Gọọmenti Steeti Anambra Enyela Ntuziaka Iji Gbanahị Ọrịa Nje Covid-19

Mar 25, 2020 - 22:41
Jan 22, 2021 - 21:43
 0
Gọọmenti Steeti Anambra Enyela Ntuziaka Iji Gbanahị Ọrịa Nje Covid-19

Izunna Okafor, Awka

Igbo sị na nkwụcha abụghị ụjọ, ma sịkwa na ọ na-aka mma ibido n'oge gbaba ọsọ mmiri tupuu ozuzo ya. N'ịgbaso nke a, gọọmenti steeti, nke Gọvanọ Willie Obianọ nọ n'isi ya, nọrọ na nso nso wee nye ntụziaka pụrụ iche ụmụafọ steeti ahụ ga-agbaso, iji gbanahị ma gbochie mgbasawanye nke ọrịa nje 'Corona Virus' a maara dịka ọrịa 'Covid-19', ma gùzobekwa òtù ọrụ pụrụ iche maka ibu agha megide ya bụ ajọ ọrịa na-efe èfè.

Site na ya bụ ntuziaka, bụ nke rụtụrụ aka n'ọtụtụ ihe dị iche iche, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ mèrè ka a mara ndị ọrụ oyibo steeti ahụ ka ga-anọgodi n'ụlọ wee na-arụ ọrụ ugbua, wee ruo izuụka abụọ, ma kwuokwa na nke ahụ emetụtaghị ndị nọ na ngalaba ụlọọrụ ahụ ike nakwa ụlọọrụ ndị ọzọ na-arụ ọrụ dịkarịchara mkpa.

Gọvanọ, onye nyere ntuziaka ka ụlọakwụkwọ niile dị na steeti ahụ mechigodi ugbua, mèkwàrà ka a mara na mmemme ọbụla ga-adọta mmadụ karịrị iri atọ n'otu oge ka ga-agbaberegodi n'akụkụ, ma kwuo na onye ọbụla batara ime steeti ahụ site na mbà maọbụ steeti ọbụla ọrịa ahụ dị na ya ugbua ga-ewezùgagodi onwe ya otu ebe, wee ruo abalị iri na anọ, iji mara ma ò bù ya bụ ọrịa.

N'ịga n'ihu, o kwuru na ndị na-anyà ụgbọala agaghị na-apàkọsịzị mmadụ ọnụ malite ugbua gaba, ma dụọ ha ka ha na-edekọta aha, akàrà na ihe ọzọ dị oke mkpa e kwesiri ịma bànyere onye ọbụla ha bù n'ụgbọala were abata ime steeti ahụ.

Ya bụ aka na-achị achị dụkwàzịrị ọhaneze ka ha na-akwọchasị aka ike oge niile, zèére mmetụkasị ahụ, ya na ngagharị abaghị uru; ọbụnadị dịka o mere ka a mara na ndị ọrụ nchekwa dị iche iche ga na-agagharị na mpaghara ebe ọbụla ugbua iji ha na onye ọbụla gbasòrò ya bụ ntụziaka, ya iji ịnwụchikọ ma nye ndị nupùrù isi na nke ahụ ntaramahụhụ kwesiri ha.

Gọvanọ Obianọ, onye kwupụtara ezi njikere na mkpebi gọọmenti ya ichekwaba ndụ na ngwongwo ụmụafọ steeti ahụ, gwàzịrị ha ka ha kpọtụrụ akara ekwentị 08030953771 maọbụ 08117567363 oge ọbụla ha hụtara onye a na-enyo ènyò na o bù ya bụ ọrịa.

Dịka o siri kpọpụtasịa, ndị dị iche iche so n'otu ọrụ ahụ pụrụ iche e guzobere ọhụụ maka ya bụ ọrịa gụnyere: Dọkịta Vincent Ọkpala, Maazị C Don Adinuba, Dọkịta Simeon Onyemaechi, Ọkammụta Anthony Igwegbe, Ọkammụta Oby Emelummadụ, Dọkịta Simon Ushie, Dọkịta Basil Nwankwọ, Dọkịta Emmanuel Azuike, Dọkịta Ifeoma Njelita, Dọkịta Uche Onyejimbe, Dọkịta Chijioke Obagha, Ọkammụta Maurice Iwu, Dọkịta Joe Akabuike, Dọkịta Ifeanyi Okoye, Dọkịta Ernest Ifebi, Dọkịta Chioma Ezenyimụlụ, Dọkịta Onyeka Ibezim, Dọkịta Chidi Kanụ, Maazị Uche Okafor, Ọkammụta Solo Chukwulobelụ, Maazị Primus Odili, Maazị Uzu Ọkagbue, tinyere Maazị Chinedu Aniagboso.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.