Gọvanọ Obianọ Agaala Njem Nleta Ebe Ahịa Gbara Ọkụ n'Ihiala

Oct 20, 2021 - 21:14
 0
Gọvanọ Obianọ Agaala Njem Nleta Ebe Ahịa Gbara Ọkụ n'Ihiala

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ na ụfọdụ ndịisi ọchịchị steeti ahụ agaala ebe ahụ ọkụ gbara n'Ahịa Nkwọ Ogbe dị n'Ihiala, n'okpuru ọchịchị Ihiala nke steeti ahụ, iji mara ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, ma kasìkwa ndị ajọ ọnọdụ ahụ metụtara obi.

Ọ dị ncheta na n'ụtụtụ ụbọchị ụka gara aga, ajọ ọkụ ọgbụgba dapụtara na nnukwu ahịa ahụ a na-ere osisi, ákwà, akụrụngwa eketrọniks, ihe nri, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ, wee gbaa ya pịàtàà, bibìsiekwa ọtụtụ ihe n'ebe ahụ

Ụfọdụ ndị dị icheiche soro Gọvanọ wee gaa njem nleta ahụ gụnyèrè osote Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Dọkịta Paschal Agbọdike; Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi, bụ Maazị C-Don Adinuba; Kọmishọna na-ahụ maka ahịa na azụmahịa, bụ Uchenna Okafor; Kọmishọna na-ahụ maka ahụike, bụ Dọkịta Vincent Ọkpala; onyeisi ụlọọrụ nsọnyụọkụ steeti Anambra, bụ Maazị Martin Agbili; onyeisi ndị uweojii steeti Anambra, bụ CP Echeng Eworo, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ kọwara ọkụ ọgbụgba ahụ dịka ajọ ihe ọdachi, guzobekwa òtù ọrụ pụrụ iche maka ime nnyocha banyere ya bụ ọkụ, ihe kpatara ya na ihe dị mkpa ịma banyere ya, ma nyekwa gọọmenti ndụmọdụ ihe a ga-eme banyere ya bụ ọdachi, na ụzọ kacha mma ọ ga-esi nyere ndị ọdachi ahụ metụtara aka, n'ime otu ọnwa na-abịa abịa.
 
Dịka ọ na-enye ndị ahịa ahụ owuweanya na gọọmenti kwụ ha n'azụ, o kwere nkwà na a ga-ebutezị ma kwụba ụgbọala ọrụ nsọnyụọkụ n'ahịa ahụ, iji gbochie ụdị ajọ ọdachi dị etu ahụ ịdapụtakwa ọzọ n'ọdịnihu; ọbụladị dịka ọ gwàkwà ndị ndu ahịa ahụ ka ha wepụta ebe a ga-akwụba ya bụ ụgbọala nsọnyụọkụ ọkpụtọrọkpụ n'ahịa ahụ.

Ndị so n'òtù ahụ e guzobere ọhụrụ maka inyòcha ọkụ ọgbụgba ahụ gụnyere Oriakụ Joy Ulasi (onyeisi), Dọkịta Paschal Adbodike; Maazị Chudi Udemmadu, Kọmishọna Uchenna Okafor, Maazị Ben Chiobi, Maazị Martin Agbili, na onyeisi ahịa ahụ, bụ Maazị Cyril Onyedibe.

Na nkọwa ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ nsọnyụọkụ steeti Anambra, bụ Maazị Martin Agbili kwuru na ha nwètara òkù ntụmadị n'elekere mbụ nke ime abalị ụbọchị ahụ gbasaara ọkụ ọgbụgba ahụ, bụkwazị nke mere ka ndị ọrụ ya nọ na ngalaba Nnewi jikere onwe ha ngwangwa wee gaba ebe ahụ ozigbo. Ọ kọwakwara na tupu ndị ọrụ ya abịaruo ebe ahụ, ọkụ ahụ agbaala nnukwu ma mebisiekwa ọtụtụ ihe. Kaosiladị, ọ kọwara na o nweghị onye ọbụla tụfuru ndụ ya n'ebe ahụ.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ahịa ahụ, bụ Maazị Cyril Onyedibe, bụkwa onye ọkụ gbapịàrà ọdụ ahịa nke ya kpamkpam, kọwàrà na ya bụ ọkụ gbarikọrọ ihe gburu eru ruru nde kwuru nde naịra n'ebe ahụ, ma kọwaa na ọ bụ mmiri ozuzo zoro n'ụtụtụ ahụ nà mgbataọsọ ndị ọrụ nsọyụọkụ mere na ọkụ ahụ agbaraghị bàá n'ebe ndị ọzọ.

O kelekwazịrị Gọvanọ Obianọ maka ọbịbịa ahụ ọ bịara ebe ahụ, òtù ọrụ nnyocha ahụ o guzobere, na nkwà enyemaka o kwere ndị ahịa ahụ; ma kelekwazie ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ ahụ maka mgbataọsọ ha, ọbụladị dịka ọ kasìkwara ndị ajọ ọdachi ahụ dakwasịrị obi, kpee ka Chineke nyere ha aka iguzorokwa ọzọ. O kelekwara Chukwu na o nweghị onye ọbụla tụfuru ndụ ya n'ihi ọkụ ọgbụgba ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484