Gọvanọ Obianọ Awụchaala n'Ọdụ Ụgbọelu Anambra, Kwenwòó Nkwà Ịrụchpụ Ya

Jul 28, 2021 - 20:18
 0
Gọvanọ Obianọ Awụchaala n'Ọdụ Ụgbọelu Anambra, Kwenwòó Nkwà Ịrụchpụ Ya

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ awụchaala n'ọdụ ụgbọelu mba ụwa ahụ a rụrụ na steeti Anambra, bụ nke a maara dịka 'Anambra International Passenger and Cargo Airport, Umueri', ka ọ gachaara nkeji olenaole o siri na steeti Lagos wee felie. 

Gọvanọ Obianọ wụchàrà n'elekere 11:34 nke ụtụtụ ụbọchị Wenezdee n'ọdụ ụgbọelu ahụ dị n'Ụmụeri, n'okpuru ọchịchị 'Anambra East' nke steeti ahụ, bụkwa ebe ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ nọrọ wee nabata ya.

N'okwu ọ gwara ndị nta akụkọ oge ọ wụchara n'ọdụ ụgbọelu ahụ, Gọvanọ Obianọ mere ka a mara na njem ya na mwụcha ahụ ọ wụchiri n'ọdụ ọgbọelu ahụ gara siriri-werere, ma gosipụta obi ụtọ ya na o sola na ndị fetùrù n'ọdụ ụgbọelu ahụ.

Dịka ọ na-eme ka a mara na a ka ga-emezi mmehie ahụ ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission, INEC' mere n'ibipụta aha onye ga-eji aha otu ndọrọndọrọ 'All Progressive Grand Alliance, APGA' wee zọọ ọkwa Gọvanọ na nhọpụta ahụ a ga-eme na steeti ahụ n'ọnwa n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a; ya bụ Gọvanọ kwèrè nkwà na ọ ga-arụcha ọdụ ụgbọelu ahụ na ọrụ ndị ọzọ o ji n'aka tupu oge ọchịchị ya abịa na njedobe.

Ụfọdụ ndị dị iche iche soro wee nabàta Gọvanọ Obianọ n'ọdụ ụgbọelu ahụ gụnyèrè Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Maazị Uche Okafor; onye ahụ ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressive Grand Alliance, APGA' were apụta ịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ n'ahọ a, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo; onye ga-eji aha otu ndọrọndọrọ APGA wee zọọ ọkwa osote gọvanọ steeti ahụ, ndịisi ọchịchị steeti ahụ, ndị eze ọdịnala na ndị ọzọ selitere isi n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA, tinyere ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484