Gọvanọ Obianọ agbapeela amụmà mmiri ọñụñụ abụọ n'Anambra

May 20, 2020 - 20:31
Jan 22, 2021 - 20:49
 0
Gọvanọ Obianọ agbapeela amụmà mmiri ọñụñụ abụọ n'Anambra

Izunna Okafor, Awka

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ agbapeela atụmatụ mmiri ọñụñụ mpaghara Otuọcha, bụ nke a maara dịka 'Otuocha Regional Water Supply Scheme'.

Ya bụ atụmatụ mmiri ọñụñụ bụ nke a rụrụ site na njikọ aka gọọmenti steeti ahụ na otu mba ụwa 'European Union', ma bụrụkwa nke nwere ikike ịmịtà na imezi mmiri ruru ndè lita iri n'ụbọchị.

N'okwu ya oge ọ na-agbape atụmatụ mmiri ahụ, bụ nke a rụrụ n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East', Gọvanọ Obiano kọwara na nke ahụ ga na-ekesà mmiri ọñụñụ nyegara obodo dị iche iche dị n'okpuru ọchịchị ahụ, nke gụnyere Aguleri, Umueri na Umu-Oba Anam.

Oge ọ na-akpọkù ndị mpaghara ahụ ka chekwaba ma leruo akụrụngwa ahụ anya nke ọma, o mekwàrà ka a mara na ya akpọlitela onye ga na-ahụ maka ilekọta ya bụ atụmatụ mmiri ọñụñụ, ma gwakwazie ndị na-arụ ụlọ ọhụụ na mpaghara ahụ nwere mmasị isi n'akụrụngwa ahụ dọrọ mmiri, ka ha kpọtụrụ ma nweta nkwàdo site n'aka ụlọọrụ na-ahụ maka ihe e ji enyere ndụ aka na steeti ahụ, bụ 'Ministry of Public Utilities and Water Resources'.

Na ntụnye nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Emeka Ezenwanne kọwara atụmatụ mmiri ahụ dịka nke magburu onwe ya nà nke bịara n'oge ọ kachara dị mkpa, bụ ugbua ọrịa nje korona na-eme mkpamkpa n'ebe dị iche iche, nke mezịrị o jiri dị mkpa ka onye ọbụla na-akwọchasị aka ya ike na mmiri na-agba agba ma na-edobekwa gburugburu ya ọcha mgbe niile.

Na nzaghachi, onyeisi oche nchere oge n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East', bụ Maazị Obi Nweke kèlèrè Gọvanọ Obianọ maka ọmarịcha ọrụ ahụ, ma kwe nkwà na ha ga-echekwa ma lekọta ya anya etu o siri kwesi, ka o wee nọọrọ ha ọdụ nke ukwuu.

N'akụkọ dịkwa ka ibè ya, Gọvanọ Obianọ gbapèkwàrà atụmatụ mmiri ọzọ, bụ 'Obizi-Uga Regional Water Scheme' n'okpuru ọchịchị Agụata.
Ya bụ atụmatụ mmiri bụ nke e tùtèrè, rụgharịa ma rusàkwuo ya, site n'aka gọọmenti steeti ahụ, ka ọ gachara ahọ kwuru ahọ o jiri kwụsị ịrụ ọrụ.

Ka ọ dị taa, atụmatụ mmiri ahụ bụkwazị nke nwere ikike ikesàrà obodo iri na anọ dị n'okpuru ọchịchị ahụ mmiri ọñụñụ, nke gụnyere Ekwulobia, Igboukwu, Uga, Isuofia na obodo ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.