụrụ iche e mere maka iche nhọpụta na-abịa n'ihu na steeti ahụ n'aka Chineke, bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọ ụka St. Luke (Anglican) dị na Nsugbe n'okpuru ọchịchị 'Anambra East' na steeti ahụ.

Ya bụ nwunye aka na-achị achị, nke onye nọchitere anya ya bụ Dọkịnta Ify Madụkasị kpọpụtasịrị ihe dị iche iche ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ mepụtagoro na ngalaba agụm akwụkwọ, ngalaba ọrụ ugbo, nchekwa ndụ na akụnụba, ihe mwunye nakwa ngalaba ndị ọzọ dị iche iche, ma mekwa ka a mara na ime obodo niile dịna steeti ahụ eritela otu uru ma ọ bụ nke ọzọ na ya bụ ọchịchị Gọvanọ Obianọ.

Ọ dụrụ ndị ntorobịa ka ha ghara ikwe ka onye ọbụla were ha rụọ ọrụ agboro ma ọ bụ ọrụ ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche na nhọpụta ahụ na-abịa n'ihu, ma kpọkuzie ndị steeti ahụ maka ekpere ha na nkwado ha nye Gọvanọ Obianọ.

N'aka nke ya n'ofufe nro ekpere ahụ nke isi okwu ya bụ 'Chineke Tute Steeti a Na Ụlọ Ụka Gị', onye ụkọchukwu nke ụlọ ụka ahụ, bụ 'Rev. Cannon' Emmanuel Onovo kwuru na ebumnobi e jiri nwee ya bụ ofufe ntute na ọgbakọ ekpere bụ ka e wee hafeeṅsteeti ahụ n'aka Chineke, ọ kachasị ugbu a a na-akwadobe ime nhọpụta ọchịchị; ma rịọkwa ndị bịara ya bụ ofufe ka ha nabata Kraịst dịka onye nwe ha na onye nzọpụta ha, ka ha wee mara ebumnobi Chineke banyere ha.

Na mbụ n'okwuchukwu ya, onye enyem aka pụrụ iche nye Gọvanọ steeti Enugu n'ihe gbasaara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma bụrụkwa onye nyawara achịcha okwu Chineke n'ofufe ahụ, bụ Maazị/Onye oziọma Chinedu Anịchi dụrụ ndị otu Kraịst ka ha na-aga ije n'ụzọ nke Chineke ma na-akwụbakwa aka ha ọtọ n'ihe niile iji wee nwee akara onwunwe na otite mmanụ nke Chineke, ma mekwa ka ha mara na ọ bụ Chineke na-enye ọganihu.

Oriakụ Ebere Arụbalueze, onye kwuru okwu na "ntute steeti na ụka" rịọrọ ndị ụka ka ha nwee ezi mmekọ, ha na Chineke, ka ha wee hụta ịdị ukwu ya. Ọ dụkwara ha ka ha bie ezi ndụ ma mụrụ anya ka azụ n'ihi na Kraịst pụrụ ịbịa oge ọbụla, malite ugbu a.

Eze ọdịnala Nsugbe bụ Igwe Victor Ntoka so na ndị ukwu ndị ọzọ bịara ya bụ ofufe nro pụrụ iche.

Abụ dị iche iche a bụrụ site n'ọnụ ndị ọbụ abụ, ịtụ mmamma na usoro ekpere dị iche iche e kpere so n'ihe pụtakarịchara ihè na ya bụ mmemme.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.